Hà Pụrụ Ịbara Gị Uru?
AHAZIRI magazin i ji n’aka ka ọ bụrụ isi iyi nke agbamume, na-echetaghachi ntụziaka dị iche iche nke Bible maka ime ka ezinụlọ sie ike na ichekwa iguzosi ike n’ezi ihe nke onwe onye. Ọ na-egosi na e buru amụma banyere oge nsogbu ndị e nwere n’ụbọchị ndị a n’ime Bible, ọ na-egosipụtakwa ihe bụ ngwọta ya—ọchịchị Alaeze Chineke. Ị̀ pụrụ irite uru site n’Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ magazin ya na ya na-agakọ?
Site na Philippines otu nwanyị aha ya bụ Vilma dere, sị: “Ọ bụrụ na e nwere okwu a ga-eji kọwaa akwụkwọ unu dị iche iche, echere m na m ga-ahọrọ ‘ọ dị egwu.’ Ahụrụ m ma gụọ na nke mbụ ya Teta! na Ụlọ Nche unu mgbe m nọ n’otu bọs si Manila na-alọta ụlọ. Ana m ejikarị akwụkwọ akụkọ mgbe ọ bụla m na-eme njem, ma na nke ugbu a, ọ dịghị nke m ji.
“Onye nọ m n’akụkụ na njem ahụ bụ otu nwoke gbara ihe dị ka iri afọ anọ onye ji akwụkwọ unu. Mgbe ọ gụsịrị Teta!, o wepụtara magazin ọzọ, Ụlọ Nche. Eji m ohere ahụ nara ya Teta! Ikwu nnọọ eziokwu, enwere m obi ụtọ ịgụ magazin ndị ahụ n’ihi na isiokwu ha nile na-akpali mmasị, kwesị oge a, na-ewulikwa elu.”
Nwanyị ahụ mechiri okwu, sị: “Achọrọ m ịdị na-anata magazin unu. Biko mee ka m mara ụzọ m pụrụ isi nata ha.” Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Philippines nwere obi ụtọ imere ya ya site n’itinye nwanyị ahụ n’ọnụ ọgụgụ ndị ha na-ezipụrụ akwụkwọ.