Dị ka Osisi
“NDỊ nzuzu dị ka m na-ekwe ukwe, ma nanị Chineke pụrụ ike osisi.” Ka ọ na-ebuli ọtụtụ ihe ọma banyere osisi elu, onye na-ekwe ukwe bụ́ Joyce Kilmer si otú a nye Chineke otuto maka okike ha.
Jehova Chineke emewo osisi n’ụdị dị iche iche, n’ebube, na n’ịba uru. Ma ndị obere ma ndị akataka, ha pụrụ ịma oké mma nke na a gaghị ama otú e si akọwa ha. E wezụgakwa nke ahụ, osisi na-enye nri, nkụ, na ndo. Ndị nchọpụta nọgidekwara na-achọpụta ihe ọhụrụ ndị a ga-eji osisi na-eme.
N’ime Bible, a na-eji osisi eme ihe mgbe ụfọdụ n’ụzọ ihe atụ ịnọchite anya alaeze, ndị na-achị isi, na ndị mmadụ. (Ezikiel 31:1-18; Daniel 4:10-26) A kpọtụrụ osisi aha n’ihe banyere ọnọdụ ndị na-enye ọṅụ, dị n’udo, ma na-amị mkpụrụ nke na-esite n’ọbụbụ eze Jehova na mweghachi nke ndị ya. (1 Ihe Emere 16:33; Aịsaịa 55:12; Ezikiel 34:27; 36:30) Akwụkwọ Nsọ na-ekwekwa nkwa na ụbọchị ndị Chineke ga-adịkwa ka nke osisi. (Aịsaịa 65:22) Nke a nwere oké ihe ọ pụtara mgbe anyị ghọtara na osisi ụfọdụ na-adị ndụ ruo ọtụtụ narị afọ.
Otu ọbụ abụ nke Bible kwuru na onye nke ihe na-atọ ya ụtọ dị n’iwu Chineke “ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụla kwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” Osisi na-eto pokopoko nke a kụrụ n’akụkụ isi iyi mmiri jupụtara chetaara ọbụ abụ ahụ ọganihu ime mmụọ nke onye ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe na-atọ ya ụtọ dị.” (Abụ Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na i nwere ezi obi ụtọ n’iwu Chineke na Okwu Nsọ ya, ụbọchị gị nile pụrụ ịdị ka nke osisi. N’ezie, site n’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst, ị pụrụ inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.