Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 19 p. 22
  • Jizọs Buru Amụma Ga-emetụta Ụwa Dum

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Buru Amụma Ga-emetụta Ụwa Dum
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • lhe Ịrịba Ama nke Mgbe lkpeazụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mata na Amagedọn Dị Nso
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Banyere “Ọgwụgwụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 19 p. 22

Nkebi nke 19

Jizọs Buru Amụma Ga-emetụta Ụwa Dum

Jizọs kwuru ihe ndị ga-egosi na ọ malitela ọchịchị n’eluigwe nakwa na ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a eruola

MGBE Jizọs na ndịozi ya anọ nọ n’Ugwu Oliv na-ele Jeruselem na ụlọ nsọ ya, ha jụrụ ya ajụjụ banyere ihe ndị ọ gwaburu ha. Ọ dịbeghị anya Jizọs kwuru na a ga-ebibi ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Tupu mgbe ahụ, ọ gwara ha banyere ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’ (Matiu 13:40, 49) Ndịozi ya jụziri ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’—Matiu 24:3.

Mgbe Jizọs na-aza ajụjụ ahụ, ọ gwara ha ihe ga-eme tupu e bibie Jeruselem. Ma ihe ahụ o kwuru abụghị naanị banyere mbibi Jeruselem. Amụma ahụ ga-emecha mezuo n’ụwa niile. Jizọs buru amụma banyere ọtụtụ ihe ga-eme n’ụwa, ya bụ, ihe ndị ga-aghọ ihe ịrịba ama ga-eme ka ndị nọ n’ụwa mata na Jizọs anọrọla n’ocheeze n’eluigwe. Ihe ọ pụtara bụ na ihe ịrịba ama ahụ ga-egosi na Jehova Chineke emeela Jizọs Eze na-achị n’Alaeze Mesaya ahụ e kwere ná nkwa kemgbe. Ihe ịrịba ama ahụ ga-apụta na oge eruwela ka Alaeze ahụ wepụ ihe ọjọọ niile ma mee ka ndị mmadụ nweta ezi udo. Ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma ga-egosi na okpukpe na ọchịchị ndị dị ugbu a, nakwa ndị mmadụ ọjọọ, eruola n’oge ikpeazụ ha—nakwa na ụwa ọhụrụ dị nso.

Mgbe Jizọs na-akọwa ihe ga-eme n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Eze n’eluigwe, o kwuru na a ga-enwe agha mba dị iche iche, ụkọ nri, oké ala ọma jijiji, na ọrịa ndị ga-eru ọtụtụ ebe. Mmebi iwu ga-aba ụba. Ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Ihe a niile ga-eme tupu e nwee “oké mkpagbu” nke a na-enwetụbeghị ụdị ya.—Matiu 24:21.

Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi amata mgbe oké mkpagbu ahụ ga-adị nso? Jizọs gwara ha, sị: ‘Sinụ n’osisi fig mụta ihe.’ (Matiu 24:32) Ozugbo osisi fig malitere ipupụta akwụkwọ, onye hụrụ ya ga-amata na oge okpomọkụ adịla nso. N’otu aka ahụ, mgbe ihe ahụ niile Jizọs buru n’amụma malitere ime n’otu oge, ọ ga-egosi na ọgwụgwụ adịla nso. Ọ dịghị onye ọzọ ga-ama kpọmkwem ụbọchị na mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite, ma ọ́ bụghị Nna anyị nke eluigwe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụrụnụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.”—Mak 13:33.

—O si na Matiu isi nke 24 na nke 25; Mak isi nke 13; Luk isi nke  21.

◼ Olee ihe ndịozi Jizọs chọrọ ka ọ kọwakwuoro ha?

◼ Gịnị ka ihe ịrịba ama ndị ahụ Jizọs kwuru banyere ha pụtara, oleekwa ụfọdụ n’ime ha?

◼ Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

[Foto dị na peeji nke 22]

IHE NDỊ NA-EGOSI NA KRAỊST ANỌRỌLA N’OCHEEZE

Jizọs buru amụma na e nwere ihe ndị ọ ga-abụ ha mewe, a mara na oge Chineke ga-ebibi ụwa a rụrụ arụ eruwela. Malite n’Agha Ụwa nke Mbụ, ụmụ mmadụ na-ahụ ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma. N’ụwa niile, mgbanwe ndị a na-enwe n’okpukpe, n’ọchịchị, nakwa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-egosi na a ga-ebibirịrị ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụrụ na ha chọrọ ịlanahụ, na ha ‘ga-amụrịrị anya’ ma kwadosie ọchịchị Chineke ike.a—Luk 21:36; Matiu 24:3-14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu amụma ndị ọzọ Jizọs buru, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, peeji nke 86-95. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Chaatị dị na peeji nke 22]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

Jeremaya

Abụ Ákwá

Ezikiel

Daniel

Hosia

Joel

Emọs

Obedaya

Jona

Maịka

Nehọm

Habakọk

Zefanaya

Hagaị

Zekaraya

Malakaị

● Matiu

● Mak

● Luk

Jọn

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya