Chineke Ọ̀ Na-achị Ụwa?
Ọ BỤ ụtụtụ Sunday. Ọtụtụ si n’elu àkwà ndina ha wụtuo, yiri uwe ha, rie nri ụtụtụ, ma mapụ gawa chọọchị. N’ebe ahụ ha na-ege ntị n’ozizi banyere otú Chineke si na-achị isi n’elu ụwa, n’enweghị onye ya na ya hà n’ịchịisi. A gwara ha na ọ na-eche banyere ndị mmadụ n’ụzọ dị omimi. E hotakwara Jisọs Kraịst. Ha pụrụ ịnụ na ọ bụ Eze nke ndị eze nile bụ́ onye ikpere nile ga-egburu ná nrubeisi.
Mgbe ha lọrutere ụlọ site na chọọchị, ndị a pụrụ ịgbanye telivishọn ma na-ekiri akụkọ ụwa. Ugbu a ha na-anụ banyere ụkọ nri, mpụ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ịda ogbenye. Ha na-ahụkwa ihe ndị kwesịrị imere ebere banyere ọrịa na ọnwụ.
Ụdị ndị dị otú ahụ pụrụ ịmalite iche banyere ihe ndị ha nụrụ na chọọchị, karịsịakwa banyere okwu ndị a na-akọwaghị ma ọlị ebe ahụ. Ọ bụrụ na Chineke na-ahụ n’anya ma nwee ike nile, n’ihi gịnị ka ihe ndị dị oké njọ ji na-eme? Gịnịkwa banyere Jisọs Kraịst? N’ụzọ doro anya, e nwere ọtụtụ ikpere na-adịghị egburu ya ná nrubeisi nye ya.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ọ bụrụ na Chineke na-achị ụwa, n’ihi gịnị ka nhụsianya na ọgba aghara dị otú a ji dịrị?
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
Ihu akwụkwọ: foto NASA