Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
NKEBI NKE 1 GỊNỊ MERE I KWESỊRỊ IJI LỌGHACHIKWUTE JEHOVA?
Ndị fere Jehova n’oge ochie nwekwara ụdị nsogbu ndị anyị na-enwe taa. Ma, Jehova nyeere ha aka. Jehova kwekwara anyị nkwa na ya ga-enyere anyị aka taa. Jehova bụ ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ. Ọ hụkwara atụrụ ya n’anya. O nwee nke kpafurunụ, ọ na-achọwa ya ma nyere ya aka ịlọghachikwute ya.
Nkebi nke 1 ‘M Ga-achọ Atụrụ M Furu Efu’
NKEBI NKE 2-4 OLEE IHE ỤFỌDỤ NWERE IKE IME KA O SIERE MMADỤ IKE ỊLỌGHACHIKWUTE JEHOVA?
Mgbe ụfọdụ, ndị ji obi ha niile na-efe Chineke na-echegbu onwe ha, ma ọ bụ na-ewe iwe maka ihe nwanna ha mere ha. O nwekwara ndị nke obi ha na-ama ikpe maka ihe ọjọọ ha mere. Ị ga-ahụ otú Jehova si nyere ha aka imeri nsogbu ndị ahụ, ha ebido gawa ọmụmụ ihe, bidokwa nwewe obi ụtọ otú ha na-enwebu.
Nkebi nke 2 Nchegbu—Nsogbu “Na-akpagide Anyị n’Ụzọ Niile”
Nkebi nke 3 Mgbe Iwe Na-ewe Anyị—N’Ihi na Anyị ‘Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Mee Mkpesa’”
Nkebi nke 4 Obi Amamikpe—“Sachapụ M Mmehie M”
NKEBI NKE 5 OTÚ Ị GA-ESI LỌGHACHIKWUTE JEHOVA
Ị ga-ahụ ihe ndị gosiri na Jehova chọrọ ka ị lọghachikwute ya. Ị ga-amatakwa banyere Ndị Kraịst lọghachikwutere Jehova, otú ụmụnna ha si nabata ha, nakwa otú ndị okenye si nyere ha aka, ha ebidokwa jiri obi ha niile na-ejere Jehova ozi.
Nkebi nke 5 Lọghachikwute ‘Onye Ọzụzụ Atụrụ na Onye Nlekọta nke Mkpụrụ Obi Gị’