Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 3/1 p. 2-3
  • Igbu Oge Kpatara Ọnwụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbu Oge Kpatara Ọnwụ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mụrụnụ Anya Ugbu A Karịa Mgbe Ọ Bụla Ọzọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ọdachi Nile Ga-abịa ná Njedebe n’Isi Nso
    Teta!—2005
  • Ị̀ Ga-aṅa Ntị N’ịdọ Aka ná Ntị Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ụbọchị Ụlọ Elu Abụọ Ahụ Yiri Ibe Ha Dakpọrọ
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 3/1 p. 2-3

Igbu Oge Kpatara Ọnwụ!

EZINỤLỌ atọ, ndị okenye asaa na ụmụaka isii, ji ike ha nile gbaa ọsọ maka ndụ ha. O yiri ka hà zukọtara ọnụ n’ime ụlọ mmadụ, na-enwe olileanya ịlanarị oké ọdịda nke nkume. Ma ka mbigbọ nke nkume ndị ahụ na-ezo ka mmiri dajụrụ, otu ihe ụjọ ọhụrụ malitere​—⁠anwụrụ ntụ ojii nke na-akpachi ume. Ugbu a ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ bụghị ịgba ọsọ.

Onye nọ n’ihu bụ otu nwoke, ma eleghị anya onye na-eje ozi, bụ́ onye bu akpa ihe oriri n’ubu ya wee gbaa ọsọ. Ndị so ya n’azụ bụ ụmụntakịrị nwoke abụọ, otu dị ihe dị ka afọ anọ, nke ọzọ dị afọ ise, ha jidere onwe ha aka wee na-agba ọsọ. Ndị ọzọ so ha n’azụ​—⁠ụjọ ji ha, ha na-adọlị, na-akpọbi ụkwụ, na-eme ike ha nile ịchọ ebe ha ga-agbalaga. Ha gbalịrị iku ume, ma kama ikuru ikuku, ha kuuru ntụ mmiri. N’otu n’otu, mmadụ 13 ahụ nile dara ma dinara n’emegharịghị ahụ, n’ikpeazụ ntụ ahụ na-ezo ka mmiri liri ha n’ime ala. Ozu ha nke dị imere ebere ga-anọ n’ime ala ruo mgbe ndị na-egwupụta ihe mgbe ochie bọpụtara ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe 2,000 afọ gasịrị wee chọpụta ihe mwute ahụ mere ha n’oge ikpeazụ nke ndụ ha.

Mmadụ 13 ndị a nwụrụnụ bụ nanị mmadụ ole na ole so n’ime ndị e mere atụmatụ na ha dị 16,000, bụ́ ndị lara n’iyi n’obodo oge ochie bụ́ Pompeii, Itali, n’August 24, 79 O.A. Ọtụtụ lanarịrị site n’ịgbapụ n’obodo ahụ mgbe Ugwu Vesuvius gbọpụtara mgbawa ya nke mbụ. Ma, ndị ahụ gburu oge​—⁠karịsịa ndị bara ọgaranya bụ́ ndị na-achọghị ịhapụ ebe obibi na ihe onwunwe ha⁠—​ghọrọ ndị e liri n’okpuru nkume na ntụ dị 6 mita.

Ihe mere na Pompeii n’ihe dị ka 2,000 afọ gara aga pụrụ ịbụ akụkọ ihe mere eme oge ochie. Ma n’ọtụtụ ụzọ o yiri ọnọdụ nke na-eche agbụrụ mmadụ dum ihu n’oge a. Ihe ịrịba ama zuru ụwa ọnụ, nke dị njọ karịa mbigbọ ndị ahụ nke Ugwu Vesuvius, na-adọ aka ná ntị na usoro ụwa nke oge a na-eche mbibi dị nso ihu. Iji lanarị, anyị aghaghị ime ihe ozugbo. Igbu oge na-akpata ọnwụ. Kpọmkwem ihe ihe ịrịba ama ahụ bụ nakwa ụzọ anyị pụrụ isi jiri ya mee ihe bụ ihe a ga-atụle n’isiokwu anyị nke na-esonụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]

Foto ihu peji nke National Park Service sere

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Soprintendenza Archeologica di Pompei

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya