Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es23 p. 57-67
  • Jun

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jun
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2023
  • Isiokwu Nta
  • Tọzdee, Jun 1
  • Fraịdee, Jun 2
  • Satọdee, Jun 3
  • Sọnde, Jun 4
  • Mọnde, Jun 5
  • Tuzdee, Jun 6
  • Wenezdee, Jun 7
  • Tọzdee, Jun 8
  • Fraịdee, Jun 9
  • Satọdee, Jun 10
  • Sọnde, Jun 11
  • Mọnde, Jun 12
  • Tuzdee, Jun 13
  • Wenezdee, Jun 14
  • Tọzdee, Jun 15
  • Fraịdee, Jun 16
  • Satọdee, Jun 17
  • Sọnde, Jun 18
  • Mọnde, Jun 19
  • Tuzdee, Jun 20
  • Wenezdee, Jun 21
  • Tọzdee, Jun 22
  • Fraịdee, Jun 23
  • Satọdee, Jun 24
  • Sọnde, Jun 25
  • Mọnde, Jun 26
  • Tuzdee, Jun 27
  • Wenezdee, Jun 28
  • Tọzdee, Jun 29
  • Fraịdee, Jun 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2023
es23 p. 57-67

Jun

Tọzdee, Jun 1

Otu nwaanyị di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.—Mak 12:42.

Ihe na-esiri nwaanyị ahụ di ya nwụrụ ezigbo ike. Ọ ga-abụ na ọ na-esiri ya ike inweta ihe ndị dị ya mkpa ná ndụ. Ma, ọ gara n’otu n’ime igbe onyinye ndị dị ebe ahụ tụnye mkpụrụ ego abụọ dị ezigbo nta. Ọ ga-abụ na mkpụrụ ego ndị ahụ ọ tụnyere emechaghị mkpọtụ mgbe ọ tụnyere ha. Jizọs hụrụ ego ole ọ tụnyere. Ọ bụ mkpụrụ ego lepta abụọ. Ọ bụ ego kacha nta n’oge ahụ. Ọ gaghịdị ezu iji zụọ otu mkpụrụ nza, bụ́kwanụ nnụnụ a na-eri eri kacha ọnụ ala n’oge ahụ. Ihe nwaanyị a di ya nwụrụ mere tọgburu Jizọs atọgbu. N’ihi ya, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya, gosi ha nwaanyị ahụ ma sị ha: “Nwaanyị a di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, tụnyere ihe karịa ihe ndị niile ahụ na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego tụnyere.” Ọ kọwara ihe mere o ji kwuo ihe ahụ. Ọ sịrị: “N’ihi na ha niile tụnyere ihe site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, ihe dum o ji biri, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.” (Mak 12:43, 44) Ihe mere nwaanyị a ji tụnye ihe niile o nwere n’igbe ahụ n’ụbọchị ahụ bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro ya mkpa ya niile.—Ọma 26:3. w21.04 6 ¶17-18

Fraịdee, Jun 2

Lee! unu emewo ka ozizi unu jupụta Jeruselem.—Ọrụ 5:28.

N’oge niile Jizọs nọ n’ụwa, ọ daghị mbà n’ikwusa ozi ọma. Ọ chọkwara ka ndị na-eso ụzọ ya nọgide na-ekwusa ozi ọma n’adaghị mbà. (Jọn 4:35, 36) Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Luk 10:1, 5-11, 17) Ma, mgbe a nwụchiri ya ma gbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya kwụsịtụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Jọn 16:32) Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha lekwasị anya n’ikwusa ozi ọma. Mgbe ọ lakwara eluigwe, ha ji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke na ndị iro ha kwuwere ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si. N’oge ndịozi, Jizọs duziri ndị na-eso ụzọ ya n’ozi ọma ha kwusara. Jehova gọzikwara ha, ọtụtụ ndị anabata ozi ha. Dị ka ihe atụ, na Pentikọst nke afọ 33, ihe dị ka puku mmadụ atọ mere baptizim. (Ọrụ 2:41) Ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mụbara n’ụzọ dị ịtụnanya. (Ọrụ 6:7) Jizọs bukwara amụma na ọtụtụ ndị ga-anabata ozi ọma n’oge ikpeazụ.—Jọn 14:12; Ọrụ 1:8. w21.05 14 ¶1-2

Satọdee, Jun 3

Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị ahụ ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ n’ebe m nọ.—Mat. 11:6.

Ì chetara otú obi dị gị mgbe mbụ ị matara eziokwu dị na Baịbụl? I chere na mmadụ niile ga-anabata ihe ahụ i kweere. Obi sikwara gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi ga-eme ka ndụ ha nwee isi, meekwa ka ha nwee olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu. (Ọma 119:105) N’ihi ya, i ji ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị ihe ị mụtara na Baịbụl. Ma, gịnị mechara mee? Ọ tụrụ gị n’anya na ọtụtụ n’ime ha ekwetaghị ihe ị gwara ha. Ọ bụrụ na ndị ọzọ ajụ ozi ọma anyị, o kwesịghị ịtụ anyị n’anya. Mgbe Jizọs dị ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị jụrụ ya n’agbanyeghị na ọ rụrụ ọrụ ebube nke gosiri na ọ bụ Chineke zitere ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs rụrụ ọrụ ebube kpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Ndị na-emegide ya enwekwaghị ike ịsị na o meghị ya. N’agbanyeghị ya, ndị ndú ndị Juu ekwetaghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ha chọdịrị igbu ma yanwa ma Lazarọs.—Jọn 11:47, 48, 53; 12:9-11. w21.05 2 ¶1-2

Sọnde, Jun 4

Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, . . . kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume.—Hib. 10:25.

Gbalịa na-agachi ọmụmụ ihe anya, ọ ga-abara gị ezigbo uru. Ị ga-esikwa otú ahụ matakwuo ụmụnna gị. Meta ụmụnna ndị i nwere ike ịmụta ihe n’aka ha enyi, ma ndị gị na ha na-abụghị ọgbọ ma ọ bụ ndị gị na ha na-esighị otu ebe. Baịbụl gwara anyị na ndị agadi nwere amamihe. (Job 12:12) Ndị agadi nwekwara ọtụtụ ihe ha nwere ike ịmụta n’aka ndị na-eto eto. Devid bụ obere nwa n’ebe Jọnatan nọ. Ma nke ahụ emeghị ka ha ghara ịbụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Devid na Jọnatan nyeere ibe ha aka ife Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị siri ike bịaara ha. (1 Sam. 23:16-18) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Irina onye ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha kwuru, sị: “Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nwere ike ịghọrọ anyị ndị nne na nna na ụmụnne. Jehova nwere ike iji ha nyere anyị aka.” Ndị enyi gị chọrọ inyere gị aka, chọọkwa ịgba gị ume. Ma, ọ bụ gị ga-eme ka ha mata otú ha ga-esi eme ya. w21.06 10-11 ¶9-11

Mọnde, Jun 5

Otú ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu anaghị eji obi ya niile agbaghara nwanna ya.—Mat. 18:35.

Jizọs mere ihe atụ gbasara otu eze na ohu ya. Eze ahụ kagburu ụgwọ ohu ya ahụ ji ya nke ọ na-enweghị ike ịkwụghachi. Mgbe e mechara, ohu ahụ gara hụ ohu ọzọ ji ya ụgwọ ma jụ ịgbaghara ya obere ego o ji ya. N’ikpeazụ, eze ahụ jidere ohu ahụ na-ekweghị agbaghara ohu ibe ya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ohu ahụ mejọrọ onwe ya, mejọọkwa ndị ọzọ. Nke mbụ, o ji obi ọjọọ mee ka a tụba ohu ibe ya “n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụ ụgwọ o ji.” Nke abụọ, ihe o mere wutere ndị ohu ndị ọzọ. Baịbụl sịrị: “Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu.” (Mat. 18:30, 31) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe anyị mere nwere ike iwute ndị ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị, anyị ajụ ịgbaghara ya, gịnị ka o nwere ike ịkpata? Nke mbụ, ọ ga-ewute ya n’ihi na anyị jụrụ ịgbaghara ya ma ọ bụ igosi ya ịhụnanya. Nke abụọ, ọ ga-ewutekwa ndị ọzọ anyị na ha nọ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha achọpụta na anyị na nwanna na-ese okwu. w21.06 22 ¶11-12

Tuzdee, Jun 6

[Ọ ga-ebibi] ndị na-ebibi ụwa.—Mkpu. 11:18.

Ekwensu na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ hụ na ụmụ mmadụ e kere n’oyiyi Chineke na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ. Mgbe Chineke hụrụ “na ihe ọjọọ mmadụ na-eme n’ụwa karịrị akarị” n’oge Noa, “o wutere Jehova na o kere mmadụ n’ụwa, obi adịghịkwa ya mma.” (Jen. 6:5, 6, 11) Ihe ọ̀ kalanụ mma kemgbe ahụ? Mba. Obi na-atọ Setan ezigbo ụtọ ma ọ na-ahụ mmekọahụ rụrụ arụ n’ụdị ya dị iche iche jupụtara n’ụwa taa, ma nke nwoke na nwaanyị, ma nke nwoke na nwoke na nke nwaanyị na nwaanyị. (Efe. 4:18, 19) Setan na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe ọ bụla o mere ka ndị na-efe Chineke mee mmehie dị oké njọ. N’ụwa a Ekwensu na-achị, ọ bụghị naanị na ‘mmadụ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu,’ kama, ọ na-emebi ụwa Chineke nyere ya ka ọ na-elekọta, na-emegbukwa ụmụ anụmanụ. (Ekli. 8:9; Jen. 1:28) Gịnị ka ihe a kpatara? Ụfọdụ ndị ọkachamara ekwuola na otú ụmụ mmadụ si na-emebi ụwa nwere ike ime ka ụdị ihe dị iche iche e kere eke ruru otu nde gharakwa ịdị n’ụwa a n’oge na-adịghị anya. w21.07 12 ¶13-14

Wenezdee, Jun 7

[Jehova] ga-agbaghara ya mmehie ya kpamkpam.—Aịza. 55:7.

E nwere ụfọdụ ndị ohu Chineke obi ha ka na-ama ikpe n’ihi ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga. Ọ na-eme ka ha chee na Jehova enweghị ike ịgbaghara ha n’agbanyeghị na ha echegharịala, rịọ Jehova mgbaghara ma kwụsị ime ihe ọjọọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ otú a ka ọ dị gị, ịghọta na Jehova dị njikere igosi ndị ohu ya ịhụnanya pụrụ iche ga-enyere gị aka iji obi ụtọ na akọnuche dị ọcha na-efe Jehova. Ihe mere o ji kwe omume bụ na ‘ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ anyị mmehie niile.’ (1 Jọn 1:7) Ọ bụrụ na ihe ụfọdụ ị na-emejọ na-eme ka obi na-ada gị mbà, cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ. Lee otú Devid bụ́ ọbụ abụ si kwuo ihe jikọrọ ịhụnanya pụrụ iche na mgbaghara mmehie. Ọ sịrị: “Otú a na-enweghị ike ịtụ ihe eluigwe ji dị elu karịa ụwa atụ̀ ka a na-enweghị ike ịtụ ịhụnanya pụrụ iche ọ na-egosi ndị na-atụ egwu ya. Otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ bụkwa otú o wepụrụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ.”—Ọma 103:11, 12. w21.11 5-6 ¶12-13

Tọzdee, Jun 8

Ụmụ ya na-ebili too ya. Di ya na-ebili jaa ya mma.—Ilu 31:28.

Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù. (1 Pita 3:7) Onye na-akwanyere mmadụ ùgwù na-eji ya akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, di na-egosi na ọ na-akwanyere nwunye ya ùgwù ma ọ bụrụ na ọ na-emeso ya ihe ka onye dị ezigbo mkpa. Ọ naghị atụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli. Ọ naghịkwa eji ya atụnyere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ. Olee otú obi ga-adị nwaanyị ma ọ bụrụ na di ya ejiri ya na-atụnyere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ? E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rosa. Di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na-ejikarị ya atụnyere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ. Okwu ọjọọ ndị ọ na-agwa ya emeela ka ọ ghara ịna-enwe obi ụtọ, meekwa ka ọ na-eme ya obi abụọ ma è nwekwara onye hụrụ ya n’anya. Rosa sịrị: “M na-achọ ka a na-echetara m mgbe niile na Jehova ji m kpọrọ ihe.” Di bụ́ Onye Kraịst anaghị eji nwunye ya atụnyere ndị ọzọ, kama, ọ na-akwanyere ya ùgwù. Ọ ma na ịkwanyere ya ùgwù ga-eme ka ha abụọ dịrị ná mma, meekwa ka ya na Jehova dịrị ná mma. Ezigbo di na-akwanyere nwunye ya ùgwù, na-aja ya mma, na-emesikwa ya obi ike na ọ hụrụ ya n’anya. w21.07 22 ¶7-8

Fraịdee, Jun 9

M ga-echere Chineke.—Maị. 7:7.

Ị̀ na-echegbu onwe gị ma ọ bụrụ na ahịa ị tụrụ dị gị ezigbo mkpa alọtaghị n’oge ị tụrụ anya ya? Ma, ọ bụrụ na ị mata na e nwere ezigbo ihe mere ihe ahụ alọtaghị n’oge ị tụrụ anya ya, ọ̀ bụ na ị gaghị adị njikere ichere ya ruo mgbe ọ ga-alọta? Ilu 13:11 kụziiri anyị ihe mere anyị kwesịrị iji na-enwe ndidi. Ọ sịrị: “Akụ̀ a kpatara ngwa ngwa ga na-agbada agbada, ma akụ̀ mmadụ na-akpata obere obere ga na-amụba amụba.” Ị̀ hụrụ ihe ebe a kwuru? Inwe ndidi na-aba ezigbo uru. Ilu 4:18 gwara anyị na “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ, nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.” Ebe a na-ekwu gbasara otú Jehova si eji nwayọọ nwayọọ eme ka ndị ya mara ihe bụ́ nzube ya. Amaokwu a na-enyekwara anyị aka ịghọta otú Onye Kraịst si eme mgbanwe ná ndụ ya ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. Ọ ga-ewe oge tupu mmadụ abịaruo Jehova nso. A naghị eme ya ọkụ ọkụ. w21.08 8 ¶1, 3-4

Satọdee, Jun 10

Lee m, ziga m.—Aịza. 6:8.

Anyị nwere ọtụtụ ọrụ ndị anyị ga-arụ ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso. (Mat. 24:14; Luk 10:2; 1 Pita 5:2) Anyị niile chọrọ iji ike anyị niile jeere Jehova ozi. Ọtụtụ n’ime anyị na-ewepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ ndị chọrọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ, ndị ọzọ chọkwara ije ozi na Betel ma ọ bụ na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Ọtụtụ ụmụnna nwoke na-agbalịkwa ka ha ruo eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye. (1 Tim. 3:1, 8) Obi na-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka ndị ya na-achọ iwepụta onwe ha ijere ya ozi. (Ọma 110:3) Ma obi ọ̀ na-ada gị mbà na i nweghị ike imeli ihe ụfọdụ ị chọrọ ime n’ozi Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, kọsara ya Jehova. (Ọma 37:5-7) Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịgwa nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ka ọ tụọrọ gị aro ihe i nwere ike ime iji na-emekwu nke ọma n’ozi Jehova. Gbaakwa mbọ ka i mee ihe ọ gwara gị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, i nwere ike inweta ihe ahụ ị na-atụ anya ya. w21.08 20 ¶1; 21 ¶4

Sọnde, Jun 11

Jehova [agaghị] ahapụ ndị na-erubere ya isi.—Ọma 37:28.

Onye amụma nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Ana dị afọ iri asatọ na anọ, ma “ụkwụ ya anaghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ.” Otú Jehova si gọzie ya maka ịgachi ụlọ nsọ anya bụ na o mere ka ọ hụ Jizọs mgbe e ku ya n’aka bịa n’ụlọ nsọ. (Luk 2:36-38) N’oge a, e nwere ọtụtụ ndị agadi na-efe Jehova ndị na-eto eto ga-amụta ezigbo ihe n’aka ha. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge jụọ ha ajụjụ ma gee ha ntị ka ha na-akọrọ anyị gbasara ihe ọma ndị meere ha n’ozi Jehova, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-abara anyị uru. Ụmụnna anyị ndị agadi dị ezigbo mkpa n’ọgbakọ Jehova. Ha ahụla otú Jehova si gọzie ọgbakọ ya n’ọtụtụ ụzọ nakwa otú Jehova si gọzie hanwa. Ha esila n’ihe ndị ha mejọrọ mụta ọtụtụ ihe dị mkpa. Were ha ka “ebe e si enweta amamihe” ma mụta ihe n’aka ha. (Ilu 18:4) Ọ bụrụ na i wepụta oge mata ha nke ọma, okwukwe gị ga-esikwu ike. w21.09 3 ¶4; 4 ¶7-8; 5 ¶11, 13

Mọnde, Jun 12

Onye dị ntakịrị ga-aghọ otu puku mmadụ. Onye dị obere ga-aghọkwa mba dị ike.—Aịza. 60:22.

Aịzaya kwuru na ndị na-ejere Jehova ozi ga-aṅụ “ara mba dị iche iche.” (Aịza. 60:5, 16) Ndị na-abata n’ọgbakọ Jehova na-eji nkà dị iche iche ha nwere enye aka eme ka anyị na-ekwusa ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ, na-ebikwa akwụkwọ anyị n’ihe karịrị otu puku asụsụ. N’oge ikpeazụ a, ịma jijiji nke mba niile na-eme ka ndị mmadụ kpebie ma hà ga-akwado Alaeze Chineke ka hà ga na-atụkwasị ọchịchị ụwa a obi. Ihe a bụ mkpebi dịịrị onye ọ bụla. N’agbanyeghị na ndị Jehova na-erube isi n’iwu obodo ha nọ na ya, ha anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. (Rom 13:1-7) Ha ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile. Alaeze ahụ abụghịkwa nke ụwa a.—Jọn 18:36, 37. w21.09 17-18 ¶13-14

Tuzdee, Jun 13

Gwanụ ya ihe niile dị unu n’obi.—Ọma 62:8.

Ọ bụrụ na onye gị ahapụ ọgbakọ, ọ dị ezigbo mkpa ka ị nọgide na-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe gị na ndị ezinụlọ gị na-esikwu ike. Olee otú i nwere ike isi na-eme ya? Na-amụchi Okwu Chineke anya, na-atụgharị uche na ya, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Joanna papa ya na nwanne ya nwaanyị pụrụ n’ọgbakọ sịrị: “Obi na-eru m ala ma m gụọ banyere ndị dị ka Abigel, Esta, Job, Josef, na Jizọs. Ihe ndị ha mere na-eme ka m na-eche ihe ndị bara uru, na-emekwa ka ihe ahụ merenụ ghara ịna-ewutebiga m ókè.” Ọ bụrụ na obi ajọwa gị njọ, akwụsịla ikpe ekpere. Rịọ Chineke ka o nyere gị aka ka i si otú yanwa si ele ihe anya lewe ihe ahụ anya, nakwa ka o mee “ka ị mara ihe, zikwa gị ụzọ i kwesịrị iso.” (Ọma 32:6-8) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịna-ewute anyị ma anyị na-agwa Jehova otú obi dị anyị. Ma Jehova na-aghọta anyị nke ọma. Ọ gbara anyị ume ka anyị gwa ya ihe ndị ahụ na-enye anyị nsogbu n’obi.—Ọpụ. 34:6; Ọma 62:7, 8. w21.09 28 ¶9-10

Wenezdee, Jun 14

Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m. Geenụ ya nti.—Mat. 17:5.

Mgbe Ememme Ngabiga nke afọ 32 gachara, ndịozi atọ bụ́ Pita, Jems, na Jọn hụrụ ọhụụ dị ịtụnanya. Mgbe ha nọ n’ugwu dị oké elu, o nwere ike ịbụ n’akụkụ Ugwu Hemọn, Jizọs nwoghara n’ihu ha. Baịbụl sịrị: “Ihu ya [chawara] ka anyanwụ, uwe elu ya ana-enwukwa gbaa dị ka ìhè.” (Mat. 17:1-4) Ndịozi ahụ nụrụ ka Chineke sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m. Geenụ ya nti.” Otú ndịozi atọ ahụ si bie ndụ gosiri na ha gere Jizọs ntị. Anyị kwesịkwara ime ka ha. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova si n’aka Jizọs bụ́ “onyeisi ọgbakọ ya” na-eduzi anyị. (Efe. 5:23) Ka anyị kpebisie ike ‘ịna-ege ya ntị’ otú ahụ ndịozi bụ́ Pita, Jems na Jọn mere. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ ma nọgide n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ, anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi ugbu a, na-enwekwa obi ụtọ ruo ebighị ebi. w21.12 22 ¶1; 27 ¶19

Tọzdee, Jun 15

M ga-adọ gị aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị.—Jere. 30:11.

E nwere otu nwanna nọ na Kọrịnt ya na nwunye nna ya na-akwa iko. Pọl onyeozi gwara ndị Kọrịnt ka a chụọ ya n’ọgbakọ. Ihe ahụ nwoke ahụ nọ na-eme nọ na-akpa ọgbakọ ahụ aka ọjọọ. Ụfọdụ ewereghịdị ihe ahụ ọ na-eme ka ihe jọgburu onwe ya. (1 Kọr. 5:1, 2, 13) Pọl mechara chọpụta na nwoke ahụ mere ihe ọjọọ ejirila obi ya niile chegharịa. Pọl gwara ndị okenye, sị: ‘Gbagharanụ ya ma kasie ya obi.’ Lee ihe mere Pọl ji kwuo ihe a. Ọ sịrị: “Ka otú ọnọdụ ya si ewute ya ghara ime ka ọ daa mbà.” Pọl meteere nwoke ahụ chegharịrịnụ ebere. Pọl achọghị ka ihe ọjọọ ahụ o mere wutebiga ya ókè nke na ọ gaghịzi na-agba mbọ ka a gbaghara ya. (2 Kọr. 2:5-8, 11) Dịkwa ka Jehova, ndị okenye na-eme ebere. Ha na-adọsi onye mere mmehie dị oké njọ aka ná ntị ike mgbe ọ dị mkpa. Ma, ha na-agbalịkwa imere ya ebere mgbe ọ bụla o kwesịrị. Ọ bụrụ na ndị okenye adọghị onye mere mmehie aka ná ntị, ọ bụghị ebere ka ha na-emere ya, kama, ha na-akwado ihe ọjọọ. w21.10 11-12 ¶12-15

Fraịdee, Jun 16

Abọla ọbọ. Ebukwarala mmadụ ibe gị iwe n’obi.—Lev. 19:18.

E nwere ike iji ihe wutere mmadụ tụnyere mmerụ ahụ́. Ụfọdụ na-adị obere, ụfọdụ ana-ebu ezigbo ibu. Dị ka ihe atụ, were ya na ị na-ebe mbọ, gị emerụọ onwe gị obere ahụ́ na mkpịsị aka. O nwere ike ịfụ gị ụfụ. Ma, ihe dị ka otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gachaa, o nwere ike ị gaghị echeta ebe ihe ahụ mere gị. Mmadụ nwekwara ike mee anyị ihe na-abughị oké ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, enyi anyị nwere ike kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe n’echeghị echiche, ya ewee anyị iwe. Ma, ọ na-adịrị anyị mfe ịgbaghara ya. Ma ọ bụrụ na anyị emerụọ ezigbo ahụ́, o nwere ike ịdị mkpa ka dọkịta dụchie ebe ahụ anyị merụrụ ahụ́ ma kechie ya ihe ka o nwee ike ịla. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-adụtụ ebe ahụ anyị merụrụ ahụ́ ihe, anyị ga-emerụkwu onwe anyị ahụ́. Mmadụ nwere ike ịna-eme ụdị ihe ahụ ma e mee ya ihe wutere ya. O nwere ike ịnọ na-eche ihe ahụ e mere ya mgbe niile nakwa otú o si na-ewute ya. Ma, ndị na-ebu iwe n’obi na-ata onwe ha ahụhụ. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị mee ihe ahụ e kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si. w21.12 12 ¶15

Satọdee, Jun 17

Gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe?—Rom 14:10.

Ka e were ya na otú nwanna si eji ejiji adịghị otu okenye mma. Okenye ahụ nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Ò nwere iwu Akwụkwọ Nsọ otú nwanna a si eji ejiji mebiri?’ Ebe ọ bụ na okenye ahụ achọghị iji aka ya eme iwu, o nwere ike ịjụta okenye ọzọ ma ọ bụkwanụ nwanna ọzọ ma nke a na-akọ ihe o chere. Ha abụọ nwere ike ileba anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru gbasara uwe na ejiji. (1 Tim. 2:9, 10) Pọl kwuru ihe ụfọdụ anyị kwesịrị iburu n’obi maka ejiji. O kwuru na uwe Ndị Kraịst kwesịrị ịdị mma n’anya, na-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma. Ma Pọl akpọghị aha ụdị uwe Onye Kraịst kwesịrị iyi na nke ọ na-ekwesịghị iyi. Ọ ma na Onye Kraịst ọ bụla nwere ike iji ejiji dị ya mma ma ọ bụrụhaala na o mebighị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị ịchọpụta ma uwe na ejiji nwanna ahụ ọ̀ dị mma n’anya ma na-egosi na ọ na-ele ihe anya otú dị mma. Anyị kwesịrị iburu n’uche na ụmụnna abụọ ma nke a na-akọ nwere ike ikpebi ime ihe abụọ dị iche, ya abụrụ na e nweghị nke dị njọ na ha abụọ. Anyị ekwesịghịkwa ịmanye ụmụnna anyị imewe ihe anyịnwa chere na ọ dị mma. w22.02 16 ¶9-10

Sọnde, Jun 18

Na-egosinụ ibe unu ịhụnanya pụrụ iche, na-emekwaranụ ibe unu ebere.—Zek. 7:9, ihe e dere n’ala ala peeji ya.

E nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji gosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche. Olee ụfọdụ n’ime ha? Ihe ndị a si n’akwụkwọ Ilu ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a: “Akwụsịla igosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche. . . . I mee ya, ihe gị ga na-amasị ma Chineke ma mmadụ.” “Nwoke obiọma na-abara onwe ya uru.” “Onye na-agbalị ime ezi omume ma na-ahụ ndị ọzọ n’anya ga-adị ndụ.” (Ilu 3:3, 4, ihe e dere n’ala ala peeji ya; 11:17; 21:21) Ihe ndị a e kwuru n’akwụkwọ Ilu gwara anyị ihe atọ mere anyị kwesịrị iji gosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche. Nke mbụ, igosi ibe anyị ịhụnanya pụrụ iche ga-eme ka Jehova jiri anyị kpọrọ ihe. Nke abụọ, ọ na-abara anyịnwa uru. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka anyị na ndị ọzọ dị n’ezigbo mma. Nke atọ, ọ ga-abara anyị uru n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ọ ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji mee ihe Jehova gwara anyị, nke bụ́: “Na-egosinụ ibe unu ịhụnanya pụrụ iche, na-emekwaranụ ibe unu ebere.”—Zek. 7:9, ihe e dere n’ala ala peeji ya. w21.11 8 ¶1-2

Mọnde, Jun 19

Mee ka anyị nwekwuo okwukwe.—Luk 17:5.

Ọ bụrụ na nsogbu ndị bịaara gị n’oge gara aga ma ọ bụ ugbu a egosi na e nwere ebe okwukwe gị na-esichaghị ike, ike agwụla gị. Were ya ka ohere ị ga-eji mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Na-ekpesi ekpere ike, karịchaa, mgbe ọnwụnwa bịara. Cheta na Jehova nwere ike isi n’aka ndị enyi gị na n’aka ndị ezinụlọ gị nyere gị aka. Ọ bụrụ na i kwe ka Jehova nyere gị aka idi nsogbu ndị na-abịara gị ugbu a, obi ga-esikwu gị ike na ọ ga-enyere gị aka idi nsogbu ndị ga-abịara gị n’ọdịnihu. Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịmata ebe ha chọkwuru okwukwe. Ma, o meghị ya obi abụọ na Jehova ga-enyere ha aka imeri ọnwụnwa ndị ga-abịara ha n’ọdịnihu. (Jọn 14:1; 16:33) Obi siri ya ike na e nwere oké ìgwè mmadụ okwukwe ha ga-enyere aka ịgafe oké mkpagbu na-abịanụ. (Mkpu. 7:9, 14) Ị ga-eso na ha ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe niile i nwere ike ime ugbu a iji mee ka okwukwe gị sie ezigbo ike.—Hib. 10:39. w21.11 25 ¶18-19

Tuzdee, Jun 20

Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị na-atụ egwu ya.—Ọma 34:7.

Anyị anaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube chebe anyị. Ma, anyị ma na onye ọ bụla tụkwasịrị Jehova obi ga-enweta ndụ ebighị ebi ọ bụrụgodị na ọ nwụọ ugbu a. N’oge na-adịghị anya, a ga-enwe ihe ga-eme ka o doo anya ma ànyị ga-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-echebe anyị. Mgbe Gọg nke Megọg, ya bụ, ọtụtụ mba gbakọrọ aka ọnụ, ga-alụso ndị Chineke ọgụ, anyị nwere ike ịna-eche na ha ga-egbu anyị. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-azọpụtali anyị nakwa na ọ ga-azọpụta anyị. Mba ndị ahụ nwere ike ịna-eche na anyị dị ka atụrụ na-enweghị onye ga-echebe ya. (Ezik. 38:10-12) Anyị agaghị eji ngwá agha, a gaghịkwanụ azụ anyị ịlụ agha. Mba ndị ahụ nwere ike ịna-eche na anyị bụ anụ oriri. Ha agaghị ama na anyị ji okwukwe na-ahụ ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara anyị gburugburu dị njikere ichebe anyị. Oleekwanụ otú mba ndị ahụ ga-esi ama ebe ọ bụ na ha enweghị okwukwe na Chineke? Ọ ga-ejuzi ha anya mgbe ndị agha nke eluigwe ga-alụrụ anyị ọgụ.—Mkpu. 19:11, 14, 15. w22.01 6 ¶12-13

Wenezdee, Jun 21

Hụnụ ụmụnna niile n’anya.—1 Pita 2:17.

Ụmụnna anyị niile bara uru n’anya Jehova. Anyị kwesịkwara iwere ha ka ndị bara uru. Anyị kwesịrị ime ka ha mata na anyị hụrụ ha n’anya ma gbalịa ka anyị ghara imejọ ha. Ọ bụrụ na anyị amata na anyị mejọrọ nwanna anyị ma ọ bụkwanụ kpasuo ya iwe, anyị ekwesịghị ime ka à ga-asị na o nweghị ihe ọ bụ. Anyị ekwesịghị ịsị na ọ bụ onye iwe ọkụ nakwa na o kwesịrị ịkwụsị ya. Olee ihe mere ihe anyị mere nwere ike iji wute ụfọdụ ụmụnna anyị? Ụfọdụ ụmụnna anyị na-eche na o nweghị uru ha bara n’ihi otú e si zụlite ha. Ụfọdụ bụkwa ndị ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ. N’ihi ya, ha amụtabeghị otú ha ga-esi na-emeso ụmụnna ha na-ezughị okè ihe. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị kwesịrị ịgbalị na-eme ihe anyị kwesịrị ime iji hụ na anyị na ụmụnna anyị na-adị ná mma. Ihe ọzọ bụkwa na ọ bụrụ na mmadụ bụ onye obere ihe na-ewe ezigbo iwe, o kwesịrị ịgbalị gbanwee àgwà ahụ. Ọ ga-eme ka obi na-eru ya ala, meekwa ka ya na ndị mmadụ na-adị ná mma. w21.06 21 ¶7

Tọzdee, Jun 22

Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile ji obi ha niile na-akpọku ya.—Ọma 145:18.

Jizọs ma otú obi dị gị. Nsogbu bịara anyị, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ezigbo enyi ghọtara anyị kasie anyị obi, karịchaa onye ụdị nsogbu ahụ bịaarala. Jizọs bụ ụdị enyi ahụ. Ọ ma otú ọ na-adị mmadụ ma ike gwụ ya nakwa ma ọ chọọ ka e nyere ya aka. Ọ ma otú e si kee anyị. Ọ ga-ahụkwa na e nyeere anyị aka “n’oge anyị chọrọ ka e nyere anyị aka.” (Hib. 4:15, 16) Otú ahụ Jizọs si kwe ka mmụọ ozi ahụ nyere ya aka n’ogige Getsemeni, anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-enyere anyị aka. O nwere ike isi n’akwụkwọ anyị, na vidio, n’okwu ma ọ bụ n’aka ndị okenye ma ọ bụ enyi anyị bịara leta anyị nyere anyị aka. (Luk 22:39-44) Jehova ga-eme ka i nwee “udo Chineke na-enye,” meekwa ka ị dị ike? Anyị kpee ekpere, anyị ga-enweta “udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ.”—Fil. 4:6, 7. w22.01 18-19 ¶17-19

Fraịdee, Jun 23

Ha na-agwa ndị nọ ebe ahụ ihe ndịozi . . . kpebiri.—Ọrụ 16:4.

Jehova na-eme ihe dị mma mgbe niile. Ma, o nwere ike ịna-esitụrụ anyị ike mgbe ụfọdụ ịtụkwasị ụmụ mmadụ ndị o ji eduzi anyị obi. Anyị nwere ike ịna-eche ma ụmụnna ndị a hà na-eme ihe Jehova chọrọ ka ha mee, ka hà na-eme ihe ha chere. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị ekwuli na anyị tụkwasịrị Jehova obi ma ọ bụrụ na anyị atụkwasịghị ndị o ji eduzi anyị obi, bụ́kwanụ ndị yanwa tụkwasịrị obi. Jehova na-eji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” eduzi nzukọ ya n’ụwa taa. (Mat. 24:45) Ohu ahụ na-elekọta ndị Chineke n’ụwa niile ma na-agwa ndị okenye ihe ha ga-eme, otú ahụ òtù na-achị isi mere n’oge ndịozi Jizọs. Ndị okenye na-emezi ihe a gwara ha mee n’ọgbakọ. Anyị ga-egosi na anyị tụkwasịrị otú Jehova si eme ihe obi ma ọ bụrụ na anyị ana-erube isi ná ntụziaka ọ bụla Òtù Na-achị Isi na ndị okenye nyere. w22.02 4 ¶7-8

Satọdee, Jun 24

Ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị.—Gal. 6:9.

Obi dị anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị nyere onye ‘na-akpa àgwà otú na-egosi na ọ chọrọ inweta ndụ ebighị ebi’ aka ya aghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 13:48) Obi na-adị anyị ụtọ otú ahụ ọ dị Jizọs onye ‘mmụọ nsọ mere ka ọṅụ ju obi’ mgbe ndị na-eso ụzọ ya mere nke ọma n’ozi ọma ha gara ikwusa. (Luk 10:1, 17, 21) Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Na-eme ike gị niile ka ị bụrụ onye e ji ama atụ nakwa onye na-akụzi ihe nke ọma.” Ọ gwakwara ya, sị: “N’ihi na ọ ga-eme ka ị zọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.” (1 Tim. 4:16) N’ihi ya, ozi ọma a na-azọ ndụ ndị mmadụ. Anyị na-eme ike anyị niile iji bụrụ ndị e ji ama atụ n’ihi na anyị bụ ụmụ amaala Alaeze Chineke. Anyị na-agbalị ike anyị niile ịhụ na anyị na-ebi ndụ otú ga-eme ka e too Jehova na otú ga-adaba n’ihe anyị na-ekwusara ndị mmadụ n’ozi ọma. (Fil. 1:27) Otú anyị si egosi na anyị na-eme ike anyị niile ịkụzi ihe nke ọma bụ ịkwadebe nke ọma maka ozi ọma nakwa ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka tupu anyị ezie mmadụ ozi ọma. w21.10 24 ¶1-2

Sọnde, Jun 25

Yirinụ àgwà ọhụrụ.—Kọl. 3:10.

A sị na mmadụ yi “àgwà ọhụrụ,” ọ pụtara na onye ahụ na-eme ka Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ yi àgwà ọhụrụ, ọ ga na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ọ ga-ekwe ka mmụọ nsọ na-eme ka ihe ọ na-eche na ihe ọ na-eme bụrụ ihe ndị dị mma. Dị ka ihe atụ, onye ahụ ga-ahụ Jehova na ndị ya n’anya. (Mat. 22:36-39) Onye ahụ na-enwekwa ọṅụ ọ bụrụgodị na ọnwụnwa abịara ya. (Jems 1:2-4) Ọ na-eme udo. (Mat. 5:9) Ọ na-enwe ndidi, na-emekwara ndị ọzọ obiọma. (Kọl. 3:13) Ihe dị mma na-amasị ya, ọ na-emekwa ya. (Luk 6:35) Otú o si akpa àgwà na-egosi na o nwere okwukwe siri ike n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. (Jems 2:18) Ọ na-adị nwayọọ ma a kpasuo ya iwe, na-ejidekwa onwe ya ma ọnwụnwa bịara ya. (1 Kọr. 9:25, 27; Taị. 3:2) Ọ bụrụ na anyị chọrọ iyiri àgwà ọhụrụ, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma niile e kwuru okwu ha ná Ndị Galeshia 5:22, 23 nakwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. w22.03 8-9 ¶3-4

Mọnde, Jun 26

Na-emenụ ka m.—1 Kọr. 11:1.

Otú ndị okenye ga-esi eme ka Pọl onyeozi abụghị naanị ịna-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, kama ha kwesịkwara ịdị njikere ikwusa ozi ọma n’oge ọ bụla nakwa n’ebe ọ bụla ha nọ. (Efe. 6:14, 15) Ndị okenye nwekwara ike ịna-eme ka Pọl ma ọ bụrụ na ha ejiri oge ha nọ n’ozi ọma na-azụ ndị ọzọ, ma ndị ohu na-eje ozi. (1 Pita 5:1, 2) Ma, ndị okenye ekwesịghị ikwe ka ọrụ ndị ha na-arụ mee ka ha ghara inwe ohere ikwusa ozi ọma. (Mat. 28:19, 20) Iji nwee ohere rụọ ọrụ ndị ha kwesịrị ịrụ, o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka ha jụ ọrụ ụfọdụ. Ọ bụrụ na ha echebara ya echiche ma kpee ekpere maka ya, ha nwere ike ịchọpụta na ọ bụrụ na ha ekweta ịrụ ọrụ ahụ, ọ ga-eme ka ha ghara inwe ike ime ihe ndị ka mkpa dị ka ofufe ezinụlọ, iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, nakwa ịkụziri ụmụ ha otú e si ezi ozi ọma. Ha kwesịrị ịghọta na Jehova ma na ha chọrọ ịrụ ọrụ ndị ha na-arụ nke ọma. w22.03 27 ¶4, 7; 28 ¶8

Tuzdee, Jun 27

Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha agaghị egbuli mkpụrụ obi.—Mat. 10:28.

Ì chetara na o nwere mgbe ụjọ tụtụrụ gị ịbụ Onyeàmà Jehova? O nwere ike ịbụ na ị na-eche na ị gaghị ezili ndị mmadụ ozi ọma ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị na-atụ ụjọ na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị nwere ike imegide gị. Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú ọ dị onye ị na-amụrụ ihe ma ọ dị ya otú ahụ. Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị ga-atụ ụdị ụjọ a. Ma, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ikwe ka ụdị ụjọ a gbochie ha ife Jehova. (Mat. 10:16, 17, 27) Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịkwụsị ịtụ ụjọ? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ka ya? Na-enyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ na-agwa ndị ọzọ ihe o kweere. O nwere ike ịbụ na ụjọ tụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe o zipụrụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ma, Jizọs nyeere ha aka. Ọ gwara ha ebe ha ga-aga kwusaa ozi ọma na ihe ha ga-ezi. (Mat. 10:5-7) Olee otú i nwere ike isi mee ihe a Jizọs mere? Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ chọpụta ebe o nwere ike izi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ ya ma ò nwere onye ọ ma otu eziokwu ọ mụtara nwere ike ịbara uru. Nyeziere ya aka ịkwadebe ihe ọ ga-ekwu. Otú ị ga-esi eme ya bụ igosi ya ụzọ dị mfe ọ ga-esi akọwara onye ahụ eziokwu ahụ. w21.06 6 ¶15-16

Wenezdee, Jun 28

M ga-eme ka mba niile maa jijiji. Ihe ndị bara ezigbo uru nke mba niile ga-abata.—Hag. 2:7.

N’afọ 2015, o nwere otu ala ọma jijiji mere na Nepal. Otu onye nọ mgbe o mere sịrị: “N’ime nkeji ole na ole, ụlọ ahịa na ụlọ ndị mere ochie malitere ịdakasị.” Onye ọzọ sịkwara: “Ebe niile nọ na-agba ghara ghara . . . Ọtụtụ ndị sị na ala ọma jijiji ahụ were ihe dị ka nkeji abụọ. Ma n’anya m, o gburu ezigbo oge.” Taa, Jehova na-eme ka mba niile na-ama ụdị jijiji dị iche. Hagaị onye amụma kwuru gbasara ya, sị: “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘N’oge na-adịghị anya, m ka ga-eme ọzọ ka eluigwe na ụwa . . . maa jijiji.’ ” (Hag. 2:6) Ụdị ịma jijiji Hagaị kwuru gbasara ya abụghị ala ọma jijiji nke naanị ihe ọ na-akpata bụ imebisi ihe. Kama, ọ na-akpata ihe ọma. Jehova n’onwe ya gwara anyị, sị: “M ga-eme ka mba niile maa jijiji. Ihe ndị bara ezigbo uru nke mba niile ga-abata. M ga-emekwa ka ebube m jupụta n’ụlọ a.” w21.09 14 ¶1-3

Tọzdee, Jun 29

Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche.—Luk 22:28.

Ọ bụ ịna-ekwurịta okwu mgbe niile na-eme ka mmadụ na ibe ya bụrụ ezigbo enyi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a bịa n’anyị na Jehova ịbụ enyi. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ya otú obi dị anyị na ihe anyị na-eche n’echiche n’ekpere, anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi nakwa na anyị ma na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ọma 94:17-19; 1 Jọn 5:14, 15) Gị na ezigbo ndị enyi na-akpakọrịta. Ha bụ onyinye si n’aka Jehova. (Jems 1:17) Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-eme ka anyị nwee ezigbo ndị enyi “nwere ịhụnanya mgbe niile.” (Ilu 17:17) N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Kọlọsi, ọ kpọrọ aha ụfọdụ Ndị Kraịst nyeere ya aka. Ọ sịrị na ha bụ ‘ndị na-enyere ya aka, na-eme ka ọ dị ike.’ (Kọl. 4:10, 11) E nwedịrị mgbe enyemaka dị Jizọs mkpa. Obi dịkwa ya ụtọ na ndị enyi ya nyeere ya aka, ma ndị mmụọ ozi ma ndị mmadụ. (Luk 22:43) Ịkọrọ ndị enyi gị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ otú obi dị gị anaghị egosi na ị dịghị ike. O nwere ike ichebe gị. w21.04 24-25 ¶14-16

Fraịdee, Jun 30

[Ịhụnanya] na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.—1 Kọr. 13:7.

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwanna emee gị ihe wutere gị? Mee ihe niile i nwere ike ime ka gị na ya mee udo. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Rịọ ya ka ọ gọzie onye ahụ mejọrọ gị nakwa ka o nyere gị aka ịhụ àgwà ọma ndị o nwere, ya bụ, àgwà ndị ahụ mere o ji hụ onye ahụ n’anya. (Luk 6:28) Ọ bụrụ na ị gaghị enwe ike ileghara ihe ahụ nwanna gị mere gị anya, lee ma ị̀ ga-agakwuru ya ka gị na ya kwurịta ya. Ọ na-akacha mma iwere ya na nwanna ahụ ebughị n’obi imejọ gị. (Matiu 5:23, 24) Mgbe gị na ya na-ekwurịta ihe ahụ, were ya na o bu ihe ọma n’obi mee ihe o mere. Ma ọ bụrụkwanụ na ọ chọghị ka gị na ya mee udo? ‘Na-ediri ya ihe.’ Ike ya agwụkwala gị. (Kọl. 3:13) Nke kacha nke, anọgidela na-eburu ya iwe n’obi n’ihi na o nwere ike imebi adịm ná mma gị na Jehova. Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị sụọ ngọngọ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị na-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ.—Ọma 119:165. w21.06 23 ¶15

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya