Ha Bịara n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike na Ihe Ize Ndụ
ỤBỌCHỊ ahụ bụ January 2, 1992. Ebe a nọ mee ya—Maxixe, Inhambane Province. A kwụsịrị egwú abalị ndị Africa nke Mozambique n’ike ka a gbanyere otu redio. “Ndịàmà Jehova na-enwe Mgbakọ ha nke ‘Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya’ n’ógbè anyị,” ka onye mgbasa ozi ahụ mara ọkwa ya. “Nzube ha bụ ịkụziri ndị mmadụ banyere ụzọ a pụrụ isi nweta ezi nnwere onwe n’ụwa nke oge anyị a. A chọrọ ka mmadụ nile bịa.”
N’akụkụ ebe ahụ dị anya nke Africa, ihe a na-agaghị echefu echefu na-ewere ọnọdụ! Na nke mbụ, a na-enwe mgbakọ distriktị nke Ndịàmà Jehova, 1,024 ndị mmadụ nọkwa n’ebe ahụ ịnụrụ ihe a ga-ekwu. N’afọ ole na ole gara aga, ihe omume dị otú ahụ apụghị iwere ọnọdụ n’ihu ọha na Mozambique, ebe ọ bụ na ọrụ Ndịàmà Jehova nọ n’okpuru mmachibido n’oge ahụ. Ị̀ ga-achọ ịnụ banyere àjà ndị chọrọ obi ike a chụrụ iji wee bịa mgbakọ nke a?
Inhambane Province, dị ka ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke Africa, mara mma nke ukwuu. Ụgbọ ndị e ji egbu azụ yiri ụgbọ epeepe nke nwere akụkụ atọ e si akwọpụ ya jupụtara n’akụkụ osimiri ya. Osisi akụ bekee dị ọtụtụ. Ma otu ihe jọgburu onwe ya na-eme n’obodo ahụ: agha obodo!
Nye ndị ahụ na-ehi ụra n’ụlọ akịrịka n’oge isi ụtụtụ, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịbụ ndị a kpọtere site n’ụda boom-boom-boom nke nnukwu ogbunigwe na-ada n’ime obodo ndị dị nso ka a na-alụ agha n’oké ọhịa n’oge abalị ahụ nile. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ. Mgbe ụfọdụ a na-ahụ ụmụaka ka ha na-akpagharị na-enwe ụkwụ ma ọ bụ aka e bepụrụ ebepụ. Ọbụna ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova na-enwe apa n’ihu nakwa n’ahụ ha site ná mmekpa ahụ e mekpara ha.
N’okpuru ọnọdụ ndị a, ndị nile bịaranụ nwere ekele dị omimi maka Mgbakọ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya.” N’agbanyeghị na a pụrụ inwe ebe ndị mwakpo zoro n’ụzọ e si aga mgbakọ ahụ, ọtụtụ ezinụlọ sitere n’ime ime obodo ndị ahụ kpebisiri ike ịbịa. Ịbịaru n’ebe ahụ abụghịkwa ihe dị mfe, ebe ọ bụ na usoro ime njem nke ọha na-abụkarị n’azụ gwongworo a na-ekpuchighị ekpuchi. Mgbe ụfọdụ ihe ruru 400 ndị njem na-afabanye onwe ha n’ime otu gwongworo! Ọtụtụ n’ime gwongworo ndị a na-akwụ n’ahịrị ịbụ ndị njem na-aga n’usoro nke ndị agha na-esonyere.
Nora na ụmụ ya ndị nwanyị atọ, ndị gbara otu afọ, afọ atọ, na afọ isii, bụ otu ezinụlọ tinyere ndụ ha n’ize ndụ site n’ime njem n’ụzọ dị otú a. Ọ nọwo na-edokọ ego ruo ọtụtụ ọnwa tupu mgbe ahụ iji nwee ike ime njem ahụ. Eziokwu ahụ bụ na e nweghị ebe obibi ná mgbakọ ahụ egbochighị ya. Dịkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ, Nora na ezinụlọ ya siri nri, rie nri, ma hie ụra ná mbara ala dị kpọmkwem n’ebe mgbakọ ahụ.
Ọbụna oké okpomọkụ ahụ na-afụ ụfụ n’ahụ nke oké mmiri ozuzo sochiri apụghị imebi obi ụtọ a na-akpaghị ókè nke ụmụnna ndị na-erikọ oriri ime mmụọ ọnụ. Ha chere na ọ dịghị ihe ọ bụla dị mkpa nye ha karịa ịnọ ná mgbakọ ahụ. Ngụkọta nke mmadụ 17 gosipụtara nraranye ha n’ime mmiri na-ekpo ọkụ nke Oké Osimiri India. Ka baptism ahụ na-ewere ọnọdụ, a kpaliri oké ìgwè mmadụ nke ndị ji ọṅụ na-ekiri ihe na-emenụ ịmalite ịbụ abụ otuto nye Jehova.
Ìgwè nke a nke ndị na-efe ofufe achọpụtawo n’ezie ihe ọ pụtara ịghọ ndị hụrụ nnwere onwe Chineke n’anya. Hans, bụ́ onye nnọchianya sitere n’isi obodo, bụ́ Maputo, sịrị: “Anyị ahụwo mmalite nke ọgbọ ọhụrụ n’ọrụ nke Ndịàmà Jehova n’akụkụ nke a nke Africa.”