“Ọkịka nke Ike Ahụ”
NTARAMAHỤHỤ hà otú ole ka onye Kraịst pụrụ ịtachiri obi? Taa, ndị Kraịst gburugburu ụwa na-eche ịda ogbenye, ntisa ezinụlọ, nsogbu uche, ọrịa, agha, na mkpagbu, ihu. Ezi uche ọ̀ dị n’ịtụ anya n’aka ha ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ihe a dum? Pọl onyeozi kwuru na o ziri ezi. O dere, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
Akụkọ ihe mere eme egosiwo na ike na-esite n’aka Jehova zuru nnọọ ezu maka ihe nile. Dị ka ihe atụ, n’oge ọchịchị Nazi na Germany, Ndịàmà Jehova nwetara ajọ mkpagbu. Hà nwere ntachi obi? Akwụkwọ bụ Les Bibelforscher et le nazisme (Ndị Mmụta Bible na Ọchịchị Nazi) na-asị: “N’agbanyeghị otiti ihe ahụ nile, iyi egwu, na mmachibido iwu, n’agbanyeghị mweda n’ala n’ihu ọha, ịtụ mkpọrọ na ịtụ nga n’ogige ịta ahụhụ, Ndị Mmụta Bible [Ndịàmà Jehova] adịghị mgbe ha kwere ka e ‘zigharịa ha uche.’”
N’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, e ji akara nta ndị na-acha odo odo n’aka uwe ha mara Ndịàmà, e wepụkwara ha iche maka mmekpọ ọnụ pụrụ iche. Nke à o mere ka ha kwuhie ọnụ? Onye ọkà mmụta n’akparamagwa mmadụ bụ́ Bruno Bettelheim rịbara ama na “ọ bụghị nanị na ha gosiri ọ̀tụ̀tụ̀ pụrụ iche nke ịdị ùgwù mmadụ na ịkpa ezi àgwà, kamakwa o yiri ka e chebere ha megide otu ahụmahụ ogige ahụ bụ́ nke n’oge na-adịghị anya bibiri ndị mụ na ndị enyi m na-agwọ ọrịa uche site n’inyocha ahụmahụ mmadụ lere anya dị ka ndị a gwọtaworo.”
Ee, ha nwere ‘ike maka ihe nile.’ N’ihi gịnị? N’ihi na ha dabeere na Jehova. Pọl kwuru, sị: “Anyị nwere àkụ̀ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ bụrụ na i zute ọnọdụ ule, jiri obi ike lekwasị Jehova anya maka enyemaka. Site n’ịbụ onye e mere ka o nwee ume site n’ọkịka nke ike ahụ nke ọ na-enye, ị ga-enwe ike ịtachi obi.—Luk 11:13.