Abụ nke 61
Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ
Nke E Biri Ebi
1. Jehova, gịnị ka m g’eji kwụọ gị ụgwọ,
Keleekwa gị maka ndụ nke i nyere m?
M ji Okwu gị enyocha onwe m k’enyo;
Mee ka m ghọt’ụdị ’madụ m bụ nke ọma.
M kwere nkwa iji ndụ m je’ozi gị,
Ozi m agagh’abụ iji mezuo iwu.
M kpebir’iji obi m dum jeere gị ozi.
Ka m soro mee ka obi gị ṅụrịa.
2. Nyere m ak’inyocha onwe m ma ghọta
Ụdị ’madụ ị chọrọ ka mụ onwe m bụrụ.
Ị gagh’ahapụ ndị n’eme uche gị;
Ka m soro ná ndị n’eme k’obi gị ṅụrịa.
(Gụọkwa Ọma 18:25; 116:12; 119:37; Ilu 11:20.)