Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 6/15 p. 32
  • Abraham—E Liri Ya Ebe A, ma Ọ̀ Ka Dị Ndụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abraham—E Liri Ya Ebe A, ma Ọ̀ Ka Dị Ndụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 6/15 p. 32

Abraham—E Liri Ya Ebe A, ma Ọ̀ Ka Dị Ndụ?

Ruo ọtụtụ narị afọ ndị Juu, ndị Alakụba, na ndị Kraịst agawo n’ebe a.

Ị pụrụ ileta ya n’obodo ochie bụ́ Hebrọn, ebe ndịda nke Jerusalem. A na-akpọ ihe owuwu nke a Haram el-Khalil na Ili Ndị Nna Ochie. Ee, a nabatara nke a n’ọtụtụ ebe dị ka ebe e liri ndị nna ochie bụ́ Abraham, Aịsak, na Jekọb, nakwa nwunye ha dị iche iche bụ́ Sera, Rebeka, na Lia.

Cheta site na Bible na mgbe nwunye ya ọ hụrụ n’anya, Sera, nwụrụ, Abraham zụtara dị ka ebe ili ozu otu ọgba na ala na Makpila, nso Hebrọn. (Jenesis 23:​2-⁠20) E mesịa, e likwara Abraham n’ebe a, dịkwa ka ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ahụ. Ọtụtụ narị afọ n’ihu, na gburugburu ala ili ọdịnala ahụ, Herọd Ukwu wuru otu nnukwute ụlọ nke mgbe oge na-aga ndị mmeri gbanwere ọdịdị ya ma wusawanyekwuo ya, na-egosipụta nkwenkwe okpukpe ndị nke ha.

Mgbe ị batara na ya, ị ga-ahụ cenotaph isii (ihe ncheta ma ọ bụ ili ndị gba aka). Ihe osise dị n’ime na-egosi otu maka Aịsak, nwa Abraham. Na nso ya e nwere ọnụ ndị a tụrụ n’ala, ndị e jiworo gaa hụ ihe dị n’okpuru. Ndị nchọpụta achọpụtawo ọnụ ụlọ dị iche iche ọtụtụ ọkpụkpụ ndị oge ochie pụrụ ịdịwo na ha.

Gịnị banyere Abraham? Ọ bụrụ na e liri ya n’otu ọgba dị ugbu a n’okpuru ala a, ọ dịwo anya ọ nwụrụ, ọ́ bụghị eziokwu? Ọtụtụ ndị nleta ga-ekwenye. Ma otu onye amụma nke ka Abraham ukwuu kwuru na n’otu echiche Abraham ka dị ndụ. N’ụzọ dị aṅaa? Gịnịkwa ka nke ahụ nwere ime n’ebe okwukwe gị dị?

Biko gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ​—⁠Olee Ebe Ha Nọ?” (Peji nke 3) O kwuru ihe onye amụma ukwu ahụ kwuru banyere Abraham ịdị ndụ, bụ́ ihe ọmụma nke pụrụ ịbara gị na ezinụlọ gị oké uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya