Onye Ga-aṅa Anyị Ntị Dị Anyị Mkpa
DỊ KA ndị bụ mmadụ, anyị na-agbalị inweta ọṅụ na afọ ojuju ná ndụ. Ma mgbe nsogbu onwe onye bilitere, lee ihe enyemaka na ihe nkasi obi ọ bụ inwe onye anyị na ya ga-akparịta nsogbu anyị!
Dr. George S. Stevenson kwuru, sị: “Ikwupụta ihe bụ nsogbu gị na-enye aka ibelata ọnọdụ uche gị, na-enyere gị aka ịghọta nchegbu gị n’ụzọ pụtara ìhè karị, ọtụtụ mgbe, na-enyere gị aka ịhụ ihe ị pụrụ ime banyere ya.” Dr. Rose Hilferding kwuru, sị: “Anyị kwesịrị ịgwa ibe anyị nsogbu anyị. Anyị kwesịrị ịgwa ibe anyị ihe bụ nchegbu anyị. Anyị kwesịrị inwe mmetụta na ọ dị onye nọ n’ime ụwa nke dị njikere ịṅa ntị ma nwee ike ịghọta.”
Otú ọ dị, ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke pụrụ igbo mkpa nke a kpam kpam. N’ihi ịkpa ókè ndị e nwere n’oge a na ihe ndị ọzọ, ụmụ mmadụ ndị anyị tụkwasịrị obi nwere ike ghara ịnọ ya mgbe ha dị anyị mkpa karịsịa, ma ọ bụ anyị pụrụ ịdị na-ala azụ ọbụna isoro ndị ezigbo enyi anyị kparịta isiokwu ụfọdụ.
Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe ọ bụla ezi ndị Kraịst bụ ndị na-enweghị onye na-aṅa ha ntị, n’ihi na ụzọ e si ekpe ekpere nọgidere na-adị. Bible nọgidere na-agba anyị ume ka anyị na-ekpegara Chineke ekpere, bụ́ Onye Okike anyị, onye aha ya bụ Jehova. E nyere anyị ntụziaka ikpe ekpere n’obi eziokwu, n’aha Jisọs, n’ụzọ kwekọkwara n’uche Chineke. Ọbụna ihe ndị dịịrị onwe onye na ihe nzuzo bụ isiokwu ndị kwesịrị ekwesị itinye n’ekpere. “N’ihe nile ọ bụla . . . meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ,” ka a gwara anyị ná Ndị Filipaị 4:6. Lee aha onyinye magburu onwe ya nke a bụ! Eze Onyenwe eluigwe na ala anyị dị njikere mgbe nile ịnabata na ịnara ekpere nke ndị ohu ya dị umeala n’obi mgbe ọ bụla ha nwere ọchịchọ ịbịakwute ya.—Abụ Ọma 83:18; Matiu 6:9-15; Jọn 14:13, 14; 1 Jọn 5:14.
Ma, Chineke ọ̀ na-aṅa ntị n’ezie? Ụfọdụ pụrụ iche ma ịdị irè nke ekpere ọ̀ dabeere n’ikike mmadụ: Mmadụ na-ekpe ekpere, na-ahazi echiche ya nile ma na-ekwupụta ha ná mkpụrụ okwu. Ebe o siworo otú a kọwaa ihe bụ nsogbu ya, ọ na-achọ ihe ngwọta kwesịrị ekwesị ma na-amụrụ anya ịnakwere ihe ọ bụla pụrụ inye aka n’inweta ya. Mgbe a gwọtara nsogbu ya, ọ pụrụ iinye Chineke otuto, ma ọ bụ n’ezie uche onwe ya na mgbalị ya nile rụpụtara ihe ndị ahụ a chọrọ.
Ọtụtụ na-eche taa na nke ahụ bụ nanị ihe dị mkpa n’ezie n’ekpere. Ị̀ na-eche otú ahụ? À kpaara ke ekpere nwere ókè otú a? N’ikwu eziokwu, mgbalị mmadụ tinyere n’echiche na n’anụ ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere ya nile na-ekere òkè dị ukwuu n’inweta azịza. Otú ọ dị, gịnị banyere òkè Chineke na-ekere n’okwu ahụ? Chineke ọ̀ na-aṅa ntị mgbe ị na-ekpegara ya ekpere? Ọ̀ na-ewere ekpere gị dị ka ihe dị mkpa, na-atụle ihe ndị i kwuru na ha ma na-eme ihe banyere ha?
Azịza nye ajụjụ ndị a dị mkpa. Ọ bụrụ na Chineke adịghị elebara ekpere anyị anya, mgbe ahụ abamuru ekpere akarịghị nke ọnọdụ uche. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na Chineke na-anara ma na-eji mmasị na-aṅa ntị n’ekpere nke onye ọ bụla n’ime anyị, lee aha ekele anyị kwesịrị inwe maka onyinye dị otú ahụ! O kwesịrị ịkpali anyị iji onyinye ahụ na-eme ihe kwa ụbọchị.
Mgbe ahụ, anyị na-akpọ gị òkù ịgụrụ na-aga n’ihu, ebe a tụlere okwu ndị a n’isiokwu nke na-esonụ.