Azụ Akwụkwọ
Banyere Jehova Chineke, Aịsaịa 40:11 na-ekwu, sị: “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha.” Ọ bụrụ na i lee atụrụ nke nọ n’obi onye ọzụzụ atụrụ anya, ọ̀ na-adị na-agụ gị agụụ ịnọdewe Nna gị nke eluigwe otú ahụ? Ma olee otú ị pụrụ isi bịaruo Jehova nso?