Nkà Onyinye Mmesapụ Aka Sitere n’Aka Chineke
JEHOVA na-aṅụrị ọṅụ n’ọrụ okike ya nile. (Abụ Ọma 104:31) E kwupụtara afọ ojuju miri emi ọ na-enweta n’ike ihe na Jenesis 1:31: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”
Jehova edebereghị nanị onwe ya ọṅụ nke a. O nyere Jisọs ihe ùgwù nke ịbụ onye ọrụ, ma ọ bụ ngwá ọrụ, onye e si na ya kee ihe nile ọzọ. (Jọn 1:3; Ndị Kọlọsi 1:16, 17) Dị ka “onye ọkà,” Jisọs ‘na-egwurikwa egwu n’ihu [Jehova] mgbe nile.’—Ilu 8:30, 31.
Ma ikike ikepụta ihe adịghị nanị n’eluigwe. “E kenyere ya n’ime ụmụ mmadụ,” ka Eugene Raudsepp na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ How Creative Are You? Nke a abụghị ihe mere ná ndaba, n’ihi na e mere mmadụ n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26) Jehova esiwo otú a nye ihe a kpọrọ mmadụ ikike na-eju afọ nke imepụta ihe.—Jemes 1:17.
Ya mere, n’ụzọ na-adịghị eju anya, Bible na-ekwu okwu ọma banyere ịbụ abụ, ite egwú, ịkpa ihe, isi nri, ọrụ nkà, na ihe omume nkà ndị ọzọ. (Ọpụpụ 35:25, 26; 1 Samuel 8:13; 18:6, 7; 2 Ihe Emere 2:13, 14) Bezalel, onye ọrụ nkà, jiri nkà ya mee ihe ‘n’ichepụta ọrụ ọkà dị iche iche’ iji nye aka n’iwu ụlọ ikwuu. (Ọpụpụ 31:3, 4) Onye ọzụzụ atụrụ ahụ bụ́ Jebel pụrụ ịbụworị onye mepụtara ụlọ ikwuu ahụ, ihe nkà kwesịrị ekwesị maka ndụ nkwagharị. (Jenesis 4:20) Ọ bụghị nanị na Devid bụ onye na-eti egwú na onye na-arọ egwú, ọ bụkwa onye na-emepụta ngwá egwú ndị ọhụrụ. (2 Ihe Emere 7:6; Abụ Ọma 7:17; Emọs 6:5) Ọ pụrụ ịbụ Miriam haziri ite egwú aṅụrị ahụ nke e ji mee ememe maka nnapụta ọrụ ebube nke ndị Israel gabiga Osimiri Uhie.—Ọpụpụ 15:20.
Nkà na-abụkarị ihe bara uru n’ịkwalite ezi ofufe. Jisọs ji nkà jiri ihe atụ dị iche iche mee ihe, jirikwa ihe mmụta a na-ahụ anya mee ihe iji mee ka a nụ ozi ya. A na-agba ndị na-eso ụzọ ya ume n’otu aka ahụ ‘ịdọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime okwu Chineke na ozizi.’ (1 Timoti 5:17) Ee, ọrụ nkwusa ha abụghị nanị ihe omume efu a na-emeghachi mgbe nile. Ọ bụ nkà nke chọrọ ụzọ nkà izi ihe. (Ndị Kọlọsi 4:6) Nke a dị mkpa karịsịa mgbe mmadụ na-ezi ụmụ ya ihe.—Deuterọnọmi 6:6, 7; Ndị Efesọs 6:4.
Otú a, Jehova na-eso ndị ọzọ ekerịta ọṅụ nke ike ihe na-enye ya. Lee onyinye mmesapụ aka ọ bụ!