Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 4/15 p. 32
  • Ndị Gibeọn—Ha Chọrọ Udo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Gibeọn—Ha Chọrọ Udo
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 4/15 p. 32

Ndị Gibeọn—Ha Chọrọ Udo

A KỌWARA obodo ahụ dị n’elu ugwu nke e sere n’elu ebe a dị ka ebe Gibeọn oge ochie dị, ihe dị ka 10 kilomita site n’ebe ugwu nke Jerusalem.

Ma eleghị anya ị maara na Gibeọn pụtara ìhè ozugbo Joshua duuru Israel banye n’Ala Nkwa ahụ ma merie Jeriko. Ndị Kenean ahụ bi na Gibeọn matara na ha apụghị iguzogide Israel, bụ́ ndị o doro anya na ha nwere nkwado Chineke. Gịnị ka ha ga-eme? Site n’iji ụzọ aghụghọ, ndị Gibeọn ahụ zigara ndị nnọchianya bụ́ ndị mere ka ha bụ ndị njem si n’ala dị anya. Mgbalị nke a ha mere inweta udo nwere ihe ịga nke ọma, n’ihi na Israel sooro ha nwee ọgbụgba ndụ. Mgbe e kpughere aghụghọ ha, ndị Gibeọn ghọrọ ndị na-awa nkụ na ndị na-ese mmiri.

Ọ ghaghị ịbụ na ihe a nke ndị a chọrọ udo mere ewuteghị Chineke. Ọ kwadoro ọgụ Joshua lụchiteere ndị Gibeọn mgbe ndị eze ise busoro ha agha. Ọbụna na Jehova rụrụ ọrụ ebube nke ịgbatịkwu ìhè nke ụbọchị maka agha ahụ.—Joshua 9:3-27; 10:1-14.

Ndị na-egwupụta ihe dị n’ala chọtara ná mkpọmkpọ ebe a otu olulu dị omimi, ma ọ bụ ọdọ mmiri, nke e gwubara n’ime oké nkume siri ike. Ndị Gibeọn pụrụ ịrịda na nke a ma nweta mmiri sitere n’oghere dị n’okpuru ala. Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ “ọdọ mmiri Gibeọn” ahụ e kwuru okwu ya na 2 Samuel 2:13? Ndị na-egwupụta ihe mgbe ochie chọpụtakwara olulu ndị e gwuru n’ime nkume na ọtụtụ ngwá ọrụ e ji eme mmanya. Ee, o yiri ka Gibeọn ọ̀ bụ ebe a na-emepụta mmanya.

N’oge Devid, ụlọ ntu, ma ọ bụ ụlọ ikwuu, nke ezi Chineke dị n’ebe a. Eze Solomọn bịara n’ebe a ịchụ àjà. Jehova bịakwutere Solomọn ná nrọ ma kwe nkwa inye ya ‘obi maara ihe na nke nwere nghọta,’ tinyekwara akụ na ụba. (1 Ndị Eze 3:4-14; 2 Ihe Emere 1:3) Isiokwu ahụ dị na peji 12-17 nke mbipụta nke a na-egosi otú ndị sitere n’usoro ọmụmụ ndị biri n’ebe a na Gibeọn si bụrụ ndị nwere ihe ùgwù pụrụ iche n’etiti mba nke Chineke mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Ị̀ maara otú nke ahụ si mee?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya