Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ikwusa Ozi Ọma ahụ n’Ebe “Ụwa Sọtụrụ”
“A GA-EKWUSAKWA ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Otú ahụ ka Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya. Ngwa ngwa mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, o kwukwara ọzọ, sị: “Unu ga-abụkwa ndịàmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Matiu 24:14; Ọrụ 1:8) Taa, a na-emezu amụma ndị a n’ihe karịrị 200 mba dị iche iche, gụnyere mba Peru nke dị na South America.
Ihe karịrị 32,000 Ndịàmà na-ekwusa ozi ọma n’ala ahụ mara mma, ókèala ha gụnyekwara n’ezie akụkụ ụfọdụ nke ebe ụwa sọtụrụ: ugwu Andes ahụ dị elu, nke ịdị elu ya dị n’agbata 14,000 na 15,000 amaụkwụ [4,000 na 4,500 mita], nakwa oké ọhịa ahụ na-eme okpomọkụ bụ Amazon, bụ́ ebe a pụrụ ijekwuru ndị mmadụ nanị site n’iji ụgbọ epeepe mee ihe. Alaka ụlọ ọrụ Peru na-akọ, sị:
◻ “N’akụkụ oké ọhịa ahụ, anyị nwere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche asatọ e kenyere ụgbọ epeepe abụọ dị nta ndị a na-akpọ lanchas. Ụgbọ mmiri nta ndị a na-emiba nanị otu amaụkwụ [0.3 mita] n’ime mmiri, ya mere o kwewo mee ịgbasa nkwusa nke ozi ọma ahụ n’ime ọtụtụ ebe ndị ohụrụ e nwere n’akụkụ osimiri ndị dị nta karị. Ka ọ dị ugbu a, ụmụnna ahụ ndị ji ụgbọ ndị a eme ihe etinyewo ọtụtụ narị puku magazin, akwụkwọ, na Bible n’akụkụ nile nke Ndagwurugwu Amazon nke Peru. Dị ka ihe si na ya pụta kpọmkwem, e guzobewo ọgbakọ anọ ndị ọhụrụ, tinyere ìgwè ise ndị dịpụrụ adịpụ ndị na-enye akụkọ ozi ma na-enwe nzukọ dị iche iche. E nwere olileanya na mgbe na-adịghị anya ìgwè ndị a ga-aghọ ọgbakọ dị iche iche.”
◻ Otu obodo e nwere n’ime ọhịa malitere n’ebe e nwere ígwè na-amịpụta mmanụ na-eji usoro paịpụ ahụ gabigara Andes na-eburu mmanụ site n’oké ọhịa ahụ gafee Andes ahụ dị elu, ruokwa ebe dị anya nke ụsọ oké osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ. N’ihi ọnụnọ nke ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ahụ na-egwupụta mmanụ, obodo nke a nwere ihe dị ka 20 ụlọ mmanya dị iche iche wee bụrụ nke a maara dị ka ebe a na-anọ aṅụbiga mmanya ókè ma na-ekpori ndụ. Otú ọ dị, mgbe ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ndị ahụ gbasịrị àmà zuru ezu, ọtụtụ nakweere ozi Alaeze ahụ, ugbu a kwa nanị ụlọ mmanya anọ fọrọ n’obodo ahụ! N’oge nleta nke onye nlekọta sekit n’oge na-adịbeghị anya, 189 mmadụ bịara ige okwu ihu ọha. Ugbu a e nwere ìgwè nke ndị nkwusa 7 n’obodo ahụ, ihe karịkwara 45 mmadụ na-abịa nzukọ nile. N’oge na-adịghị anya, site ná ngọzi Jehova, o kwesịrị ịghọ ọgbakọ.
◻ N’otu n’ime 221 ọgbakọ ndị e nwere n’isi obodo Peru, bụ Lima, otú nwoke nke gbara 29 afo kọrọ otú ya si nata eziokwu. Ebe ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ 13, o sonyeere otu ìgwè ndị isi ike wee malite ndụ nke ịlụ ọgụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ime omume rụrụ arụ. Mgbe o jesịrị ozi agha nke a manyere ya amanye ije, o malitere inwe nsogbu nke uche. E mesịa, na 1983, otu nwanna nwanyị dị obi umeala, nke na-adịghị mpako, jekwuru ya n’ozi ụlọ n’ụlọ ya. Na nke mbụ ya, ọ nụrụ banyere ụwa ọhụrụ ahụ nke ịhụnanya na udo. A malitere omụmụ Bible, sitekwa n’enyemaka ịhụnanya sitere n’ọgbakọ na n’ike Jehova, o nwere ike imeri àgwà ọjọọ ya nile. E mere ya baptism na 1986, o na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi n’ime ọgbakọ.
N’ikwu eziokwu, a na-emezu okwu ndị ahụ Jisọs kwuru nke bụ na a ga-ekwusa Alaeze ahụ ruo “ebe ụwa sọtụrụ” na Peru, ọ na-arụpụtakwa ihe ndị dị ịrịba ama, n’ụzọ na-abara ọtụtụ ndị nọ ná mba ahụ uru, bụ́ ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka eziokwu ahụ.