Iwepụta nke Ikpeazụ n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ Ndị Ahụ
NA SEPTEMBER afọ gara aga, otu ihe mgbochi e nwere n’ọkà mmụta ihe bụ́ nke dịworo ruo ọtụtụ iri afọ mesịrị dakasịa. Oké arụmụka e nwere n’etiti ndị mmụta nke Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ndị ahụ yiri ka ọ gwụsịwo, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na esemokwu ndị ọhụrụ amalitewo.
A chọpụtara Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ ndị ahụ n’ọgba ndị e nwere na nso Osimiri Nwụrụ Anwụ na 1947 na n’afọ ndị sochiri ya. Ha bara uru dị ukwuu n’igosipụta izi ezi bụ isi nke ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru na n’ime ka a ghọta ọnọdụ okpukpe e nwere na Palestine mgbe Jisọs nọ n’ụwa. (Aịsaịa 40:8) Ọ bụ ezie na e bipụtara ụfọdụ n’ime ihe odide ndị ahụ ngwa ngwa otú dị mma, na 1991, a ka ebipụtabeghị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 400 ihe odide, aka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmụta apụghịkwa iru ha. Ọtụtụ ndị nwere mmetụta, dị ka Professor Ben Zion Wacholder, nke “ịda mbà n’obi site n’ịmata na n’ọ̀tụ̀tụ̀ e ji na-ewepụta akwụkwọ ndị a, anyị nile ga-anwụsịworị mgbe ụwa dum ga-enwe ike inweta ozuzu nke ihe odide Osimiri Nwụrụ Anwụ ndị ahụ.”
Ma ọnọdụ ahụ gbanwere na September gara aga. Na mbụ, Professor Wacholder na onye òtù ya, bụ́ Martin Abegg mara ọkwa na ha ejiriwo nchepụta ha jiri kọmputa mepụtaghachi ihe odide ndị ahụ e chekwara nke ọma. E mesịa, Huntington Library dị na San Marino, California, U.S.A., mara ọkwa na ha nwere foto nke ihe odide ndị mbụ ahụ, na ha ga-emekwa ka aka ndị mmụta a na-anụ aha ha ruo ha n’efu. Ihe àmà na-egosi na e mepụtawo ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke foto ndị e sere mpịakọta akwụkwọ ndị ahụ iji hụ na e chekwara ha. E debewo usoro foto dị iche iche n’ebe dị iche iche, otu n’ime ha mesịkwara bịaruo Huntington Library.
Otu onye mmụta kpọrọ ihe ndị a merenụ ‘ihe nkà mmụta ruru ka ndakpọ nke Mgbidi Ájá Berlin.’ Ndị editọ e kenyere ọrụ ahụ ha kpọrọ ma mbipụta nke ihe odide kọmputa ahụ na mwepụta nke foto ndị ahụ ‘izu ohi.’ O yiri ka arụmụka banyere izi ezi ọ̀ ga-anọgide na-aga n’ihu ruo ọtụtụ afọ. Ka ọ dị ugbu a, o yiri ka ọtụtụ ndị mmụta ndị ọzọ ga-emesịa nwee ike ileba anya n’akụkụ dum nke Mpịakọta Akwụkwọ Osimiri Nwụrụ Anwụ ndị ahụ.
[Foto dị na peeji nke 32]
Ihe ngosi nke otu okwu e kwuru banyere Habakuk, otu n’ime Mpịakọta Akwụkwọ Osimiri Nwụrụ Anwụ ndị ahụ