E Jiri “Okpueze Ahụ, Bụ́ Ndụ” Nyeghachi Ya Ụgwọ Ọrụ
NYE mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Smụana, a gwara Jọn onyeozi ka o dee, sị: “Gosi onwe gị onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze ahụ, bụ́ ndụ.” (Mkpughe 2:8, 10) Ya mere, ọkwa nke a na-ama n’ebe a bụ ma nke mwute ma nke ọṅụ nke na Frederick William Franz, onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., nakwa onye so n’òtù ndị ọzọ nke usoro ọchịchị Chineke, rụsịrị ọrụ elu ụwa ya n’ụtụtụ December 22, 1992.
Ọ bụ ọkwa dị mwute n’ihi na ọ na-ekwu banyere ọpụpụ n’elu ala nke onye a hụrụ n’anya nke ukwuu, onye pụrụ iche, nke na-ejere Jehova ozi. Ma, ọ bụkwa ịma ọkwa na-enye ọṅụ n’ihi na okwu ndị ahụ dị ná Mkpughe 14:13 metụtara ezi Nwanna Franz anyị ugbu a: “Ngọzi na-adịrị ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-anwụ anwụ n’ime Onyenwe anyị site n’ugbu a: ee, ka mmụọ nsọ na-ekwu, ka ha wee si ná ndọgbụ nile ha dọgburu onwe ha n’ọrụ zuru ike; n’ihi na ọrụ nile ha na-eso ha gaa.” Nwanna Franz bụ onye na-emeru ihe n’ókè nke dị umeala n’obi, onye ozi na-arụsi ọrụ ike ma na-arụpụta ihe nke ukwuu nke Jehova Chineke jiri mee ihe n’ụzọ dị ike dị ka onye so n’òtù “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” iji nye aka n’ime ka “ndị ezinụlọ” na ndị na-esonyere ha na-enweta nri ime mmụọ.—Matiu 24:45-47.
A mụrụ Nwanna Franz na September 12, 1893, na Covington, Kentucky. Ọ nụrụ eziokwu ahụ site n’aka nwanne ya nwoke tọrọ ya. N’oge ahụ ọ na-aga akwụkwọ na mahadum bụ́ University of Cincinnati, na-akwadebe ịbụ ụkọchukwu ndị Presbyterian. Kama nke ahụ, o wepụrụ onwe ya na Chọọchị Presbyterian wee sonyere Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. E mere ya baptism na November 30, 1913, n’afọ nke na-esokwa ọ hapụrụ mahadum ahụ wee banye n’ọrụ ọsụ ụzọ. Na June 1, 1920, ọ ghọrọ onye òtù nke ezinụlọ Betel dị na Brooklyn. N’oge na-adịghị anya, e mere ya onye na-elekọta ihe ndị metụtara ndị ọsụ ụzọ, na 1926 kwa, e wegara ya ná ngalaba nke ndị na-ahazi mbipụta akwụkwọ, ebe o jere ozi n’ụzọ na-amịpụta mkpụrụ nke ukwuu. Na 1945 ọ ghọrọ osote onye isi oche Watch Tower Society na òtù ndị ọzọ e jikọrọ ya na ha. Mgbe onye isi oche n’oge ahụ bụ́ Nathan H. Knorr nwụrụ na 1977, ọ ghọrọ onye isi oche Watch Tower Society. O jere ozi n’ọkwa ahụ ruo ọnwụ ya. N’oge ndụ ya, Nwanna Franz hụrụ ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova rịrị elu site na puku ole na ole ruo ihe dị ka nde anọ na ọkara. O nwere ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi, gụnyere ikwu okwu ná mgbakọ mba nile dị iche iche na n’ileta alaka ụlọ ọrụ na ebe obibi dị iche iche nke ndị ozi ala ọzọ n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Akụkọ ndụ ya pụtara ná mbipụta Ụlọ Nche nke July 15, 1987.
N’uhuruchi Monday, December 28, 1992, e mere ememe ncheta n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Betel dị na Brooklyn. Nwanna Albert D. Schroeder so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu na-ekpo ọkụ nke na-ewuli elu n’ime mmụọ. E ji telifon jikọta ezinụlọ Betel ndị dị na Watchtower Farms, Patterson, Mountain Farm, na Kingdom Farm, nakwa ezinụlọ Betel dị n’alaka ụlọ ọrụ Canada.
Mmadụ nile, karịsịa ndị ya na ha rụchiri ọrụ anya, ga-enwe mfu dị ukwuu maka Nwanna Franz. Ọ bụ onye na-enwe nghọta, na-agba ume, na-enwekwara mmadụ nile ya na ha jekọrọ ozi ma mekọọ njem ndidi. N’eziokwu, ndị kwere ekwe ibe ya na-azaghachi n’ebe ọ nọ ná mmụọ nke Ndị Hibru 13:7: “Na-echetanụ ndị isi unu, bụ́ mmadụ ndị gwara unu okwu Chineke; na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.”
Na December 30, 1992, a họpụtara Nwanna Milton G. Henschel dị ka onye isi oche nke ise nke Society ịnọchi Nwanna Franz.
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Frederick W. Franz na 1913
Na 1920 n’ebe obibi akwụkwọ Society dị na Myrtle Avenue
Ya na Nathan H. Knorr na Yankee Stadium na 1953