À Pụrụ Inwe Ihe Nri Nke A Pụtara Nye Gị?
ỌNWA gbazuru agbazu ji ìhè dị nro na-eti n’ala ahụ. N’ọnụ ụlọ dị n’otu ụlọ elu na Jerusalem meworo ochie, ndị ikom 12 gbara otu table okirikiri. Iri na otu na-egesi ntị ike ka Onye Nkụzi ha na-ewebata otu ememe dị oké mkpa ma kwuo okwu ndị nwere ihe dị ukwuu ha pụtara. Otu ihe ndekọ na-asị:
“Jisọs [Kraịst] wee nara ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya; o wee nye ndị na-eso ụzọ ya, sị, Naranụ, rie; nke a bụ ahụ m. O wee nara iko, keleekwa, wee nye ha, sị, Unu nile ṅụọ n’ime ya; n’ihi na nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsịrị ọtụtụ mmadụ ka e wee gbaghara mmehie. Ma asị m unu, m gaghị aṅụ ma ọlị site n’ugbu a n’ihe a si n’osisi vine pụta, ruo ụbọchị ahụ mgbe mụ na unu ga-aṅụ ya ọhụrụ n’alaeze Nna m. Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụọ jee Ugwu Olive.”—Matiu 26:26-30.
Nke a mere mgbe anyanwụ dasịrị n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa ndị Juu bụ́ Nisan n’afọ 33 nke Oge Anyị. Jisọs na ndị ozi ya ka mepụrụ Ememe Ngabiga iji cheta mgbapụta a gbapụtara Israel site n’agbụ Ijipt na narị afọ nke 16 T.O.A. Kraịst achụpụwo Judas Iskarịọt, bụ́ onye na-achọ ịrara ya nye. Ya mere, nanị Jisọs na ndị ozi ya 11 bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nọ.
Nri abalị nke a abụghị ịga n’ihu nke Ememe Ngabiga nke ndị Juu. Ọ bụ ihe ọhụrụ nke e mesịrị kpọọ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Banyere ememe nke a, Jisọs nyere ụmụ azụ ya iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:24-26) N’ihi gịnị ka o ji kwuo nke a? Oleekwa otú ememe nke a nọworo ọtụtụ narị afọ pụrụ isi nwee ihe ọ pụtara nye gị?