Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf p. 2
  • Okwu Bu Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwu Bu Ụzọ
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf p. 2

Okwu Bu Ụzọ

Ezi Onye Na-agụ Akwụkwọ A:

‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ (Mak 10:21) N’ezie, mgbe Jizọs Kraịst kwuru okwu ndị a, ọ na-akpọ anyị òkù ka anyị soro ya. Ị̀ zawo òkù a ọ na-akpọ? Ịza òkù a ga-emetụta ndụ gị nke ukwuu. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Jehova zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka o nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta. (Jọn 3:16) Ọ bụghị naanị na Ọkpara ahụ nwụrụ n’ihi anyị, kama, o gosikwara anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. N’ihe niile o mere, o guzosiri ike n’ezi ihe ma mee ka obi Nna ya ṅụrịa. Jizọs gosikwara anyị otú anyị ga-esi dị ka Nna ya. Okwu Jizọs na omume ya gosiri ihe bụ́ ụzọ Nna ya na uche Nna ya n’ụzọ zuru okè.—Jọn 14:9.

Baịbụl kwuru na Jizọs bụ ‘ihe nlereanya ka anyị wee sochie nzọụkwụ ya anya.’ (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbịarukwu Jehova nso, ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi ndụ dị mma n’ezie ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ịnọgide na-eje ije n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi, anyị aghaghị isochi nzọụkwụ Kraịst anya.

Iji malite iso nzọụkwụ Jizọs, ọ dị anyị mkpa ịmata otú o si bie ndụ n’ụwa. Ya mere, anyị kwesịrị iji nlezianya mụọ ihe e kwuru banyere Jizọs. E dere ihe ndị a n’ime Baịbụl. Ichebara ihe Jizọs kwuru na ihe ndị o mere echiche, na ịtụle otú anyị pụrụ isi ṅomie ya n’okwu nakwa n’omume ga-enyere anyị aka ịhụkwu nke ọma otú anyị ga-esi na-eso ya.

Ka akwụkwọ a nyere gị aka ka ị hụkwuo Jizọs na Jehova n’anya. Ka ịhụnanya ahụ kpalie gị isochi nzọụkwụ Jizọs anya, ka i wee mee ka obi Jehova ṅụrịa ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi.

Ndị Bipụtara Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya