Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/1 p. 30-31
  • Ọrụ Dịịrị Nwoke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Dịịrị Nwoke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ilebara Ụmụaka Anya Otú Ahụ́ Ha Chọrọ
    Teta!—2005
  • Rụsie Ọrụ Ike Maka Nzọpụta nke Ezinụlọ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịzụlite Ụmụ n’Ọzụzụ nke Chineke
    Teta!—2004
  • Ezinụlọ Buru Ibu Ndị Dị N’otu N’ozi Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/1 p. 30-31

Ọrụ Dịịrị Nwoke

“¡Ropa, zapato, casa, y comida!” Okwu ndị a sitere n’abụ ochie nke ndị Spain nke na-edepụta ihe anọ ndị bụ isi e lere anya na onye bụ nwoke ga-enye ezinụlọ ya: ákwà, akpụkpọ ụkwụ, ebe obibi, na nri. Ihe ka ukwuu ná ndị ikom maara ọrụ dịịrị ha na-ejikwa nganga na-agbasi mbọ ike ibu ibu ọrụ ahụ.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị bụ nwoke nwere ezinụlọ, ị̀ na-ahụ maka mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ gị bụ́ nke ka mkpa? Ka ị̀ na-eche, dị ka ọtụtụ ndị ikom na-eche, na ịhụ maka ihe ndị metụtara okpukpe n’ụlọ abụchaghị ọrụ dịịrị onye bụ nwoke? N’omenala ụfọdụ, ọ bụghịdị ihe a tụrụ anya ya na ndị bụ nwoke ga-ewepụta oge iji kụziere ụmụ ha banyere Chineke na Bible.

Okwu Chineke na-ebukwasị ibu ọrụ nke ịkụba ịhụnanya maka Chineke na ekele dị omimi maka ụkpụrụ ọma ya nile n’ime ezinụlọ n’ubu onye bụ nwoke karịsịa. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Efesọs 6:4, Akwụkwọ nsọ na-agba ndị Kraịst bụ nwoke ume otú a, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].”

Ọ bụ ezie na ha maara okwu ndị a, ụfọdụ pụrụ ịbụ na ha aghọtaghị na akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-atụ aka karịsịa n’ebe onye bụ nna nọ, bụ́ nwoke nke nwe ụlọ. Dị ka ihe atụ, ndị na-asụ asụsụ Spanish na Portuguese pụrụ ịghọta okwu ndị ahụ dị ná Ndị Efesọs 6:4 ịbụ nke a gwara ma nna ma nne. N’asụsụ ndị a, okwu e nwere maka “ndị bụ nna” na okwu e nwere maka “ndị mụrụ ụmụ” bụ otu. Otú ọ dị, n’amaokwu 1 nke Ndị Efesọs isi 6, Pọl onyeozi zoro aka n’ebe ma nna ma nne nọ site n’iji okwu Grik bụ go·neuʹsin, mee ihe, bụ́ nke sitere na go·neusʹ, nke pụtara “onye mụrụ ụmụ.” Ma n’amaokwu nke 4, okwu Grik e ji mee ihe bụ pa·teʹres, nke pụtara “ndị bụ nna.” Ee, ná Ndị Efesọs 6:4, Pọl chere okwu ahụ ihu kpọmkwem n’ebe onye bụ nwoke n’ezinụlọ nọ.

Ee, ọ bụrụ na e nweghị nwoke n’ezinụlọ ahụ maka idu ndú, mgbe ahụ onye bụ nwanyị aghaghị iweghara ibu ọrụ nke a. Site n’enyemaka Jehova, ọtụtụ ndị bụ nne enwewo ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Jehova. Otú ọ dị, mgbe nwoke bụ onye Kraịst nọ ya, o kwesịrị iwere ọrụ idu ndú. Ọ bụrụ na o leghara ibu ọrụ nke a anya, ọ na-esi ike karị nye ndị fọdụrụ n’ezinụlọ ijigide ezi usoro ihe omume nke nri ime mmụọ. Nwoke dị otú ahụ ga-azakwa ajụjụ n’ihu Jehova n’ihi ileghara ihe anya.

Ihe bụ echiche Chineke n’okwu a pụtara ìhè n’iru eru Akwụkwọ nsọ nke e setịpụrụ maka ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ndị Kraịst. Bible na-ekwu kpọmkwem na onye a họpụtara maka ọnọdụ dị otú ahụ kwesịrị ịbụ “onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma, na-enwekwa ụmụ ya n’okpuru ya n’ikwesị nsọpụrụ nile; (ma ọ bụrụ na onye ọ bụla amataghị otú ọ ga-achị ezinụlọ nke aka ya, ọ̀ ga-esi aṅaa lee nzukọ Chineke anya nke ọma?).”—1 Timoti 3:4, 5, 12; Taịtọs 1:6.

Nwoke ahụ nwere ezinụlọ aghaghị ịdị njikere iji ntụrụndụ na ntụsara ahụ onwe onye ya chụọ àjà n’ihi ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ya. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị mkpa na ọ ga-ebelata oge ọ na-etinye n’ihe omume ndị ọzọ ka o wee nwee ike inwe oge zuru ezu isoro ụmụ ya nọkọọ mgbe mgbe. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Otú o sina dị, ọ gaghị ebugara ndị ọzọ ọrụ nke a Chineke nyeworo ya. Ịhụnanya o nwere maka ụmụ ya na maka ọdịmma ha ga-agabiga nnọọ ịzụ ákwà, akpụkpọ ụkwụ, ebe obibi, na nri.

Ọ bụ nnukwu ihe ịma aka ịzụlite ụmụntakịrị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].” Ọ bụ ya mere ibu ọrụ bụ isi ji bụrụ nke onye bụ nwoke. Mgbe onye Kraịst bụ nna na-arụ ọrụ ya nke ọma, mgbe ahụ ka ọ pụrụ ile ụmụ ya na-atụ egwu Chineke anya dị ka ngọzi sitere n’aka Jehova. Ọ pụrụ isoro onye ọbụ abụ ahụ kwuo, sị: “Dị ka àkụ́ n’aka dike, otú a ka ụmụ a mụrụ na mgbe okorobịa dị. Onye ihe na-agara nke ọma [“onye obi ụtọ,” NW] ka nwoke ahụ bụ nke chịrịworo àkụ́ ahụ kpojuo akpa àkụ́ ya.”—Abụ Ọma 127:4, 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya