Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/1 p. 6-7
  • Ụwa Ọhụrụ Dị Nso!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Ọhụrụ Dị Nso!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpughe 21:4—“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ụwa Agha Na-adịghị Dị Nso
    Teta!—1996
  • Oge Ikpeazụ Gasịa Gịnị Emezie?
    Teta!—2008
  • Ahụhụ Niile Ga-akwụsị n’Oge Na-adịghị Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/1 p. 6-7

Ụwa Ọhụrụ Dị Nso!

ỌTỤTỤ atụmatụ dị maka ịgwọta nsogbu nile nke ụwa. Ná nchịkọta, ha na-achọ ka ndị mmadụ na-echebara ibe ha echiche, na-emekọkwa ihe ọnụ, tinyekwara oké mgbalị mba nile nke ụwa jikọrọ aka mee. E nwere mmetụta nke bụ na ebe ọnọdụ nọgidere na-adịwanye njọ, mkpa nke onye ọ bụla itinye aka iji chebe ihe a kpọrọ mmadụ ga-amanye mba dị iche iche ịhazigharị ihe ndị ha kpọrọ mkpa ndị bụ isi, rụkọọkwa ọrụ iji guzobe ụwa ọhụrụ nke a pụrụ ilekọta elekọta. A na-atụ anya na a ga-ebelata ego a na-emefu ná ngwá agha ka e wee jiri ihe ndị e nwere na-eme ihe ilebara egwu a na-eyi gburugburu ebe obibi anya, nakwa, dị ka akwụkwọ State of the World 1990 kwuru, “kama ịnọ na-elekọta nnukwute ụlọ ọrụ nchebe nke ha, na gọọmenti mba dị iche iche ga-adabere n’òtù ndị agha nchebe udo òtù U.N. nke e mere ka o buwanye ibu, siwanyekwa ike, bụ nke ga-enwe ike na nkwado ichebe mba ọ bụla so na ya megide ndị ọ bụla bịara ibuso ha agha.”

Ma atụmatụ ndị ahụ adịghị erute nso ma ọlị n’iweta ọnọdụ ndị ahụ na-agụ mmadụ agụụ, bụ́ ndị e depụtara na peji ndị mbụ ahụ. Atụmatụ ime ihe nkịtị nke ụmụ mmadụ adịghị ụzọ ọ bụla ọ pụrụ isi gwọta omume mmehie na anyaukwu nke mmadụ; ha adịghị ewepụchasị ịkpọasị na esemokwu agbụrụ dị iche iche; ha adịghị akwalite ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye n’etiti ihe nile a kpọrọ mmadụ; ha apụghịkwa ikwe nkwa iweta ọrịa na ọnwụ ná njedebe. A dịghị eme ihe n’ụzọ dị irè banyere imempụ, a dịghị ekwukwa okwu ọ bụla banyere imeri esemokwu na ịkpọasị nke okpukpe. A gaghị echedị echiche ọ bụla banyere iwepụchasị ọdachi ndị na-emere onwe ha. A na-agbachi nkịtị ka ịhụ mba n’anya, tinyere ike nile o nwere ịkpata nsogbu, dịgide. Ya mere, anyị aghaghị irute ná nkwubi okwu ahụ na-adịghị enye obi ụtọ nke bụ na ụmụ mmadụ adawo n’iweta ihe ngwọta ọ bụla ga-aga nke ọma.

Ma n’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe ngwọta dịnụ! N’eziokwu, e kwewo nkwa maka ihe ndị a nile na-agụ ihe a kpọrọ mmadụ agụụ, nkwa ahụ sitekwara n’ọnụ Chineke ahụ “onye na-apụghị ikwu okwu ụgha.” (Taịtọs 1:2) Ọ maara kpọmkwem ihe a na-aghaghị ime, o nwekwara amamihe, ikike, na ike iji mezuo ihe o zubeworo.—Mkpughe 7:12; 19:1.

Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

Olee ụzọ a ga-esi mezuo nke a? Aịsaịa 11:9 na-aza, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Ee, a ga-ezi ihe nile a kpọrọ mmadụ ihe ‘n’ihe ọmụma Jehova,’ a ga-ghị ekwekwa ka onye ọ bụla nke jụrụ ime ihe kwekọrọ na nke a nọrọ wee mebie udo nke ndị ọzọ. A gaghị ebibikwa elu ala anyị mara mma ọzọ.

Abụ Ọma 46:8, 9 kwere nkwa, sị, “Hụ ọrụ nile nke Jehova, . . . [Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Leekwa Maịka 4:3, 4.) Otu isi ihe dị mkpa n’udo nke a zuru ụwa ọnụ bụ ngwụsị nke adịghị n’otu nke dị n’etiti mba dị iche iche. A ga na-emekọ ihe n’otu n’ihi na a gaje inwe nanị otu ọchịchị dị n’ụwa dum—nke Chineke. Ọchịchị ya bụkwa Alaeze “a na-agaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Karịsịa, Eze ya bụ Jisọs Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie, onye na-apụghịkwa ịnwụ anwụ, onye ọchịchị ya ga-abụ site n’ikpe ziri ezi na ezi omume.—Aịsaịa 9: 6, 7; 32:1.

Ma, à ga-emebi nke a site n’ezughị okè mmadụ bu pụta ụwa, sitekwa ná ndịgide nke ihe mgbu, ọrịa, iru újú, na ọnwụ? Ee e, n’ihi na ihe ndị a gajekwa ịbụ ihe gara aga. Mkpughe 21:4 na-ekwe anyị nkwa, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” A ga-agbaghara mmehie e ketara eketa n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs, a ga-eweghachikwa ihe a kpọrọ mmadụ bịa n’ọnọdụ nke izu okè. (Ndị Rom 6:23; Ndị Efesọs 1:7) Oleekwa onye ọzọ nwere ike karị ịchịkwa ihe ndị na-eme n’usoro ihe e kere eke, gbochiekwa ha imerụ ihe a kpọrọ mmadụ ahụ karịa Onye Kere ha?—Abụ Ọma 148:5-8; Aịsaịa 30:30.

Chineke ga-emezu ihe mmadụ nweworo ike nanị inwe olileanya na ịrọ nrọ ya. Ma, ọ bụ òle mgbe? Amụma Bible na-egosi na mgbanwe ndị ahụ ga-abịa n’oge ahụ mgbe mba nile “ga-ewe iwe,” mgbe mmadụ ga ‘na-emebikwa ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ihe ga-aka mgbe ikpeazụ nke ụwa ochie ahụ akara ga-abụ “oge dị oké egwu”—nke na-arụpụta ọnọdụ ndị na-adịwanye njọ ndị anyị na-ahụ gburugburu anyị taa. (2 Timoti 3:1-5, 13) Jisọs bukwara amụma na ọgbọ nke hụrụ ihe ndị ahụ ga-abụ ọgbọ nke ga-ahụ mmezu nke nkwa nile nke Chineke.—Matiu 24:3-14, 32-34.

Wepụta oge iji leba anya ná nkwa ndị ahụ e dekọrọ na Bible. N’ihi na ma ndị ikom nwere ihe ọmụma ma Chineke nwere nkwekọrịta n’isi ihe nke a: Ugbu a bụ oge maka ụwa ọhụrụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya