Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 4/15 p. 32
  • Mkpanaka Pomegranate Site N’ụlọ Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpanaka Pomegranate Site N’ụlọ Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 4/15 p. 32

Mkpanaka Pomegranate Site N’ụlọ Jehova?

NDỊ ọkà n’ihe ndị e gwutere n’ala n’Israel gwupụtara ọtụtụ mkpanaka, bụ́ mkpanaka ndị nwere ike ọchịchị na-ebu. (Jenesis 49:10; Esta 8:4; Ezikiel 19:14) Ụfọdụ mkpanaka a chọtara na Lekish nwere isi nke ọdịdị ya dị ka mkpụrụ osisi pomegranate. Ndị Chineke maara mkpụrụ osisi nke a nke ọma.​—⁠Deuterọnọmi 8:8; Abụ nke Abụ 4:13.

Pomegranate e ji ọdụ enyí mee nke nọ n’ogo nke itiwapụ okooko osisi, n’aka ekpe, bụ nke a chọpụtara n’oge na-adịbeghị oké anya. Ogologo ya dị 43 milimita, oghere dịkwa n’ala ya na-egosi na ọ bụ akụkụ nke mkpanaka ahụ. Rịba ama mkpụrụ akwụkwọ ndị e dekwasịrị ya n’ụdị ochie nke asụsụ Hibru mbụ bụ́ nke dịrị na narị afọ nke asatọ T.O.A.

A gbajipụrụ akụkụ nke ọdụ enyí ahụ n’oge ochie, n’ihi ya mkpụrụ akwụkwọ ole na ole na-efu efu ma ọ bụ dịrị nanị n’akụkụ ụfọdụ. Ma ndị ọkachamara n’ihe odide oge ochie na-echepụta nnwetaghachi ihe ahụ e sere n’okpuru. (Dabere na Biblical Archaeologist) Ohere a na-enweghị n’ụzọ hà nhata n’etiti mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ edugawo n’inwe ụzọ nkọwa abụọ. Onye ọkà mmụta si France, bụ́ André Lemaire nyere nkọwa bụ́ “Nke bụ nke Ụlọ N[sọ nke Onyenwe any]ị [Yawe], nke dị nsọ nye ndị nchụàjà.” Nahman Avigad chepụtara “Onyinye afọ ofufo dị nsọ maka ndị nchụàjà nke (n’ime) Ụlọ nke Yawe.”

Ha na ndị ọkà mmụta ndị ọzọ kwubiri na mkpanaka ahụ nwere ná mbụ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ahụ nke aha Chineke nwere n’onwe ya​—⁠Jehova. Ya mere ọ ga-abụ na o kwuru “ụlọ nke Jehova,” nke bụ usoro okwu a na-ahụkarị na Bible.​—⁠Ọpụpụ 23:19; 1 Ndị Eze 8:​10, 11.

Ọtụtụ ndị ka na-eche na ọ pụrụ ịbụ na isi mkpanaka nke a bụ nke onye nchụàjà n’ụlọ nsọ ahụ nke Solomọn wuru ma ọ bụ na ọ bụ onyinye afọ ofufo e nyere maka ụlọ nsọ ahụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, a na-ahụkarị ihe ndị e ji ịkwa nkà mee ka ha yie pomegranate n’ụlọ nsọ Chineke.​—⁠Ọpụpụ 28:31-⁠35; 1 Ndị Eze 7:​15-⁠20.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Israel Museum, Jerusalem

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya