Ibu Amụma Maka Ọdịnihu nke Ọnọdụ Akụ na Ụba Ụwa
AKWỤGHỊ otu ebe nke ahịa akụ na ụba na enweghị obi ike n’akụkụ nke ndị na-enyocha ihe na-eme bụ́ ndị n’enweghị ike ibu amụma nke ọdịda ahịa akụ nke 1987 emewo ka ụfọdụ ndị azụmahịa chigharịkwuru ịgụ kpakpando iji buo amụma maka ọnọdụ ego ha n’ọdịnihu, ka magazin ndị London bụ Accountancy Age na-ekwu. Magazin ahụ na-ekwu na “ndị na-agụ kpakpando banyere ọnọdụ ego na-enweta ọtụtụ ndị ahịa a ma ama iji buoro ha amụma zuru ezu banyere azụmahịa ha.”
Otu onye ndụmọdụ na-eji usoro ngagharị ndị ọ na-ahụta n’ihe ndekọ akụ na ụba kwa ụbọchị ruo 30 afọ tụnyere ngagharị nke mbara igwe dị iche iche. Ná ndabere nke a, ọ na-ebu amụma ya. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị jụrụ ịnara okwu ndụmọdụ ya tupu 1987, ugbu a ọ na-ahụ ndị ọkà n’ihe banyere ọnọdụ ego na-adịghị ekwe ekwe ka ha dị njikere ịṅa ya ntị.
Onye ọzọ na-agụ kpakpando banyere ọnọdụ ego na-ese chaatị dị iche iche ndị dabeere n’ụbọchị ọmụmụ iji kpebie akparamagwa mmadụ nakwa iji chọpụta “ihe ndị pụrụ ikwu oge ihe pụrụ ime n’azụmahịa.” Ma onye ọzọ kwenyere na akwụghị otu ebe nke ahịa ọlaọcha na-eso usoro mpụta nke ọnwa. Ma mgbe e ji ha tụnyere ndị nnyocha ihe na-eme n’ọnọdụ ego, onye a na-agụ kpakpando na-chọpụta na ndị ahịa ya na-enye ya “ohere dị nnọọ nta nke ịda ada.”
Otú ọ dị, e nwere otu onye na-ebu amụma ọnọdụ ego nke na-aghaghị imezu, ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ịgụ kpakpando. E dekọrọ amụma nke a na Bible, ọ bụkwa Jehova, bụ́ Chineke bụ́ onye na-adịghị enye onwe ya ‘ohere ọ bụla ma ọlị nke ịda ada,’ nyere mmụọ e ji buo ya. Ọ bụ Chineke onye “na-apụghị ikwu okwu ụgha.” (Taịtọs 1:2) O mere ka onye amụma ya bụ́ Ezikiel kwupụta, sị: “Ọlaọcha ha ka ha ga-atụfu n’èzí nile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe ịsọ nsọ; ọlaọcha ha na ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha.”—Ezikiel 7:19.
Olee mgbe nke a ga-abụ? N’oge “mkpagbu ukwu” na-abịanụ nke Jisọs Kraịst buru n’amụma, bụ́ nke Ezikiel kpọrọ ‘ụbọchị nrụbiga ókè nke iwe Jehova.’ (Matiu 24:21; Ezikiel 7:19) Ịba ụba nke ego agaghị eweta nlanarị, n’agbanyeghị ihe ndị na-agụ kpakpando pụrụ ibu n’amụma. Ọ bụ nanị ịtụkwasị Jehova Chineke, bụ́ Onye Mgbapụta Ukwu ahụ obi, pụrụ ịhụ na e chebere mmadụ n’oge oké ọgba aghara nke a nke zuru ụwa dum nke a ga-anọ na ya wepụ ịrụ arụ nile—nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke okpukpe, na nke azụmahịa.—Ilu 3:5, 6; Zefanaịa 2:3; 2 Pita 2:9.