Azụ Mkpo Akwụkwọ
Ọ̀ dịtụwo mgbe i furu ụzọ, o wee dị gị mkpa ka mmadụ zi gị ụzọ? Jizọs Kraịst bụ onye ndú nke Chineke nyere anyị, nke dị mmadụ niile mkpa. Ọ sịrị: “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma, amakwaara m atụrụ m, atụrụ m makwaara m.” (Jọn 10:14) Ị̀ maara Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma a n’ezie? Ị̀ maara àgwà ya, ozi o zisara na ọrụ ọ rụrụ, otú o si nụọ ọkụ n’obi, na ụdị ịhụnanya o gosiri? Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmatakwu Jizọs nke ọma ma sochikwuo ya anya karị.