“Anya Mmiri nke Obi Ekele”
“SITE n’ibepụta anya mmiri nke obi ekele, aka m gụsịrị isiokwu ahụ bụ ‘Ụzọ A Ga-esi Nyere Ndị Dara Mba n’Obi Aka Inwetaghachi’Ọṅụ.’” (Ụlo Nche, March 15, 1990, peji 26-30) Otú ahụ ka otu n’ime ọtụtụ akwụkwọ ozi ekele ndị Society natara maka isiokwu ndị ahụ metụtara ịda mbà n’obi ndị pụtara ná mbipụta anyị nke March 1 na March 15, 1990, si malite. Otú ọ dị, okwu nke a kpọmkwem sitere n’ọnụ otu nwanna nwanyị na Japan nke nwa ya nwoke na-eto eto butere ọrịa amaghị onwe onye bụ schizophrenia n’oge na-adịbeghị anya. Ọ kọwara, sị:
“N’ihi inye mkpụrụ obi dara mbà n’obi nkasi obi na agbamume kwa ụbọchị, mgbe ụfọdụ ike na-agwụsị m nke na m gaghị enwe ike ịnọgide. Mgbe chi jimiri, egwu na nchekasị na-ejide nwa m nwoke. Ya mere m na-enye ya ọgwụ ụra ma nọrọ ala n’akụkụ àkwà ya na-adịda ya aka n’aka ma na-atụkwasị aka m n’egedege ihu ya ruo mgbe o hiiri ụra. O yiri nnọọ ije nyibe nwa ọhụrụ ma mee ka ọ rahụ ụra, mgbe ihe dị ka otu hour gasịkwara, ọ na-emesịa himie ụra. Ọ bụ mgbe ahụ ka m na-enwere onwe m, ma n’otu oge ahụ, ana m agwa onwe m na ụtụtụ echi ga-eweta ụbọchị ọzọ a ga-ata ahụhụ na ya.
“Nwa m nwoke na-asị, ‘Abaghị m uru ihe ọ bụla. Olileanya ọ bụla adịrịghị m.’ Kwa ụbọchị ọ na-eji mwute jụọ sị, ‘À ga-agwọta m ọrịa m? Olee mgbe m ga-enwere onwe m pụọ n’ọgwụ? Ruo ole mgbe ka ụdị ndụ nke a ga-adịgide?’ N’oge ndị dị otú a m na-eji ajụjụ dị iche iche gbanwee echiche ya dị ka magazin ndị ahụ tụrụ aro, nke a na-enyekwara ya aka inwetatụ onwe ya ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ma anyị na-eme otu ihe ahụ n’ụbọchị nile.
“E nwekwara mgbe nwa m nwoke na-akpọ ndị okenye [site n’ọgbakọ anyị] n’etiti abalị mgbe o nwere oké nchekasị na-arịọ ha ka ha kpeere ya ekpere. O yiri ka nke a ọ na-enye ya oké nkasi obi ma mee ka uche ya zuru ike. . . . Ọtụtụ mgbe, ọnọdụ nwa m nwoke na-aka njọ mgbe di m (bụ́ onye na-ekweghị ekwe) nọ na njem azụmahịa. Mgbe m jiri telifonu kpọọ òkù enyemaka, ọtụtụ ụmụnna na-agbata n’ebe obibi anyị.
“Ana m ekele unu ụmụnna, site n’ala ala obi m n’ihi ibipụta isiokwu ndị dị otú a site n’oge ruo n’oge ma na-egosi na unu na-enwe nchegbu banyere mkpa nke ndị na-adịghị ike.”
[Mbịanye aka n’akwụkwọ] H. H.