Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼ Gịnị ka ezinụlọ ndị Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwa ha aghaghị ije ụlọ akwụkwọ n’ebe ọ bụ iwu na a ghaghị izi ihe banyere okpukpe?
Ọ dịghị amasị ndị Kraịst mụrụ ụmụ ka e jiri okpukpe ụgha zụọ ụmụ ha. Ma e nwere ọnọdụ ụfọdụ ebe ụmụntakịrị na-apụghị ịjụ ịnọ n’ime klasị ebe a na-ezi ihe banyere okpukpe, ọ bụ ezie na ha agaghị ekere òkè n’ihe omume ma ọ bụ ememe dị iche iche nke okpukpe ụgha.
Enyi Chineke bụ Abraham setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere inye ụmụntakịrị ọzụzụ nke okpukpe. Ọ zụlitere ụmụ ya na Kenean, ebe njehie nke okpukpe na ihe omume “nsọ” dị iche iche ndị rụrụ arụ gbara ha gburugburu. (Tụlee Ọpụpụ 34:11-15; Levitikọs 18:21-30; Deuterọnọmi 7:1-5, 25, 26; 18:9-14.) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ya onwe ya na-enye ezinụlọ ya ọzụzụ n’ihe banyere okpukpe. Chineke nwere obi ike na Abraham ‘ga-enye ụmụ ya na ụlọ ya, ndị ga-anọchi anya ya iwu, ka ha wee debe ụzọ Jehova, ime ezi omume.’—Jenesis 18:19.
Dị ka nwa okoro, Jisọs ritekwara uru site n’ọzụzụ a na-enweta n’ezinụlọ na n’ọgbakọ n’ihe banyere ezi ofufe. Otú a, ọ ‘gara n’ihu n’amamihe na n’ogologo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.’—Luk 2:52.
N’akụkụ ka ukwuu n’ụwa, ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst na-amụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ọha dị iche iche. Ọ bụghị ihe nile a na-akụzi na-ekwekọzu n’eziokwu Bible na ihe ndị a maara dị ka eziokwu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ọgbọ nke ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst anọwo na klasị sayensị na nkà mmụta banyere ihe ndị dị ndụ dị ka akụkụ nke usoro ihe ọmụmụ ha. Otú a, ọtụtụ n’ime ha ezutewo ozizi ndị e nwere n’oge a nke evolushọn na echiche ndị ha na ya na-eso banyere mmalite ndụ malitere “n’onwe ya” n’elu ala.
Otú ọ dị, ochiche ha chere ọnọdụ ndị a ihu emeghị ka ndị ntorobịa ndị a bụ ndị Kraịst ghọọ ndị na-agbaso ozizi ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke nke evolushọn. N’ihi gịnị? N’ihi na n’ụlọ na ná nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst, ha ebuworị ụzọ nweta ihe ọmụma ziri ezi nke dabeere n’Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ ya, nke nyeere ha aka ịzụlite ‘ike nghọta ihe ha ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14) Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ esorowo ụmụ ha mụọ ntụle ihe ahụ a haziri nke ọma nke evolushọn n’akwụkwọ ahụ na-ewusi okwukwe ike, bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?a N’ịbụ ndị e si otú a kwadebe, ụmụ akwụkwọ ndị a anakwereghị dị ka ihe a pụrụ ikwere ekwere, ihe ndị ahụ a na-akụzi na klasị banyere evolushọn. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere ike igosipụta n’azịza ha na-enye na klasị na n’ule dị iche iche na ha na-ege ntị, na ha pụkwara ịmụta nkọwa ndị a na-enye. Ọbụna na ụfọdụ nwere ohere nke inye ụdị nkọwa ọzọ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu ndị ahụ Onye Kere mmadụ wepụtara n’ime Bible.—1 Pita 3:15.
Ma, gịnị banyere oge a nọ na klasị, bụ́ nke e wepụtara iche maka ịkụzi ihe banyere okpukpe a na-ekpekarị n’ógbè ahụ ma ọ bụ ihe banyere okpukpe n’ozuzu ya?
Ọ bụghị ihe a ga-atụ anya ya na a ga-akụzi ihe dị otú ahụ n’enweghị onye a dalaara, dị ka ihe ọmụma efu. Ọbụna na ọ pụrụ ịbụ na onye nkụzi ahụ na-ekpe okpukpe ahụ, wee si otú a chọọ ịkụbanye ya n’ime obi na uche nke ụmụ akwụkwọ ahụ. Ya mere ọ na-amasị Ndịàmà Jehova karị ka e kwere ka ụmụ ha ghara ịnọ na klasị ebe a na-ezi ihe banyere okpukpe. Nke a pụrụ ime ka ụmụ ha nwee ike iji oge a nọ n’ụlọ akwụkwọ mee ihe n’ụzọ bara uru karị imezu ihe omume maka nnọkọ klasị ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ịmụ ihe n’ebe ndebe akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ ahụ.
Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ, a jụwo ịnakwere arịrịọ ndị dị otú ahụ; ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọ bụ ndị ọchịchị pụrụ ọbụna ikwu na ụmụntakịrị nile aghaghị ije, mụzuokwa ihe ọmụmụ banyere okpukpe ka e wee nwee ike ikwe ka ha gụpụchaa akwụkwọ. Ezinụlọ nke ọ bụla aghaghị ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme n’ọnọdụ ahụ.
Ụfọdụ ndị ohu Chineke n’oge gara aga anọwo n’ọnọdụ dị iche iche ndị ọ na-abụghị ha debere onwe ha n’ebe ahụ, bụ́ ebe ha na-aghaghị ịtachi obi mgbe a na-ezi ozizi banyere okpukpe ma ọ bụ na-eme ihe omume dị iche iche nke okpukpe ma na-anọgidekwa na-abụ ndị guzosiri ike n’akụkụ ezi Chineke ahụ. Ọ ghaghị ịbụworị otú ahụ ka o mere n’ihe banyere Mosis. A zụlitere ya dị ka nwa nwa nke Fero nke Ijipt, ‘e zikwara ya ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt.’ (Ọrụ 7:20-22) Ma eleghị anya nke ahụ gụnyere, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, nkwenkwe na ihe omume okpukpe ndị e nwezuru n’Ijipt. Ma e chebere Mosis site n’ihe ọmụma ka mma nke ihe àmà gosiri na o nwetara n’aka ezinụlọ ya nakwa ma eleghị anya n’aka ndị Hibru ndị ọzọ.—Ọpụpụ 2:6-15; Ndị Hibru 11:23-26.
Tụleekwa ihe nlereanya nke ụmụ okoro atọ ahụ bụ ndị Hibru, ndị ha na Daniel kpakọrọ, ndị e nyere ọzụzụ pụrụ iche na Babilọn, meekwa ka ha bụrụ ndị ọrụ ọchịchị. (Daniel 1:6, 7) Ha enwereghị onwe ha ime ma ọ bụ ịjụ ime ihe ha chọrọ. N’otu oge, Eze Nebukadneza nyere iwu ka ha soro ndị ọrụ ọchịchị ndị ọzọ gbakọta n’ebe ahụ ihe ọkpụkpụ ọlaedo ahụ dị, bụ́ nke o guzobeworo n’ọzara nke Dura, ebe a ga-anọ mee ihe ndị e ji efe mba ahụ ofufe. Olee ụzọ ndị Hibru atọ ahụ si meghachi omume? Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-amasịworị ha karị ịghara ịnọ n’ebe ahụ, ma nke ahụ ekweghị omume.b Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye ihe nile ha kwenyeere, nyekwa Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Akọ na uche ha nke ndị na-atụ egwu Chineke kwere ka ha nọrọ n’ebe ahụ ma jụwapụ isi ikere òkè ma ọ bụ ime ihe ọ bụla n’onwe ha n’ihe omume ọ bụla nke okpukpe ụgha.—Daniel 3:1-18.
Mgbe e mere ka ọ bụrụ iwu na ụmụ akwụkwọ nile aghaghị ịnọ na klasị mgbe a na-ezi ihe banyere okpukpe, nakwa ma eleghị anya iso mụọ ihe ruo n’ókè iji gafee ule ndị a na-esetịpụ, ụmụntakịrị ndị si n’ezinụlọ ndị Kraịst pụrụ ịnọ ya, dị ka mmadụ atọ ahụ nọ ya mgbe Nebukadneza nyere iwu ka ha nọrọ ya. Ma ndị ntorobịa ahụ bụ ndị Kraịst ga-edebe Chineke n’ọkwá mbụ. Ọ gaghị adị mkpa ka ha maa okwu ọ bụla na-ezighị ezi e kwuru aka ma ọ bụ ihe omume ọ bụla akwụkwọ nsọ na-akwadoghị nke ndị ọzọ keere òkè na ha, dị nnọọ ka ndị Hibru atọ ahụ na-anwaghị ịkwụsị ndị ọzọ ịkpọ isiala nye ihe oyiyi ọlaedo ahụ. Otú ọ dị, ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst agaghị ekere òkè n’onwe ha n’ihe omume nke ofufe, mkpekọ ekpere, abụ okpukpe, na ihe ndị yiri ihe ndị ahụ.
Ndị ntorobịa ndị a kwesịrị ịgbalịsi ike n’oge ndị ọzọ ịnara ihe ọmụma na-ewuli elu ‘site n’ihe odide nile dị nsọ, ndị pụrụ ime ka ha mara ihe maka nzọpụta site n’okwukwe nke ha kwere na Kraịst Jisọs.’ (2 Timoti 3:15) Site na ha na ụmụ ha inwe nkwurịta okwu, ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịdị na-amata ihe ha mụtara na klasị. Nke a ga-enyere ndị Kraịst ahụ toworo eto aka ịhụ ihe ọ dị mkpa ịgbazi ma ọ bụ ime ka o doo anya site na Bible ka ụmụ ha ghara inwe mgbagwoju anya ma ọ bụ bụrụ ndị e duhiere.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere Daniel ịnọ n’ọzara Dura. Ma eleghị anya ọkwa ka elu o nwere n’ọchịchị mere ka o nwee ike inwere onwe ya ịghara ije ebe ahụ.