Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es23 p. 88-97
  • Septemba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2023
  • Isiokwu Nta
  • Fraịdee, Septemba 1
  • Satọdee, Septemba 2
  • Sọnde, Septemba 3
  • Mọnde, Septemba 4
  • Tuzdee, Septemba 5
  • Wenezdee, Septemba 6
  • Tọzdee, Septemba 7
  • Fraịdee, Septemba 8
  • Satọdee, Septemba 9
  • Sọnde, Septemba 10
  • Mọnde, Septemba 11
  • Tuzdee, Septemba 12
  • Wenezdee, Septemba 13
  • Tọzdee, Septemba 14
  • Fraịdee, Septemba 15
  • Satọdee, Septemba 16
  • Sọnde, Septemba 17
  • Mọnde, Septemba 18
  • Tuzdee, Septemba 19
  • Wenezdee, Septemba 20
  • Tọzdee, Septemba 21
  • Fraịdee, Septemba 22
  • Satọdee, Septemba 23
  • Sọnde, Septemba 24
  • Mọnde, Septemba 25
  • Tuzdee, Septemba 26
  • Wenezdee, Septemba 27
  • Tọzdee, Septemba 28
  • Fraịdee, Septemba 29
  • Satọdee, Septemba 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2023
es23 p. 88-97

Septemba

Fraịdee, Septemba 1

Ha rịọkwara ya ka o gosi ha ihe ịrịba ama si n’eluigwe.—Mat. 16:1.

N’oge Jizọs, ihe ọ kụziri ejughị ụfọdụ ndị afọ. Ha chọkwuru ihe ndị ọzọ. Ma mgbe ọ jụrụ imere ha ihe ịrịba ama ndị ahụ ha chọrọ, ha sụrụ ngọngọ. (Mat. 16:4) Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Aịzaya buru amụma gbasara Mesaya, sị: “Ọ gaghị eti mkpu, ọ gaghị ekwu okwu n’olu dara ụda, ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.” (Aịza. 42:1, 2) Jizọs ejighị ozi o jere n’ụwa gosi onwe ya. Ọ rụghị ụlọ nsọ ndị buru ezigbo ibu. O yighị uwe e ji ama ndị isi okpukpe ma ọ bụkwanụ kwuo ka e tuo ya aha a na-etu ndị isi okpukpe. Mgbe a na-ekpe ya ikpe, ọ jụrụ ịrụ ọrụ ebube iji mee Herọd obi ụtọ n’agbanyeghị na e nwere ike iji maka ya gbuo ya. (Luk 23:8-11) Jizọs rụrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ma, ihe bụ́ mkpa ya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụ n’ihi nzube a ka m ji bịa.”—Mak 1:38. w21.05 4 ¶9-10

Satọdee, Septemba 2

Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.—Jọn 17:3.

Anyị na-achọ ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị kwesịrị inyere ha aka (1) ịghọta, (2) ikweta, na (3) ime ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl. (Kọl. 2:6, 7; 1 Tesa. 2:13) Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike inyere ndị a na-amụrụ Baịbụl aka ma ha na-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya, na-anabatakwa ha nke ọma ma ha bịa ọmụmụ ihe. (Jọn 13:35) O nwekwara ike ịdị mkpa ka onye na-amụrụ mmadụ ihe jiri nnukwu oge ma gbaa ezigbo mbọ inyere onye ọ na-amụrụ ihe aka ịgbanwe àgwà ma ọ bụ nkwenkwe ndị “gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.” (2 Kọr. 10:4, 5) O nwere ike iwe ọtụtụ ọnwa inyere onye a na-amụrụ ihe aka ime ihe ndị a ga-eme ka o mechaa ruo eruo ime baptizim. Ma, mgbalị ahụ anyị mere iji nyere ya aka efughị ọhịa. w21.07 3 ¶6

Sọnde, Septemba 3

Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile; jidesienụ ihe dị mma aka ike.—1 Tesa. 5:21.

Obi ò siri anyị ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu nakwa na ọ bụ naanị otú ha si efe Jehova bụ otú ọ chọrọ? Obi siri Pọl onyeozi ike na ihe o kweere bụ eziokwu. (1 Tesa. 1:5) Ihe mere o ji kwere n’ihe ndị ahụ abụghị naanị ka obi dị ya ụtọ, kama, ọ mụrụ okwu Chineke nke ọma, kwetakwa na “ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Tim. 3:16) Gịnị ka okwu Chineke ọ mụrụ kụziiri ya? Ọ hụrụ ihe mere ka obi sie ya ike na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa, bụ́kwanụ ihe ndị ndú okpukpe ndị Juu na-ekwetaghị na ya. Ndị ihu abụọ ahụ kwuru na ha na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Chineke. Ma, ha na-eme ihe ndị Chineke kpọrọ asị. (Taị. 1:16) Pọl emeghị ka ha. Ọ họrọghị ihe ndị nke ọ ga-ekwere n’Okwu Chineke na ndị nke ọ na-agaghị ekwere. Ọ dị njikere ịna-akụziri ndị mmadụ “ihe niile Chineke zubere ime.”—Ọrụ 20:27. w21.10 18 ¶1-2

Mọnde, Septemba 4

Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.—Jọn 6:44.

Ka anyị na-akụ mkpụrụ ma na-agba ya mmiri, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Chineke na-eme ka o too. (1 Kọr. 3:6, 7) Jehova ji mmadụ niile kpọrọ ihe. O meere anyị ihe ọma kwe ka anyị na Ọkpara ya na-arụkọ ọrụ ime ka ndị si ná mba niile bata n’ọgbakọ ya tupu ọgwụgwụ abịa. (Hag. 2:7) E nwere ike iji ọrụ ikwusa ozi ọma anyị tụnyere ndị na-azọ ndị mmadụ ndụ. Anyị dịkwa ka ndị gara ịzọpụta ndị ájá zegidere n’ebe ha na-egwu ihe. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ mmadụ ole na ole n’ime ha ka a ga-azọpụta. Ma, ọrụ ndị niile gara ọrụ ahụ rụrụ bara uru. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọrụ ikwusa ozi ọma anyị taa. Anyị amaghị mmadụ ole a ga-emecha zọpụta n’ụwa Ekwensu a. Mana, Jehova nwere ike iji onye ọ bụla n’ime anyị nyere ha aka. Otu nwanna bi na Bolivia aha ya bụ Andreas sịrị: “Ama m na ihe na-eme ka mmadụ mụta eziokwu bịa mee baptizim bụ na ụmụnna gbakọrọ aka nyere ya aka.” Ka anyị ghara ịda mbà n’ozi anyị. Ọ bụrụ na anyị adaghị mbà, Jehova ga-agọzi anyị, anyị ga na-enwekwa obi ụtọ n’ozi anyị. w21.05 19 ¶19-20

Tuzdee, Septemba 5

Si n’ọnyà Ekwensu pụta.—2 Tim. 2:26.

Ihe na-abụ mkpa dinta bụ ijide ma ọ bụ igbute anụ. O nwere ike iji ọnyà dị iche iche mee nke a otú ahụ otu n’ime ndị enyi ụgha Job bịara ịkasi ya obi kwuru. (Job 18:8-10) Olee otú dinta si arata anụ ka ọ ma n’ọnyà ya? Ọ na-amụ gbasara anụmanụ ahụ. Olee ebe anụ ahụ na-agakarị? Olee ihe na-amasị ya? Olee ihe ga-ejide ya na mberede? Setan yiri dinta ahụ. Ọ na-amụ gbasara anyị. Ọ na-achọpụta ebe anyị na-aga nakwa ihe na-amasị anyị. Ọ na-esiziri anyị ọnyà o chere ga-ama anyị na mberede. Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị ama n’ọnyà ya, anyị nwere ike isi na ya pụta. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi ghara ịma n’ọnyà ya chaa chaa. Ihe abụọ Setan kacha eji esiri ndị mmadụ ọnyà bụ mpako na anyaukwu. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, Setan ejirila àgwà ọjọọ ndị a nwata ndị mmadụ. Setan dị ka onye na-achụ nta nnụnụ na-arata nnụnụ ịma n’ọnyà ya ma ọ bụkwanụ ịbata n’ụgbụ ya. (Ọma 91:3) Ma, anyị ekwesịghị ịma n’ọnyà Setan. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova emeela ka anyị mara ọnyà dị iche iche Setan na-esiri ndị mmadụ.—2 Kọr. 2:11. w21.06 14 ¶1-2

Wenezdee, Septemba 6

Isi awọ́ bụ okpueze mara mma ma ọ bụrụ na onye nwere ya na-ebi ndụ dị mma.—Ilu 16:31.

Ụmụnna anyị ndị mere agadi dị ezigbo oké ọnụ ahịa. Okwu Chineke ji isi awọ́ tụnyere okpueze. (Ilu 20:29) Ma, anyị nwere ike ileghara ụmụnna ndị a bara ezigbo uru anya. Ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ ji ụmụnna ndị agadi kpọrọ ihe na-erite ezigbo uru n’aka ha. Ndị agadi na-efe Jehova dị ezigbo oké ọnụ ahịa n’anya ya. Ọ ma ụdị ndị ha bụ, jirikwa àgwà ọma ndị ha nwere kpọrọ ihe. Àgwà ọma ndị ha nwere na-amasịkwa ya. Obi na-adị Jehova ụtọ ma ndị agadi na-akụziri ndị na-eto eto ihe ndị ha mụtara kemgbe ọtụtụ afọ ha na-ejere ya ozi. (Job 12:12; Ilu 1:1-4) Jehova jikwa ntachi obi ha kpọrọ ihe. (Mal. 3:16) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ nsogbu bịaara ha, ma ha akwụsịghị inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ha nwere ezigbo olileanya ugbu a karịa mgbe ha mụtara eziokwu ọhụrụ. Jehova hụkwara ha n’anya n’ihi na ha nọgidere na-ekwusa aha ya ruo ‘n’agadi.’—Ọma 92:12-15. w21.09 2 ¶2-3

Tọzdee, Septemba 7

Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya, ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme.—Gal. 6:4.

O kwesịrị anyị nọtụ, anyị echebara ihe anyị bu n’obi na-eme ihe ụfọdụ echiche. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Obi ọ̀ na-adị m mma naanị ma m chee na m ka ndị ọzọ mma? Ihe mere m ji agbasi mbọ ike n’ofufe Jehova ọ̀ bụ ka m ka mmadụ niile nọ n’ọgbakọ mma ma ọ bụkwanụ, ma e nweghị ihe ọzọ, ka e nwee nwanna m ka mma? Ka ihe m bu n’obi ọ̀ bụ naanị ime ike m niile n’ofufe Jehova?’ Baịbụl gwara anyị ka anyị zere iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị echee na anyị ka nwanna anyị mma, o nwere ike ime ka anyị dịwa mpako. Ọ bụrụkwa na anyị echee na nwanna anyị ka anyị mma, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. (Rom 12:3) Anyị kwesịrị icheta na ihe mere Jehova ji dọta anyị n’ebe ọ nọ abụghị na anyị mara mma, na anyị na-ekwu okwu nke ọma, ma ọ bụkwanụ na a ma anyị ama, kama, ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa ige Ọkpara ya ntị.—Jọn 6:44; 1 Kọr. 1:26-31. w21.07 14-15 ¶3-4

Fraịdee, Septemba 8

Unu kwesịkwara ịna-eme ka otú unu si eche echiche dị ọhụrụ.—Efe. 4:23.

Ihe ga-enyere anyị aka ime ka otú anyị si eche echiche dị ọhụrụ bụ ikpe ekpere, ịmụ Okwu Chineke, na ịtụgharị uche. Na-eme ihe ndị a, na-arịọkwa Jehova ka o nye gị ike. Mmụọ nsọ ya ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-eji onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Jehova ga-enyekwara gị aka ịchọpụta ma ị̀ na-emere ndị ọzọ anyaụfụ ma ọ bụ dị mpako, nyekwara gị aka ịgbanwe. (2 Ihe 6:29, 30) Jehova ma obi anyị. Ọ makwa na anyị na-alụso mmụọ nke ụwa na ezughị okè anyị ọgụ. Ka Jehova na-ahụ ka anyị na-alụso ihe ndị a ọgụ, ka ọ na-ahụkwu anyị n’anya. Jehova ji otú nne si hụ nwa ọhụrụ ya n’anya tụnyere otú o si hụ anyị n’anya. (Aịza. 49:15) Obi dị anyị ụtọ ịmata na ọ bụ otú ahụ ka Jehova si ahụ anyị n’anya ma ọ na-ahụ ka anyị na-agba mbọ ime ike anyị niile n’ofufe ya. w21.07 24-25 ¶17-19

Satọdee, Septemba 9

Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.—Rom 12:15.

Anyị nwere ike inwekwu ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị ana-arụsi ọrụ ike n’ọrụ ọ bụla e nyere anyị n’ọgbakọ Jehova. Jiri ‘oge gị niile’ na-ekwusa ozi ọma, na-arụsikwa ọrụ ike n’ọgbakọ. (Ọrụ 18:5; Hib. 10:24, 25) Kwadebe nke ọma tupu gị agawa ọmụmụ ihe ka i nwee ike ịza ajụjụ ga-agba ụmụnna ume. E nye gị ihe omume nwa akwụkwọ, jiri ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na a gwa gị ka i nye aka rụọ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ, bịa n’oge, gbaakwa mbọ hụ na ị rụrụ ya. Elekwala ọrụ ọ bụla e nyere gị anya ka ihe ị na-ekwesịghị iwepụtara oge rụọ. Na-agbalị ịmụtakwu ọrụ ị na-arụ nke ọma. (Ilu 22:29) Ọ bụrụ na ị na-agbalị na-arụsi ọrụ ọ bụla e nyere gị n’ọgbakọ ike, ọ ga-eme ka i nwee ọganihu ma nwee ezigbo ọṅụ. (Gal. 6:4) Ọ ga-adịkwara gị mfe inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na e nye ndị ọzọ ọrụ ị gaara achọ ịrụ.—Gal. 5:26. w21.08 22 ¶11

Sọnde, Septemba 10

Amamihe nke si n’eluigwe na-ebu ụzọ eme ka obi mmadụ dị ọcha. Ọ na-emekwa ka onye ahụ na-eme udo, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, na-eji obi ya niile erube isi, na-emetere ndị ọzọ ebere, na-eme ihe dị mma, ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu, gharakwa ịdị ihu abụọ.—Jems 3:17.

Anyị kwesịrị izere mpako, ma kwe ka Jehova na-akụziri anyị ihe. Otú ahụ ọrịa nwere ike ime ka obi mmadụ ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, ka mpako nwere ike ime ka anyị ghara ikwe ka Jehova na-eduzi anyị. Ndị Farisii dị ezigbo mpako, ya emee ka ha ghara ikweta n’ihe doro anya gosiri na mmụọ nsọ na-eduzi Jizọs nakwa na ọ bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 12:37-40) Mpako ahụ kpataara ha ezigbo nsogbu n’ihi na o mere ka ndụ ebighị ebi kwaa ha. (Mat. 23:13, 33) N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị kwe ka Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya na-eme ka àgwà anyị na-akakwu mma, na-eduzikwa ihe ndị anyị na-eche na ihe ndị anyị na-ekpebi. Jems kwere ka Jehova kụziere ya ihe n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Ọ bụkwa maka na ọ dị umeala n’obi mere o ji bụrụ ezigbo onye nkụzi. w22.01 10 ¶7

Mọnde, Septemba 11

Na-arịọnụ.—Mat. 7:7.

Ọ bụrụ na anyị ‘na-ekpe ekpere mgbe niile,’ obi ga-esi anyị ike na Nna anyị nke eluigwe ga-anụ ekpere anyị. (Kọl. 4:2) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka Jehova ọ̀ na-egbu oge ịza ekpere anyị, ma ọ na-ekwe anyị nkwa na ọ ga-aza ya “mgbe oge ruru.” (Hib. 4:16) Ọ bụ ya mere na anyị ekwesịghị ịta Jehova ụta ma ọ bụrụ na ihe emeghị mgbe anyị tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị ekpeela ekpere ọtụtụ afọ ka ha hụ mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Jizọs gwadịrị anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. (Mat. 6:10) Ma, ọ ganụghị adị mma ma ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka okwukwe o nwere na Chineke jụọ oyi n’ihi na ọgwụgwụ abịaghị mgbe ndị mmadụ tụrụ anya na ọ ga-abịa. (Hab. 2:3; Mat. 24:44) Anyị na-egosi na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-echere Jehova ma jiri okwukwe na-ekpe ekpere. Ọgwụgwụ ga-abịa kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị n’ihi na Jehova ewepụtala “ụbọchị na awa” ọ ga-abịa. Oge ahụ ga-akara mmadụ niile mma.—Mat. 24:36; 2 Pita 3:15. w21.08 10 ¶10-11

Tuzdee, Septemba 12

Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.—Fil. 2:3.

Ndị agadi dị umeala n’obi ghọtara na ka ha na-eme agadi, ka ike ha na-agbada. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ndị nlekọta sekit. Ọ bụrụ na ha eruo afọ iri asaa, a na-agbanwere ha ọrụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isitụrụ ha ike, ma obi na-adị ha ụtọ na ha na-ejere ụmụnna ha ozi. Ha ghọtakwara na ọ kacha mma ka ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ rụwazie ọrụ ha na-arụbu. N’ihi ya, ha na-eme ihe yiri ihe ndị Livaị mere n’Izrel oge ochie. Ọ na-abụ onye Livaị ruo afọ iri ise, ya akwụsị ije ozi n’ụlọikwuu. Ihe na-eme ka ndị Livaị ahụ na-enwe obi ụtọ abụghị ụdị ozi ha na-ejere Jehova. Ha ji obi ha niile rụọ ọrụ ha, meekwa ike ha niile inyere ndị na-akatabeghị ahụ́ aka. (Ọnụ Ọgụ. 8:25, 26) Taa, ọ bụ eziokwu na ndị bụbu ndị nlekọta sekit anaghịzi aga eleta ọgbakọ dị iche iche, ma ha na-enwe obi ụtọ iso ọgbakọ ha na-eje ozi. w21.09 8-9 ¶3-4

Wenezdee, Septemba 13

Nna m, emehiela m Chineke bi n’eluigwe, mehiekwa gị. Erukwaghị m eru ka a kpọọ m nwa gị.—Luk 15:21.

E nwere ihe atụ Jizọs mere na Luk 15:11-32 gbasara nwa mmefu. Otu nwa okorobịa nupụụrụ nna ya isi kwapụ n’ụlọ, kwaga “obodo dị anya.” N’ebe ahụ, ọ nọ na-ebi ndụ rụrụ arụ. Mgbe ihe bịara siere ya ike, o chebaara onwe ya ezigbo echiche. Ọ ghọtara na ihe kaara ya mma mgbe ọ nọ n’ụlọ nna ya. Jizọs kwuru na “anya doro” nwa okorobịa ahụ. O kpebiri ịlaghachi n’ụlọ rịọ nna ya ka ọ gbaghara ya. Ọ dị ezigbo mkpa na nwa okorobịa ahụ ghọtara na o mere ihe na-adịghị mma. O kwesịrị ịgbanwe. Nwa mmefu ahụ mere ihe gosiri na o ji obi ya niile chegharịa. A kọghị akụkọ a ka ọ bụrụ naanị ihe atụ a na-eru n’obi. Ndị okenye ọgbakọ ga-esi na ya mụta ezigbo ihe mgbe ha na-agbalị ịchọpụta ma nwanna mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala n’eziokwu. w21.10 5 ¶14-15

Tọzdee, Septemba 14

M . . . ga-eme . . . ka eluigwe na ụwa . . . maa jijiji.—Hag. 2:6.

Olee ihe na-agaghị ama jijiji ma ọ bụ ihe a na-agaghị ewepụ? Pọl onyeozi dere, sị: “Ebe ọ bụ na anyị ga-eketa Alaeze a na-enweghị ike ime ka ọ maa jijiji, ka anyị . . . jiri egwu Chineke na-ejere ya ozi dị nsọ.” (Hib. 12:28) Mgbe ịma jijiji a ga-akwụsị, naanị Alaeze Chineke ga-adị. (Ọma 110:5, 6; Dan. 2:44) Oge adịghịzi. Ndị mmadụ ga-ahọrọ ma hà ga-anọgide na-akwado ụwa a nke ga-eme ka e bibie ha, ka hà ga-agbasi mbọ ike na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ nke ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. (Hib. 12:25) Ozi ọma anyị na-ekwusa ga-enyere ndị mmadụ aka ikpebi ebe ha kwụ n’okwu a dị ezigbo mkpa. Ka anyị burukwa n’obi ihe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst kwuru. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Mat. 24:14. w21.09 19 ¶19-20

Fraịdee, Septemba 15

E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.—Hib. 13:5.

Ndị okenye, ọ bụ ọrụ pụrụ iche dịịrị unu ịgụgụ ndị a chụrụ onye ha n’ọgbakọ. (1 Tesa. 5:14) Na-agba ha ume tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa mgbe a gbasara. Na-aga n’ụlọ ha, unu na ha kpeekwa ekpere ma unu gaa. Unu na ha na-arụ n’ozi ọma ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ, unu akpọọ ha ka ha bịa n’ụlọ unu soro unu nwee ofufe ezinụlọ. Ndị okenye kwesịrị ịna-emere atụrụ Jehova ihe na-ewute ebere, hụkwa ha n’anya. (1 Tesa. 2:7, 8) “O nweghị onye [Jehova] chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) N’agbanyeghị na mmadụ nwere ike ime mmehie dị oké njọ, Chineke achọghị ka ọ nwụọ. Chegodị gbasara nnukwu ihe o furu Jehova, ya bụ, àjà o ji Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya chụọ maka onye nke ọ bụla n’ime anyị. N’ihi otú Jehova si hụ ndị hapụrụ ya n’anya, ọ chọrọ ka ha lọghachikwute ya. Ọ chọrọ ka ha mee ihe ahụ nwa mmefu mere n’ihe atụ Jizọs.—Luk 15:11-32. w21.09 30-31 ¶17-19

Satọdee, Septemba 16

Unu abatala riwe uru ọrụ ha rụrụ.—Jọn 4:38.

Ọ bụrụkwanụ na i nweghị ike ikwusa ozi ọma otú ị na-emebu n’ihi ọrịa? Ị ka nwekwara ike ịna-enwe ọṅụ na ị na-eme ike gị n’ikwusa ozi ọma. Legodị ihe mere mgbe Eze Devid na ndị agha ya gara napụta ndị ezinụlọ ha na ngwongwo ha ndị agha Amalek kwakọọrọ. Ike gwụrụ narị mmadụ abụọ n’ime ha, ha anọrọzie na-eche ibu ha nche. Mgbe Devid na ndị agha ya gachara agha ahụ merie ma lọta, o kwuru ka e kenye onye ọ bụla n’ime ha òkè há nhata n’ihe nkwata ha napụtara ha. (1 Sam. 30:21-25) Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ n’ụwa niile, onye ọ bụla mere ike ya niile na-enwe ọṅụ mgbe e nyeere otu onye ọhụrụ aka ije ije n’ụzọ na-eduba ná ndụ. Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba n’ozi ya, na-ahụkwa na o si anyị n’obi. Ọ ga-akwụkwa anyị ụgwọ maka ya. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-enwe ọṅụ n’ihe ọ bụla anyị nwere ike ime n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ. (Jọn 14:12) Obi kwesịrị isi anyị ike na ozi anyị na-ejere Jehova na-amasị ya ọ bụrụhaala na anyị adaghị mbà. w21.10 28 ¶15-17

Sọnde, Septemba 17

Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha.—Ilu 20:29.

Anyị katawa ahụ́, ụjọ nwere ike ịbịa anyị na anyị agaghịzi abara Jehova uru otú anyị bara n’oge gara aga. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike anyị esighịzi ike otú anyị siri na mbụ, anyị nwere ike iji amamihe anyị nwere nyere ndị na-eto eto aka ka ha jiri ike ha niile jeere Jehova ozi ma wepụtakwuo onwe ha ịrụ ọrụ ndị ọzọ. Ndị agadi kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ha chọrọ inyere ndị na-eto eto aka. Onye dị umeala n’obi na-ewere ndị ọzọ ka ndị ka ya. (Fil. 2:3, 4) Ndị agadi dị umeala n’obi na-echeta na e nwere ụzọ dị iche iche Akwụkwọ Nsọ kwadoro e nwere ike isi mee ihe n’ọgbakọ. N’ihi ya, ha anaghị atụ anya ka a na-eme ihe otú e sibu na-eme ya n’oge gara aga. (Ekli. 7:10) Ọ bụ eziokwu na ha nwere ihe ndị ha ga-akụziri ndị na-eto eto, ma, ha kwesịrị icheta na “ihe ndị na-eme n’ụwa a na-agbanwe agbanwe” nakwa na ha kwesịrị ịmụta otú e si eme ihe ugbu a.—1 Kọr. 7:31. w21.09 8 ¶1, 3

Mọnde, Septemba 18

Jehova, ònye n’ime chi niile dị ka gị? Ònye dị ka gị, gị onye na-egosi na ị dị ezigbo nsọ?—Ọpụ. 15:11.

Jehova emekataghị gwa ndị na-efe ya ka ha mee ihe ga-eme ka ha ghara ịdị ọcha. Ọ dị ezigbo nsọ. Ihe e dere n’ihe mbadamba e ji ọlaedo rụọ na-adị n’ákwà isi nnukwu onye nchụàjà na-echetara ụmụ Izrel ihe a. Ihe e dere na ya bụ: “Jehova bụ Onye dị nsọ.” (Ọpụ. 28:36-38) Ihe e dere n’ihe mbadamba ahụ e ji ọlaedo rụọ ga-eme ka onye ọ bụla hụrụ ya mara na Jehova dị nsọ n’eziokwu. Ọ bụrụkwanụ na onye Izrel ahụghị ya n’ihi na o nweghị ike iru nnukwu onye nchụàjà nso? Ọ̀ ga-ama na Jehova dị nsọ? Ee, ọ ga-ama. Ndị Izrel niile, ma ụmụ nwoke, ma ụmụ nwaanyị, ma ụmụaka, nụrụ mgbe a gụpụtaara ha iwu Chineke. (Diut. 31:9-12) Ọ bụrụ na ị nọ ebe ahụ, ị gaara anụ mgbe a gụpụtara ihe ndị a: “Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, unu [ga-adị] nsọ n’ihi na adị m nsọ.” “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ, n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova dị nsọ.”—Lev. 11:44, 45; 20:7, 26. w21.12 3 ¶6-7

Tuzdee, Septemba 19

Kwụsịkwanụ iche oké echiche.—Luk 12:29.

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-echegbu onwe ha maka ihe ndị dị ha mkpa. O nwere ike ịbụ na obodo ha dara ogbenye, ya ana-esikwa ike inweta ọrụ ebe ahụ. O nwere ike isiri ha ike inweta ego ga-ezuru ha iji gboo mkpa ezinụlọ ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye na-akpa afọ ezinụlọ ha anwụọla, ya emezie ka ha ghara inwe ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha. Kama ịna-echegbu onwe anyị maka nsogbu anyị, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Cheta na Nna anyị bụ́ Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị ma ọ bụrụ na anyị ebute ofufe ya ụzọ ná ndụ anyị. (Mat. 6:32, 33) Ọ na-emezu nkwa ya kemgbe ụwa. (Diut. 8:4, 15, 16; Ọma 37:25) Ebe ọ bụ na Jehova na-egboro nnụnụ na okooko osisi mkpa ha, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eri ma ọ bụ ihe anyị ga-eyi. (Mat. 6:26-30; Fil. 4:6, 7) Otú ahụ nne na nna na-egboro ụmụ ha mkpa ha n’ihi na ha hụrụ ha n’anya, ka Jehova na-egbokwara ndị na-efe ya mkpa ha n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. w21.12 16-17 ¶4-5; 18 ¶8

Wenezdee, Septemba 20

Jehova ka nọnyeere Josef, ọ hụkwara ya n’anya.—Jen. 39:21.

È metụla gị ihe ọjọọ wutere gị nke ukwuu? O nwedịrị ike ịbụ nwanna mere gị ya. Chegọdị gbasara Josef. Ụmụnne ya mere ya ihe ọjọọ. Josef lekwasịrị anya n’ozi ọ na-ejere Jehova. Jehova mechakwara gọzie ya n’ihi ndidi ya. Ka oge na-aga, Josef leghaara ihe ọjọọ ndị ahụ e mere ya n’oge gara aga anya, hụkwa otú Jehova si gọzie ya. (Jen. 45:5) Dịkwa ka Josef, obi na-eru anyị ala ma ọ bụrụ na anyị abịaruo Jehova nso ma hapụ ya ka o jiri aka ya dozie okwu n’oge ya. (Ọma 7:17; 73:28) Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ n’ihi ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ ihe ọjọọ ọzọ, cheta na Jehova na-anọ “ndị obi gbawara nso.” (Ọma 34:18) Ọ hụrụ gị n’anya n’ihi na ị na-enwe ndidi, na-ebunyekwa ya ibu niile na-anyịgbu gị. (Ọma 55:22) Ọ bụ ya bụ Onyeikpe nke ụwa niile. Ọ na-ahụ ihe niile na-emenụ. (1 Pita 3:12) Ọ bụrụ na nsogbu ị na-agaghị emeli ihe ọ bụla gbasara ya abịara gị, ị̀ dị njikere ichere Jehova? w21.08 11 ¶14; 12 ¶16

Tọzdee, Septemba 21

Gbalịanụ na-aghọta ihe Jehova chọrọ ka unu na-eme.—Efe. 5:17.

Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị ga-eme Jehova obi ụtọ, ọ ga-egosi na anyị ma ihe. Anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ndị kacha mkpa ná ndụ. Mgbe ụfọdụ, iji oge anyị na-eme ihe kacha mkpa na-apụta na anyị ga-ahọrọ nke anyị ga-eme n’ihe abụọ na-adịghị njọ. Akụkọ Baịbụl gbasara oge Jizọs gara n’ụlọ Meri na Mata mere ka nke a doo anya. O doro anya na obi tọrọ Mata ụtọ ịnabata Jizọs n’ụlọ ha, nke mere ka ọ gaa na-esi ọtụtụ ihe. Ma, nwanne ya nwaanyị bụ́ Meri gara nọrọ Jizọs nso, na-ege ya ntị mgbe ọ na-akụzi ihe. Ọ bụ eziokwu na ihe Mata mere adịghị njọ, mana, Meri “họọrọ ihe ka mma.” (Luk 10:38-42) Ka oge na-aga, o nwere ike ịbụ na Meri chefuru ụdị nri e siri n’oge ahụ. Ma, anyị ma na o chefughị ihe ọ mụtara n’aka Jizọs. Otú ahụ Meri si jiri obere oge ya na Jizọs ji nọrịa kpọrọ ihe, ka anyị na-eji oge anyị na Jehova ji anọrị akpọrọ ihe. w22.01 27 ¶5-6

Fraịdee, Septemba 22

Ọ̀ kwa ị hụrụ otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihi m?—1 Eze 21:29.

Ọ bụ eziokwu na Ehab weturu onwe ya ala mgbe Jehova kwuru ihe ọ ga-eme ezinụlọ ya, ihe o mechara mee gosiri na o chegharịghị n’eziokwu. Ọ gbalịghị ịkwụsị ofufe Bel n’Izrel. Ọ gbakwanụghị ndị mmadụ ume ka ha fewe Jehova. Mgbe Ehab nwụrụ, Jehova kwuru otú o si were Ehab. Jihu onye amụma Chineke kpọrọ Ehab ‘onye ajọ omume.’ (2 Ihe 19:1, 2) Chegodị ihe a, a sị na Ehab chegharịrị n’eziokwu, o doro anya na onye amụma ahụ agaraghị akpọ ya onye ajọ omume kpọrọ Jehova asị. Ọ bụ eziokwu na ihe Ehab mere wutere ya, mana o jighị obi ya niile chegharịa. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ehab mere? Mgbe ọ nụrụ ihe Ịlaịja onye amụma buru n’amụma gbasara ya na ezinụlọ ya, o bu ụzọ wetuo onwe ya ala. Ihe ahụ o mere dị mma. Ma, ihe ndị mechara mee gosiri na o jighị obi ya niile chegharịa. N’ihi ya, ihe onye ji obi ya chegharịa kwesịrị ime abụghị naanị ikwu na ihe o mere wutere ya. w21.10 3 ¶4-5, 7-8

Satọdee, Septemba 23

A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke.—Mat. 24:14.

Aịzaya bụ onye amụma. O nwekwara ike ịbụ na e nwere mgbe nwunye ya buru amụma n’ihi na a kpọrọ ya “onye amụma nwaanyị.” (Aịza. 8:1-4) Aịzaya na nwunye ya ji ife Jehova kpọrọ ihe ná ndụ ha. Taa, ndị di na nwunye nwekwara ike ime ka Aịzaya na nwunye ya ma ọ bụrụ na ha ana-eme ike ha niile n’ozi Jehova. Ha nwere ike ịtụkwasịkwu Jehova obi ma ọ bụrụ na ha amụọ gbasara amụma ndị dị na Baịbụl ma chọpụta otú ha si mezuo. (Taị. 1:2) Ha nwekwara ike iche otú ha si soro na-emezu ụfọdụ amụma ndị Baịbụl buru. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike iso na-emezu amụma Jizọs buru gbasara ozi ọma a ga-ekwusa n’ụwa niile tupu ọgwụgwụ abịa. Ọ bụrụ na di na nwunye ejide n’aka na amụma Baịbụl na-emezu, ọ ga-eme ka ha kpebisikwuo ike ịna-eme ike ha niile n’ozi Jehova. w21.11 16 ¶9-10

Sọnde, Septemba 24

Ọ gwakwara onye ahụ na-eso ụzọ ya, sị: “Lee nne gị!—Jọn 19:27.

Jizọs nọ na-eche gbasara nne ya, onye o nwere ike ịbụ na o nweghịzi di. Ebe Jizọs na-eche gbasara nne ya, ọ gwara Jọn ka ọ na-elekọta ya n’ihi na ọ ma na ọ ga-enyere ya ka ịnọgide na-efe Jehova. Malite ụbọchị ahụ gawa, Jọn weere Meri ka nne ya, na-elekọtakwa ya otú ọ ga-esi elekọta nne nke ya. Ihe a Jizọs mere gosiri na ọ hụrụ nne ya n’anya n’ihi na ọ bụ ya lekọtara ya mgbe a mụrụ ya, nọnyekwara ya mgbe ọ na-anwụ. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ Jizọs kwuru? Anyị na ụmụnna anyị nwere ike ịdị ná mma karịa ndị ezinụlọ anyị. Ndị ezinụlọ anyị nwere ike imegide anyị ma ọ bụdị gbahapụ anyị. Ma, Jizọs kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova na ọgbakọ ya nso, anyị ga-enweta ihe ndị funahụrụ anyị “okpukpu otu narị.” Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ga-abụrụ anyị ụmụ ndị nwoke, ụmụ ndị nwaanyị, nne ma ọ bụ nna hụrụ anyị n’anya. (Mak 10:29, 30) Olee otú obi na-adị gị na i so n’ezinụlọ dị n’otu n’ihi na ha nwere okwukwe ma hụ ibe ha na Jehova n’anya?—Kọl. 3:14; 1 Pita 2:17. w21.04 9-11 ¶7-8

Mọnde, Septemba 25

Unu echefukwala ịna-eme ihe ọma na ịna-enye ndị ọzọ ihe.—Hib. 13:16.

Ịhụnanya pụrụ iche na-eme ka anyị gbaa ezigbo mbọ iji nyere ndị ọzọ aka. Dị ka ọ dị n’oge gara aga, ọtụtụ ụmụnna anyị taa egosila ụmụnna ha ịhụnanya pụrụ iche, ma ndị ha na-ahụtụbeghị. Dị ka ihe atụ, ọdachi ndị na-emere onwe ha mee, ha na-agba mbọ nyere ụmụnna ha aka ozugbo. Ọ bụrụ na nsogbu abịara nwanna, ụmụnna na-agba ezigbo mbọ nyere ya aka. Ha na-eme ike ha niile iji nyere ụmụnna ha aka otú ahụ ụmụnna ndị nọ n’oge ndịozi mere na Masedonia. Ha na-ahapụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa, na-enyedị ihe “karịa otú ike ha hà,” iji nyere ndị nsogbu bịaara aka. (2 Kọr. 8:3) Taa, ndị okenye na-ajakwa ụmụnna nọ n’ọgbakọ mma ma ha hụ na ha na-enyere ndị ọzọ aka. Ụdị ịja mma a ga-eme ka ike ghara ịgwụ ụmụnna ndị a ịnọgide na-enyere ibe ha aka.—Aịza. 32:1, 2. w21.11 11 ¶14; 12 ¶21

Tuzdee, Septemba 26

Tọọ ntị n’ala nụrụ, geekwa ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu.—Ilu 22:17.

E nweghị onye n’ime anyị ndụmọdụ na-adịghị mkpa. Mgbe ụfọdụ, anyị na-agakwuru onye anyị tụkwasịrị obi ka o nye anyị ndụmọdụ. Nwanna na-eche banyere anyị nwekwara ike ịgwa anyị na anyị na-achọ ‘ịzọhie ụkwụ,’ ya bụ, ime ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. (Gal. 6:1) E nwekwara ike ịdụ anyị ọdụ mgbe anyị mejọrọ ihe. N’agbanyeghị otú e si nye anyị ndụmọdụ, anyị kwesịrị ige ntị na ya, n’ihi na ige ntị na ndụmọdụ na-abara anyị uru. Ọ ga-emekwa ka anyị dị ndụ. (Ilu 6:23) Amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si gbara anyị ume ka anyị ‘gee ntị n’ihe onye ma ihe na-ekwu.’ E nweghị mmadụ ma ihe niile. A ga-enwerịrị onye ka anyị mara ihe ụfọdụ. (Ilu 12:15) N’ihi ya, ige ntị na ndụmọdụ a na-enye anyị na-egosi na anyị dị umeala n’obi. Ọ na-egosi na anyị ma ebe ike anyị ruru, marakwa na e kwesịrị inyere anyị aka ka anyị nwee ike ime ihe ndị anyị chọrọ ime. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “A na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”—Ilu 15:22. w22.02 8 ¶1-2

Wenezdee, Septemba 27

Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya, ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.—Ilu 28:13.

Ihe na-egosi na mmadụ echegharịala abụghị naanị onye ahụ ikwu na ihe o mere wutere ya, o kwesịrị ịgbanwe otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà. Ọ ga-akwụsị àgwà ọjọọ ya ma na-eme ihe Jehova chọrọ. (Ezik. 33:14-16) Ihe kwesịrị ịbụ mkpa onye ahụ mere mmehie bụ ime ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na ezigbo enyi anyị mere mmehie dị oké njọ? Anyị na-eme enyi anyị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị ekpuchie mmehie ahụ. Anyị agakwanụghị ekpuchili ya n’ihi na Jehova na-ahụ ya. (Ilu 5:21, 22) Otú ị ga-esi enyere enyi gị aka bụ ịgwa ya ka ọ gakwuru ndị okenye ka ha nyere ya aka. Ọ bụrụ na ọ jụ ịgwa ndị okenye, gịnwa kwesịrị ịga gwa ha ya. I mee otú ahụ, o gosiri na ị chọrọ inyere ya aka. w21.10 7 ¶19-21

Tọzdee, Septemba 28

Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.—Fil. 2:4.

Anyị niile nwere ike ịmụta otú Kraịst si nyere ndị ọzọ aka. Baịbụl kwuru na ọ “dịrị ka ohu.” (Fil. 2:7) Ezigbo ohu na-achọ ihe ọ ga-eme ka obi dị nna ya ukwu mma. Ebe anyị bụ ohu Jehova na ohu ụmụnna anyị, o doro anya na anyị ga-achọ ịna-abakwuru ma Jehova ma ụmụnna anyị uru. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-adị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ nyere ndị ọzọ aka? E kwuo na a chọrọ ndị ga-aga mee ka ụlọ mgbakọ dị ọcha ma ọ bụkwanụ rụzie ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, m̀ na-ewepụta onwe m ozugbo?’ Ka e were ya na ị chọpụtara na e nwere ebe ị na-anaghị eme nke ọma, ya abụrụkwa na ọ naghị agụ gị agụụ ịna-eme nke ọma n’ebe ndị ahụ. Jiri obi gị niile kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Gwa ya otú obi dị gị. Gwa ya ka o mee ‘ka i nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa gị ike i ji eme ya.’—Fil. 2:13. w22.02 22-23 ¶9-11

Fraịdee, Septemba 29

M ga-emekwa ka unu nweta ume.—Mat. 11:28.

Otú Jizọs si gosi na ọ dị obiọma bụ na ọ na-adị nwayọọ ma na-echebara ndị ọzọ echiche, ma mgbe ihe siiri ya ike. (Mat. 11:29, 30) Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwaanyị onye Finishia bịara rịọ ya ka ọ gwọọ nwa ya, o kweghị agwọ nwa ya na mbụ. Ma mgbe nwaanyị ahụ gosiri na o nwere ezigbo okwukwe, o meere ya obiọma ma gwọọ nwa ya. (Mat. 15:22-28) Ọ bụ eziokwu na Jizọs dị obiọma, ma ọ naghị eme ka ọ ghara inye mmadụ ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. Mgbe ụfọdụ, otú o si gosi na ọ dị obiọma bụ ịgwa ndị ọ hụrụ n’anya ebe ndị ha na-anaghị emeta. Dị ka ihe atụ, Mgbe Pita gbalịrị ịgwa Jizọs ka ọ ghara ime uche Jehova, ọ gbaziri ya n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ. (Mak 8:32, 33) O meghị ihe a iji menye Pita ihere. Kama, o mere ya iji kụziere Pita na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ na ha kwesịrị ịna-akwado ya ka ọ na-eme uche Chineke kama ịgba ya ume ka ọ ghara ime ya. O doro anya na ihe a menyetụrụ Pita ihere, ma ndụmọdụ ahụ o nyere ya baara ya uru. Mgbe ụfọdụ, otú anyị ga-esi egosi na anyị na-emere ndị anyị hụrụ n’anya obiọma bụ inye ha ndụmọdụ. Ọ bụrụ na anyị ana-enye ha ndụmọdụ, anyị kwesịrị ime ka Jizọs, mee ka ndụmọdụ anyị si na Baịbụl. w22.03 11 ¶12-13

Satọdee, Septemba 30

Ka anyị . . . na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile, ya bụ, okwu ọnụ anyị nke na-akọsa aha Chineke n’ihu ọha.—Hib. 13:15.

Anyị na-efe Jehova mgbe anyị na-eto ya. (Ọma 34:1) Anyị na-eto Jehova mgbe anyị na-akọrọ ndị ọzọ otú àgwà ọma ya na ọrụ ọma ya dị iche iche si amasị anyị. Anyị ga-enwe ọtụtụ ihe anyị ga-akọrọ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị. Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge chebara ihe ọma dị iche iche ndị Jehova meere anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị na-enwe ihe ndị mere anyị ga-eji na-eto ya. Ozi ọma anyị na-ekwusa bụ ohere magburu onwe ya anyị ji ‘achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile, ya bụ, okwu ọnụ anyị.’ Otú ahụ anyị si eche echiche nke ọma tupu anyị agwawa Jehova okwu n’ekpere, ka anyị kwesịkwara ịkwadebe ihe anyị ga-agwa ndị mmadụ tupu anyị agaa izi ha ozi ọma. Anyị chọrọ ka “àjà otuto” anyị bụrụ nke kacha mma. N’ihi ya, anyị na-esi n’ala ala obi anyị agwa ndị mmadụ okwu mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma. w22.03 21 ¶8

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya