“Nwunye Ị Lụrụ n’Okorobịa”
“ỊKWA iko ndị lụrụ di na nwunye fọrọ nke nta ka o yie ihe a na-eme kwa ụbọchị.” Nke ahụ bụ ihe ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu, dị ka akwụkwọ akụkọ Los Angeles Times si kwuo. Okwu dị otú ahụ ọ̀ na-eju gị anya? Ma, onye ọkà mmụta ọrịa uche bụ́ Frank Pittman na-eme atụmatụ na ihe dị ka 50 pasent nke ndị bụ di na malite 30 pasent ruo 40 pasent nke ndị bụ nwunye abụwo ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị nile lụrụ di na nwunye na-akwa iko!
Nke ahụ ọ̀ pụtara na omume rụrụ arụ ziri ezi? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Mgbasa nke ekwesịghị ntụkwasị obi adịghị eme ka ọ bụrụ ihe ziri ezi—dịkwa ka ịrị elu nke imempụ okporo ụzọ na-adịghị eme ka ọ bụrụ ihe ziri ezi ịpụnara mmadụ ihe. Omume rụrụ arụ na-emerụ ahụ. Dị ka ihe atụ, taa ihe a kpọrọ mmadụ nọ ná mmekpa ahụ site ná ntiwapụ nke ọrịa ndị dị ize ndụ a na-ebute site ná mmekọahụ nke ọ pụrụ ịdị mfe ịchịkwa ma ọ bụrụ na ndị mmadụ na-eme omume ọma. Ọrịa AIDS ahụ na-egbu egbu agaraghị adị otú ọ dịruru ma ọ bụrụ na ndị mmadụ abụghị ndị rụrụ arụ n’ụzọ ha si enwe mmekọahụ.
E wezụga nke ahụ, ọbụna ndị kasị bụrụ ndị ọgbara ọhụrụ na “ndị mepere anya” na-enwe ihe mgbu buru ibu mgbe onye ha na-alụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ekwesịghị ntụkwasị obi nanị n’otu mgbe pụrụ ịkpata mmerụahụ nke na-ewe ọkara afọ ndụ mmadụ iji laa.
Otú ọ dị, isi ihe kasị dị mkpa bụ na iji ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye na-egwu egwu bụ ajọ asọpụrụghị Chineke, ebe ọ bụ ya bụ Onye Guzobere alụmdi na nwunye. Bible na-asị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile.” A na-adọkwa anyị aka ná ntị, sị: “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.”—Ndị Hibru 13:4.
Ya mere, ndị maara ihe na-aṅa ntị n’okwu ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ: “Ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa.” (Ilu 5:8) Ha na-achọ afọ ojuju na obi ụtọ site n’aka ndị ha na-alụ. Site n’ime otú ahụ, ha na-eche ahụ ike nke anụ ahụ ha na nke mmetụta uche ha nche, dịkwa ka nke kasị mkpa, ha na-ewetara onye ukwu ahụ Guzobere alụmdi na nwunye otuto, bụ́ Jehova Chineke.