Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 7/15 p. 31
  • Nzọụkwụ Amamihe Dị na Ya Tupu Ọdachi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzọụkwụ Amamihe Dị na Ya Tupu Ọdachi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 7/15 p. 31

Nzọụkwụ Amamihe Dị na Ya Tupu Ọdachi

EBE ọ bụ na ụmụ Mary nile etosiwo, o nwere nnọọ ohere ugbu a, o wee kpebie inweta ọrụ nwa oge. Otú ọ dị, mgbe ọ gwara di ya, bụ́ Enos, di ya mere ka o doo ya anya na ọ dịghị mkpa ka o jee rụọ ọrụ. Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na m nwere ike ilekọta gị na ụmụntakịrị ahụ, apụrụ m nnọọ ilekọta anyị abụọ ugbu a.” Kama ikwe ka nwunye ya malite ọrụ ego, ọ tụrụ aro ka o jiri ekpere tụlee ihe banyere ịghọ onye ọsụ ụzọ, bụ́ onye nkwusa oge nile nke Alaeze.

Ọ bụ ezie na ọ na-amasị Mary isoro ndị ikwu ya na-ekerịta ozi Alaeze ahụ, ọ na-eme ihere, o nwechaghịkwa obi ike. Ma, ọ chọrọ ịgbaso ndụmọdụ nke di ya. Ya mere, o denyere aha ya dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka n’April 1981, ọ bụ ezie na obi esichaghị ya ike.

Ngwa ngwa, Mary wulitere ịhụnanya maka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ụzọ ọ na-enwebeghị ya na mbụ. N’oge na-adịghị anya, ọ na-eduziri mmadụ anọ nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi. N’ime otu afọ, ọ ghọwo onye ọsụ ụzọ oge nile, na-eduzi ọmụmụ Bible iri. Christine, bụ́ Onyeàmà Jehova nke nwere ụmụ abụọ ndị ka na-eje akwụkwọ ji ịnụ ọkụ n’obi sonyere ya dị ka onye òtù ya n’ọrụ ọsụ ụzọ. Ndị ọhụrụ nwere mmasị malitere ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ebe ahụ, bụ́ ebe mmụọ ọsụ ụzọ dị mma na-etolite. Ọṅụ kasị ukwuu Mary nwere bịakwara mgbe nwa ya nwoke, bụ́ Christopher, họọrọ ịgbaso ihe nlereanya ya wee ghọọkwa onye ọsụ ụzọ.

Mgbe ahụ, na mberede, na 1985, ihe ọdachi mere. Mary dara na mberede. Nsogbu nke ọbara ijupụta n’akwara zara aza nke dị n’ime isi ya dujere n’oké ọgbụgba ọbara n’ime ụbụrụ ya, mgbe ụbọchị atọ na-erula, Mary onye dị 45 afọ anwụwo. Otú ọ dị, n’ime afọ anọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ahụ, Mary ewulitewo ọnọdụ dị mma n’obodo ya. Ihe karịrị 300 mmadụ bịara ememe ili ozu ya, gụnyere ọtụtụ ndị agbata obi. Otu n’ime ndị bịaranụ, bụ́ otu enyi o nwere n’ụlọ akwụkwọ, onye okwukwe Mary masịrị nke ukwuu, chọrọ ịmatakwu ihe banyere ya, o wee rịọ ka a malite iduziri ya ọmụmụ Bible. Ije ozi Mary ka nọ na-amịpụta mkpụrụ.

Enos kwuru, sị, “Abụ m onye ọsụ ụzọ inyeaka ugbu a, ma ọ gaara amasị m nnọọ ma a sị na m sonyeere Mary mgbe ọ bụ onye ọsụ ụzọ. Ọ na-ekwu okwu banyere ahụmahụ ya dị iche iche mgbe nile, ọ na-enwekwa nnọọ obi ụtọ. N’eziokwu afọ ole na ole ndị ahụ bụ afọ ndị anyị kasị nwee obi ụtọ n’oge nile anyị bikọrọ n’otu, ma ọ bụ nanị ugbu a ka m ghọtara ihe kpatara ya.”

Ọ dịghị onye maara oge “mgbe na ihe ndapụta” ga-akpa ike ya, dị ka o si mee nnọọ mgbe a na-atụghị anya ya n’ihe banyere Mary. Otú ọ dị, ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka ndị nkwusa Alaeze na-emere onwe ha aha ọma n’ebe ma Chineke ma mmadụ nọ, ọbụna mgbe ọdachi dapụtara.—Eklisiastis 9:11; 11:1, 2.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ikere òkè n’ije ozi bụ oge e ji mee ihe nke ọma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya