Ọdịdị Ile Anya Pụrụ Ịdị Na-eduhie Eduhie
“APỤGHỊ ịtụ kwasị ọdị dị ile anya obi,” ka onye Ireland na-ede egwuregwu, bụ́ Richard Sheridan kwuru. Nke a bụ eziokwu banyere osisi nakwa ndị mmadụ.
Otu ụbọchị ná ngwụcha ọnwa March n’afọ 33 O.A., Jisọs Kraịst hụrụ otu osisi fig ka ya na ndị na-eso ụzọ ya si Betani na-aga Jerusalem. Osisi ahụ jupụtara n’akwụkwọ, ma ileru ya anya nke ọma kpughere na o nweghị mkpụrụ ọ bụla ma ọlị. Ya mere Jisọs gwara ya, sị: “Onye ọ bụla erikwala mkpụrụ ọzọ si n’elu gị pụta ebighị ebi.”—Mak 11:12-14.
Gịnị mere Jisọs ji bụọ osisi ahụ ọnụ ebe, dị ka Mak kọwara, “ọ bụghị oge mkpụrụ fig”? (Mak 11:13) Ọ dị mma, mgbe osisi fig putere akwụkwọ, dị ka o si adịkarị, ọ na-amịkwa mkpụrụ mbụ. Adịghị ahụkarị ka osisi fig nwere akwụkwọ n’oge dị otú ahụ n’afọ. Ma ebe o nwere akwụkwọ, Jisọs tụrụ anya n’ụzọ ziri ezi ịhụ mkpụrụ fig n’elu ya. (Lee ihe osise ahụ dị n’elu.) Eziokwu ahụ bụ́ na osisi ahụ mịpụtara nanị akwụkwọ pụtara na ọ gaghị amị mkpụrụ ọ bụla. Ọdịdị ya n’ile anya na-eduhie eduhie. Ebe a na-akwụ ụtụ isi n’elu osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ, osisi ọ bụla na-adịghị amị mkpụrụ bụ ibu arọ akụ na ụba, ọ dịkwa mkpa ka e gbutuo ya.
Jisọs jiri osisi fig ahụ na-amịghị mkpụrụ nye ihe atụ ihe mmụta dị mkpa banyere okwukwe. N’echi ya, o juru ndị na-eso ụzọ ya anya ịhụ na osisi ahụ akpọnwụworịị. Jisọs kọwara, sị: “Nweenụ okwukwe Chineke. . . . Ihe nile, ka ha ha, bụ́ nke unu na-ekpe n’ekpere rịọkwa, kweenụ na unu anatawo ha, ha ga-adịrị unu.” (Mak 11:22-24) Tinyere inye ihe atụ nke mkpa ọ dị ikpe ekpere n’okwukwe, osisi fig ahụ kpọnwụrụnụ gosiri n’ụzọ a pụrụ ịghọta ya nke ọma ihe ga-eme mba na-enweghị okwukwe.
Ọnwa ole na ole tupu oge ahụ Jisọs ejiriwo mba ndị Juu tụnyere osisi fig nke na-adịghị amị mkpụrụ ruo afọ atọ, nke a ga-egbutukwa ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-amịghị mkpụrụ. (Luk 13:6-9) Site n’ịbụ osisi fig ahụ ọnụ nanị abali anọ tupu ọnwụ ya, Jisọs gosiri otú mba ndị Juu siworo ghara ịmị mkpụrụ ndị kwesịrị nchegharị wee si otú a kwesị mbibi. Ọ bụ ezie na mba ahụ—dị ka osisi fig ahụ—yiri ihe ahụ siri ike n’elu elu, ileru ya anya nke ọma na-ekpughe enweghị okwukwe nke dubara n’ịjụ Mesaịa ahụ.—Luk 3:8, 9.
N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs dọrọ aka ná ntị megide “ndị amụma ụgha” ma sị: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. Mmadụ na-ekpokọpụta mkpụrụ vine n’ogwu, ma ọ bụ fig n’uké? Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ. Ya mere unu ga-esi ná mkpụrụ ha mazuo ha.” (Matiu 7:15-20) Okwu Jisọs ndị a na ihe ndekọ nke osisi fig ahụ a bụrụ ọnụ na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ dị anyị mkpa ịnọ ná nche n’ụzọ ime mmụọ, n’ihi na ọdịdị ile anya nke okpukpe pụkwara ịdị na-eduhie eduhie.