Nzukọ Kwa Afọ—October 6, 1990
A GA-EME NZUKỌ kwa afọ nke ndị nọ n’òtù Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’October 6, 1990, n’ụlọ nzukọ Assembly Hall of Jehovah’s Witnesses, 2932 Kennedy Boulevard, Jersey City, New Jersey. Nzukọ bu ụzọ nke nanị ndị nọ n’ọ̀tù ahụ ga-amalite n’elekere 9:30 ụtụtu, nzukọ kwa afọ nke ọha mmadụ ga-esochikwa ya n’elekere 10:00 ụtụtụ.
Ndị so n’Òtù Ọrụ ahụ kwesịrị ime ka Ọfis Onye Odeakwụkwọ òtù ahụ mara ugbu a banyere mgbanwe ọ bụla e nweworo n’adres ha n’ime afọ gara aga ka akwụkwọ ịma ọkwa na akwụkwọ nnọchianya ndị a na-ezitere ha mgbe nile nwee ike iru ha n’oge na-adịghị anya mgbe August 15 gasịrị.
E kwesịrị izighachi akwụkwọ nnọchianya ndị ahụ, ndị a na-ezijekọtara ndị òtù ahụ ha na akwụkwọ ịma ọkwa maka nzukọ kwa afọ ahụ n’Ọfis Odeakwụkwọ nke Society n’oge na-agafeghị September 1. Onye ọ bụla so n’òtù ahụ kwesịrị idejupụta ma ziteghachi akwụkwọ nnọchianya nke ya ngwa ngwa, na-egosi ma ọ̀ ga-abịa nzukọ ahụ n’onwe ya ma ọ bụ na ọ gaghị abịa. Ihe e dere n’akwụkwọ nnọchianya nke ọ bụla kwesịrị ikwu ihe a chọrọ kpọmkwem, ebe ọ bụ na ya ka a ga-adabere iji mara ndị ga-anọ ebe ahụ n’onwe ha.
A na-atụ anya na a ga-emezucha ihe nile, gụnyere nzukọ metụtara ọrụ ha na inye akụkọ ozi dị iche iche n’ihe dị ka elekere 1:00 ehihie ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị. A gaghị enwe nnọkọ nke ehihie. N’ihi ohere na-ebughị ibu e nwere, ọ bụ nanị ndị nwere tiketi ka a ga-anabata na ya. Ọ dịghị ndokwa ọ bụla a na-eme iji eriri telifon jikọta nzukọ kwa afọ a na ebe ndị ọzọ.