“Ihe Ịrịba Ama Site n’Eluigwe”
OTU abụ ochie na-asị: “Ihu igwe dị uhie uhie n’anyasị, ndị ọkwọ ụgbọ mmiri enwee ọṅụ,/Ihu igwe dị uhie uhie n’ụtụtụ ndị ọkwọ ụgbọ mmiri akpachapụ anya.” Taa, a na-eji ígwè ọrụ satellite, ihe ọmụmụ ihu igwe ndị e ji kọmpụta mezie, ígwè ọrụ Doppler radar, nakwa ụzọ nkà mmụta sayensị ndị ọzọ eme ihe iji kwupụta ihe ga-abụ ọnọdụ ihu igwe. Ọtụtụ mgbe okwu amụma na-ekwekọ n’abụ ahụ e hotara n’elu.
Ọ dị mgbe ndị iro okpukpe nke Jisọs Kraịst gwara ya ka o gosi “ihe ịrịba ama site n’eluigwe,” ngosipụta pụrụ iche iji nwapụta na ya bụ Mesaịa. “Mgbe o ruru anyasị,” ka ọ sịrị, “unu na-asị, Ihu eluigwe ga-adị mma: n’ihi na eluigwe na-acha uhie uhie. N’ụtụtụ unu na-asịkwa, Ihu eluigwe ga-ajọ njọ taa: n’ihi na eluigwe na-acha uhie uhie, gbarụọkwa. Unu maara ịtụle ihu eluigwe, ma unu apụghị ịtụle ihe ịrịba ama nke oge ndị a. Ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko na-achọ ihe ịrịba ama; ma a gaghị enye ya ihe ịrịba ama, ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona.”—Matiu 16:1-4.
Ndị iro Jisọs pụrụ ikwupụta ihe ga-abụ ọnọdụ ihu igwe ma ha enweghị ike ịghọta ihe ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, gịnị banyere “ihe ịrịba ama Jona”? Mgbe ọ nọsịrị ihe dị ka abalị atọ n’ime afọ nke otu oké azụ, onye amụma Chineke bụ́ Jona kwusara ozi ọma na Nineve wee si otú ahụ ghọọ ihe ịrịba ama nye isi obodo nke Asiria. Ọgbọ Jisọs nwere “ihe ịrịba ama nke Jona” mgbe Kraịst nọrọ akụkụ nke ụbọchị atọ n’ime ili, e wee mee ka o si n’ọnwụ bilie. Ndị na-eso ụzọ ya kwusara ihe àmà nke ihe omume ahụ, Jisọs sikwa otú a bụrụ ihe ịrịba ama nye ọgbọ ahụ.—Matiu 12:39-41.
N’oge ọzọ, ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya maka “ihe ịrịba ama” nke “ọnụnọ” ọdịnihu ya n’ike Alaeze. Ná nzaghachi, o nyere ihe ịrịba ama nke akụkụ dị iche iche mejupụtara, tinyere agha ndị na-enweghị atụ, oké ala ọma jijiji, ụkọ nri, na nkwusa zuru ụwa ọnụ banyere Alaeze eluigwe Chineke e guzobeworo.—Matiu 24:3-14, NW.
Ị̀ na-achọpụta ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst dị ka Eze eluigwe a na-adịghị ahụ anya? Akụkụ ya nile nke ihe ịrịba ama ahụ na-enwe mmezu n’ọgbọ nke a. (Matiu 24:34) Gịnịkwa banyere ọdịnihu? Ọ bụghị nanị na Bible kpughere na ọgwụgwụ nke usoro ihe a dị nso kamakwa ọ na-ebu amụma banyere ụbọchị ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa nke ga-abọ n’oge na-adịghị anya iwetara ihe a kpọrọ mmadụ ọnọdụ mara mma.—2 Pita 3:13.