Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/15 p. 32
  • Ụmụ Nwanyị Gburugburu Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Nwanyị Gburugburu Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/15 p. 32

Ụmụ Nwanyị Gburugburu Ụwa

MGBE mmadụ abụọ mbụ nupụụrụ Chineke isi, Jehova buru amụma ọdachi ndị si na ya pụta ndị ga-adakwasị ma ha ma ụmụ ha. Jehova gwara Iv: “N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Bible nọgidere na-agba ume ịkwanyere ụmụ nwanyị ùgwù miri emi, ọtụtụ nde ụmụ nwanyị na-enwekwa ndụ obi ụtọ, nke na-ejuwanye afọ n’ihi na ha na ezinụlọ ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.

Otú ọ dị, dị ka akụkọ e nwetara ná nso nso a banyere ihe ndị ruuru mmadụ si kwuo, ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ n’ụwa nile bụ ndị a na-eweda ala, rigbuo, ma leda anya. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere akụkọ ahụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune sịrị: “Ná nkọwa zuru ezu a kpachapụrụ anya nye, akụkọ banyere 193 mba . . . na-egosi ọnọdụ dị mwute nke mkpapụ iche na mmetọ a na-eme kwa ụbọchị.”

Ihe atụ ole na ole: N’ebe etiti Africa, ụmụ agbọghọ aghaghị ịrụ ihe ka ukwuu n’ọrụ ugbo ndị siri ike, ha na-agakwa akwụkwọ nanị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otú ụmụ okorobịa si na-aga. N’otu mba ebe ahụ, ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye bụ ihe iwu na-akwadoghị maka ụmụ nwanyị kama ọ bụghị maka ụmụ nwoke. Iwu nke mba Africa ọzọ na-agọpụrụ di nke gburu nwunye ya ma e jide ya ka ọ na-akwa iko, ma iwu ahụ adịghị agọpụrụ nwunye gburu di ya n’otu ọnọdụ ahụ.

Akụkọ ahụ na-asị na n’akụkụ ụfọdụ nke South America, ndị uwe ojii adịghị emere ụmụ nwanyị e tiri ihe ebere. Ụmụ nwanyị ndị na-arụkwa ọrụ aghaghị ịnakwere ụgwọ ọnwa ji 30 ruo 40 pasent dị nta karịa nke ndị nwoke.

N’akụkụ ụfọdụ nke Esia, ụmụ nwanyị na-abụ ndị a na-amanye igbochi ikike ịtụrụ ime ha na isikwopụ afọ ime. N’otu mba, e nwere ihe ruru 500,000 ndị akwụna, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị nne na nna na-achọ ego ga-enyere ha aka ịzụtara onwe ha ụlọ ọhụrụ renyeworo n’azụmahịa nke a. Ndị uwe ojii ná mba ọzọ aghaghị ịnagide “ọnwụ ụgwọ isi” juru ebe nile—di ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya na-egbu onye bụ nwunye n’ihi na ụgwọ isi ya erughị ihe a tụrụ anya ya.

Banyere Jisọs Kraịst, Bible kwere anyị nkwa, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Abụ Ọma 72:12-14) Ya mere anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee nchekwube; ụmụ nwanyị n’ụwa nile pụrụ ilepụ anya maka ọnọdụ ndị e meziwanyere nke ga-adị n’oge ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya