“Eluigwe Na-akọ . . .”
N’ihe dị ka 150 nde kilomita site n’ebe ị nọ ugbu a, anyanwụ na-eji ụzarị dị ọkụ na-acha n’igwe. N’ịbụ nke e fere ofufe dị ka chi ruo ọtụtụ puku afọ, onye agbata obi eluigwe anyị, kama ịbụ nke ahụ, bụ ihe àmà nke ike Onye Okike ya, “Onye meworo eluigwe na ụwa.” (Abụ Ọma 115:15) Ìhè ya na ikpo ọkụ ya dị mkpa maka ndụ n’elu ụwa. Eziokwu ndị ọkà mmụta sayensị mụtaworo banyere ya na-eme ka anyị jupụta n’ịtụnanya.
A gwara anyị na anyanwụ na-emepụta ike bara ụba nke ukwuu. Ị̀ maara na ihe na-erughị ọkara nke otu ụzọ n’ime otu ijeri nke okpomọkụ na ìhè ọ na-emepụta ka ụwa na-amịkọrọ? Ma, mpekere ọnụ ọgụgụ ahụ ruru ọnụ ọgụgụ buru ibu nke 240,000,000,000,000 horsepower!
Olee ụzọ anyanwụ si emepụta ike ahụ nile? Site n’ọkụ dị ukwuu nke nuklịa dị n’ime ya nke na-emepụta ike site n’ịmịkọrọ ihe dị ka 3.6 nde metric tọn nke hydrogen kwa sekọnd. Dị ka ihe obi ụtọ nye ihe a kpọrọ mmadụ, e nwere fuel zuru ezu n’anyanwụ iji mee ka usoro nke a na-aga n’ihu ruo ọtụtụ ijeri afọ.
Ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtaworo na-ewelite ajụjụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, anyanwụ na-anọgide na-eme mkpatụ, dị ka mbadamba ígwè e ji hama na-akụ. N’ihi gịnị? Ọzọkwa, tụlee nke a: Etiti ya ahụ na-enwu ọkụ nke anyanwụ bụ akụkụ kasị dị ọkụ, ọ bụrụkwa na akụkụ ọ bụla dị anya karị site n’ebe ime, ọ na-ajụkwa oyi karị. Ma mgbe anyị bịara n’akụkụ mpụta nke ọdịdị anyanwụ, bụ́ corona, nke ahụ na-agbanwe. Corona dị ọkụ karị akụkụ nile dị nso n’ebe etiti ahụ na-enwu ọkụ. N’ihi gịnị?
Ọzọ, ọ bụ ezie na—dị ka mbara ala—anyanwụ na-agba okirikiri, akụkụ dị iche iche na-agba okirikiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ebe elu na-agba okirikiri ọsọ ọsọ karịa akụkụ ndị dị n’ime. N’ihi gịnị? Oleekwa ka nke ahụ si kwe omume? Mgbe ahụ e nwere mkpụrụ anyanwụ ndị dị ojii. Ntụpọ ndị a dị n’elu anyanwụ na-apụta ma na-ala n’usoro chiri anya n’ime oge dị 11 afọ. N’ihi gịnị ka ha ji agbanwe n’ụzọ chiri anya otú ahụ?
Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ihe a ka ga-amụta banyere anyanwụ, ihe anyị marawoororị na-eme ka anyị na-elegara Onye Okike, bụ́ Jehova, anya n’oké nsọpụrụ. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ anyanwụ, a na-echetara anyị na “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka ya ka mbara eluigwe na-egosi.”—Abụ Ọma 19:1.