Codex Bezae—Ihe Odide Pụrụ Iche
THÉODORE DE BÈZE, onye France bụ ọkà mmụta a ma n’ihe banyere Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst, bụ ezi enyi na onye nọchiri anya onye nhazigharị okpukpe Protestant ahụ bụ John Calvin. N’afọ 1562, Beza, dị ka a na-akpọkarị ya, wepụtara otu ihe odide oge ochie pụrụ iche. Ọ sịrị na ya nwetara ya site n’ụlọ monastery nke “Senti” Irenaeus dị na Lyons, France, mgbe ndị Hu-guenot bibisịrị obodo ahụ. O dochaghị anya ebe o si bịa, ma o yikarịsịrị ka o sitere n’Ebe Ugwu Africa ma ọ bụ Egypt.
Akwụkwọ codex ahụ dị inch iri n’ogologo, dịkwa inch asatọ n’obosara [25 x 20 sentimita], ọha mmadụ kwetakwara na o sitere na narị afọ nke ise O.A., bú nwa oge nta mgbe e nwesịrị ihe odide nke Sinaitic, Vatican, na nke Alexandrine. O nwere 406 ibe akwụkwọ, ihe dị n’ime ya bụkwa nanị Oziọma anọ ndị ahụ na Ọrụ Ndị Ozi, na-enwekwa oghere ụfọdụ. Ma ọ pụrụ ịbụ na Codex Bezae ahụ nweburu akwụkwọ ozi ndị ọzọ n’ime ya, n’ihi na e nwere otu mpempe nke otu akụkụ akwụkwọ ozi Jọn. Oziọma nke Matiu na Jọn bu nke Luk na Mak ụzọ.
Ihe odide ahụ bụ ihe atụ oge ochie nke ihe e dere n’asụsụ abụọ, na-enwe asụsụ Grik n’aka ekpe, asụsụ Latin n’aka nri. Ma eleghị anya, ọ bụ ihe e leere anya n’ihe odide dị n’akwụkwọ papyrus dee, bụ́ nke nwere ihe odide oge ochie, nke yiri ụfọdụ papyrus ndị ọzọ nke nari afọ nke atọ ma ọ bu nke ano ndị a maara dị ka P29, P38, na P48.
Codex Bezae ahụ, nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu pụtara ìhè nke ọma, agaghị n’usoro peji dị iche iche. E biri ya n’ahịrị ndị na-ahaghị nhata, nke mere na ngwụsị nke ahịrị ọ bụla pụtara ebe a ga-eme nkwụsịtụ mgbe a na-agụ ya. N’ụzọ na-akpali mmasị, e dere nke Latin ahụ n’usoro ihe odide Grik, a gbanwegharịwokwa ihe odide ahụ n’ọtụtụ ebe gaa n’ụzọ e si agụ ihe n’asụsụ Grik. N’aka nke ọzọ, ihe odide Grik ahụ pụtara nnọọ ìhè, ọtụtụ ndị dị iche iche edezigharịwokwa ya, gụnyere onye mbụ ahụ dere ya.
Akara e ji mara Codex Bezae ahụ bụ “D.” Ọ dị nnọọ iche, ọ dabereghịkwa n’ihe odide nile ndị ọzọ bụ isi. Dị ka nkọwa ala ala peji ndị dị na New World Translation of the Holy Scriptures na-egosi, codex ahụ na-ekwekọ mgbe ụfọdụ, gharakwa ikwekọ n’oge ndị ọzọ n’etiti ya na codex ndị nke Sinaitic (א), nke Vatican (B), na Alexandrine (A). Abamuru dị ukwuu nke codex nke a bụ nkwado ọ kwadoro ihe odide ndị ọzọ dị mkpa kama ịbụ n’ihe ndị ahụ a na-edenyeghị na ya ma ọ bụ ihe ndị a tụkwasịrị na ya n’ụzọ pụrụ iche.—Lee nkọwa ala ala peji dị na New World Translation of the Holy Scriptures—With References, na Matiu 23:14; 24:36; 27:49; Mak 7:16; 9:44, 46; 11:26; Luk 15:21; Jọn 5:4.
N’agbanyeghị ebe ụfọdụ ndị a na-agụ n’ụzọ di iche ma ọ bụ ebe ndị e dere n’ụzọ ndị dị iche, Codex Bezae bụ ezi ihe àmà ọzọ nke na-akwado nchebe e chebere Bible ruo oge anyị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 24]
N’elu: By permission of the Syndics of Cambridge University Library
Aka ekpe: Courtesy of the Trustees of the British Museum