Ọtụtụ Nde Mmadụ Ga-eje. Ị̀ Ga-ejekwa?
Ebee ka ha ga-eje? Ọ bụ n’ememe ncheta ọnwụ Jisọs Kraịst ahụ a na-eme kwa afọ. Na 1990, e nwere ngụkọta nke 9,950,058 ndị bịaranụ. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-eje? Ọ bụ n’ihi ihe ọnwụ Kraịst pụtara nye ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ pụtara ntọhapụ n’isi nso pụọ n’ọrịa, ịta ahụhụ, na ọnwụ. Ọbụna na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ anyị hụrụ n’anya bịa ná ndụ n’elu ala nke e meghachiri ka ọ ghọọ Paradaịs. Olee ụzọ ọnwụ Jisọs pụrụ isi weta ngọzi ndị dị otú a? A na-akpọ gị òkù ka ị bịa chọpụta. Ndịàmà Jehova na-anabata gị ka i sonyere ha n’oge ihe omume nke a dị mkpa. Jee n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị dịrị nso n’ebe i bi. N’afọ a, ụbọchị a ga-eme ya bụ Saturday, March 30, mgbe anyanwụ dasịrị. Jụta Ndịàmà bi n’ógbè gị maka kpọmkwem oge a ga-eme ya.