“Olileanya maka Ụwa nke Ka Mma”
Mgbe ọ na-eleta Montreal na July 1985, Gilles Le Sieur hapụrụ akpa pọtfolio ya n’ime ụgbọ okporo ígwè nke okpuru ala n’amaghị ama. N’ụbọchị nke na-esote ọ laghachiri n’ụlọ ya, dị ihe dị ka 160 maịlụ [260 kilomita] site na Montreal, otu nwa agbọghọ bụ onye chọtara akpa pọtfolio ahụ kpọrọ ya òkù na fonu. Gilles na nwunye ya laghachiri Montreal iji nwetaghachi ya. Mgbe ha nwetara ya, ha nyefere nwa agbọghọ ahụ otu mkpụrụ akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ka izu abụọ gasịrị, ha natara otu leta igosi obi ekele site n’aka ya nke ụfọdụ ihe o kwuru na ya bụ:
“Amaghị m onye n’ime anyị nke jeere ibe ya ozi kanụ n’izu gara aga. Ọ bụ ezie na eleghị m anya inweta ihe nkwụghachi, enwere m obi ụtọ n’obi ekele unu gosiri m. Enwere m mmasị karịsịa na unu chọrọ ka mụ na unu kerịta isi iyi nke obi ụtọ unu. . . . Agụsịworị m akwụkwọ ahụ unu nyere m, mgbe unu na-agụkwa leta nke a, otu n’ime ndị enyi m ga na-agụ ya. Unu kwuru eziokwu banyere uru a na-enweta n’akwụkwọ nke a. Ọ bụghị nanị na o nyere m olileanya ụwa nke ka mma kama ọ zara ọtụtụ ajụjụ okpukpe m na-azabeghị m mgbe ọ bụla. . . . Amaliteghachiwo m ịgụ Bible na-enwe ọchịchọ nke ịdị ndụ ka mma ugbu a.”
Nwa agbọghọ nke a nọgidere na-aga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya, mgbe oge na-agakwa n’ihu, ọ ghọrọ onyeozi oge nile nke ihe ọma ndị ọ mụtara. Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala arụwo nnọọ ọrụ n’ịgbanwe ndụ ọtụtụ mmadụ ibi ndụ ka mma. Akwụkwọ ahụ, nke peji ya na magazin nke a hà, fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ kọrọ ihe banyere ozizi nile nke Bible nweekwa ihe karịrị 150 ihe osise izi ihe. Iji nweta akwụkwọ nke a bara uru nanị dejupụta ma zipụkwa mpempe akwụkwọ nke a na-esonụ.
Nke a bụ akụkụ nke usoro ihe omume zuru ụwa ọnụ nke nkuzi Bible, nke e ji ego onyinye na-akwado.