ISI NKE 49
E Gburu Nwunye Eze Bụ́ Nwaanyị Ọjọọ
E nwere otu ụbọchị Eze Ehab nọ n’obí ya dị na Jezril, si na windo na-ele ubi vaịn otu nwoke aha ya bụ Nebọt. Ehab chọrọ ka ubi vaịn a bụrụ nke ya. Ọ gwara Nebọt ka o resị ya ubi vaịn a. Ma, Nebọt jụrụ. Ọ jụrụ maka na Iwu Jehova kwuru ka ndị Izrel ghara ire ala ezinụlọ ha ketara. Ehab ọ̀ kwanyeere Nebọt ùgwù maka ime ihe Jehova kwuru? Mba. Kama, o were ezigbo iwe nke na ọ gara nọrọ n’ime ụlọ ya, o kweghị apụta èzí, o kweghịkwa eri nri.
Nwunye Ehab bụ nwaanyị ọjọọ. Aha ya bụ Jezibel. Ọ gwara Ehab, sị: ‘Ọ bụ gị bụ eze Izrel. Ị ga-enweta ihe ọ bụla ị chọrọ. M ga-enye gị ala ahụ.’ O degaara ndị okenye obodo Nebọt hà akwụkwọ ozi, sị ha bo Nebọt ebubo na ọ kpọrọ Chineke iyi, ka ha jirikwa nkume tụgbuo ya. Ndị okenye ahụ mere ihe Jezibel gwara ha. Jezibel gwaziri Ehab, sị: ‘Nebọt anwụọla. Ubi vaịn ahụ bụzi nke gị.’
Ọ bụghị naanị Nebọt bụ ezigbo mmadụ Jezibel gburu. O gbukwara ọtụtụ ndị hụrụ Jehova n’anya. Jezibel na-ekpere arụsị. O mekwara ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ. Jehova hụrụ ihe ọjọọ niile Jezibel mere. Olee ihe Jehova ga-eme ya?
Mgbe Ehab nwụrụ, Jehoram nwa ya nwoke ghọrọ eze. Jehova zigara otu nwoke aha ya bụ Jihu ka ọ gaa gbuo Jezibel na ndị ezinụlọ ya.
Jihu gbaara ụgbọ ịnyịnya ya gaa Jezril ebe Jezibel bi. Jehoram gbakwaara ụgbọ ịnyịnya nke ya gawa izute ya. Mgbe ọ hụrụ Jihu, ọ jụrụ ya, sị: “Udo ọ̀ dịkwa?” Jihu gwara ya, sị: ‘Udo agaghị adị ebe ọ bụ na Jezibel nne gị na-eme ihe ọjọọ.’ Jehoram tụgharịrị ụgbọ ịnyịnya ya ka ọ gbalaga. Ma, Jihu gbara ya ụta, ya anwụọ.
Jihu gawaziri n’obí eze ebe Jezibel nọ. Mgbe ọ nụrụ na Jihu na-abịa, o tere uri anya, mezie isi ya, gaa na windo ụlọ elu ya nọrọ na-eche ya. Mgbe Jihu rutere, Jezibel ji ọnụ ọjọọ kelee ya. Jihu weliri olu gwa ndị na-ejere Jezibel ozi, bụ́ ndị guzo Jezibel n’akụkụ, sị: “Tụdatanụ ya!” Ha si na windo kwapụ Jezibel, ya adaa n’ala nwụọ.
Jihu mechara gbuo ụmụ Ehab ndị nwoke dị iri asaa. O mekwara ka ndị Izrel kwụsị ife Bel. Ị̀ hụla na Jehova ma ihe niile ndị mmadụ na-eme, ọ ga-egbukwa ndị na-eme ihe ọjọọ mgbe oge ya ruru?
“Ọ bụrụ na mmadụ ji anyaukwu nweta ihe, ọ gaghị enwe obi ụtọ n’ikpeazụ.”—Ilu 20:21