Ọ̀ Bụ Ememe Okpukpe Na-enweghị Isi?
NDỊ Katọlik emewo sakrament nke ikwupụta mmehie ruo ọtụtụ narị afọ. Ma, nye ọtụtụ ndị ọ bụ usoro ihe omume na-abaghị uru. Mgbe ọ na-echetaghachi oge ọ bụ onye ntorobịa, onye isi ụlọ akwụkwọ dị elu a na-akpọ Bob na-asị: “Anọ m n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, ọbụnakwa mgbe ahụ ejighị m ya kpọrọ oké ihe.” N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị mee nke a? Nye ya, nkwupụta mmehie aghọwo ememe okpukpe na-enweghị isi. Ọ na-akọwa, sị: “Nkwupụta mmehie yiri ibute ibu gị nile jupụtara ná mmehie n’ihu onye na-anakọ ụtụ ahịa n’ọdụ ụgbọ elu. Ọ na-ajụ gị ajụjụ banyere mmehie gị, mgbe ahụ ọ na-ahapụ gị ka ị gafee mgbe ị kwụsịrị ụgwọ maka ihe okomoko ndị ị zụrụ mgbe ị nọ n’ofesi.”
N’otu aka ahụ, Frank Wessling, mgbe ọ na-ede ihe n’akwụkwọ bụ́ U.S. Catholic, na-akọwa omume nke nkwupụta mmehie dị ka “nduzi nwayọọ nwayọọ e meworo ka ọ dị mfe nke ukwuu, site n’iji ekpere nchegharị nke e bu n’isi wepụ mmehie nkịtị gaa n’ihe omume okpukpe nke ngosipụta ime ọpịpịa.” Gịnị bụ nkwubi okwu Wessling? “Ekweere m na nkwupụta mmehie dị mma maka ọdịmma ime mmụọ mmadụ,” ka ọ na-asị. “Ma ụzọ ndị Katọlik na-esi eme ya bụ nsogbu.”
Bible na-ewepụta nkwupụta mmehie n’ụzọ dịwagara nnọọ iche. Nke kasị mkpa bụ nkwupụta mmehie nye Chineke. (Abụ Ọma 32:1-5) Onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jemes dekwara, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike? ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị. Ya mere, na-ekwupụtanụ mmehie nile unu gwarịta ibe unu, na-ekpekwa ekpere n’ihi ibe unu, ka e wee mee ka ahụ dị unu ike.”—Jemes 5:14, 16.
Onye Kraịst ibu arọ nke mmehie na-anyịgbu pụrụ ịkpọ ndị nlekọta ọgbakọ, bụ́ ndị pụrụ inye ndụmọdụ onwe onye na nke dị irè site na Bible iji nyere onye ahụ mere ihe ọjọọ aka ịhapụ ụzọ mmehie ya. Ndị nlekọta ahụ pụrụ inye agbamume kwesịrị ekwesị mgbe ha na-amata ọganihu nke onye ahụ na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ. Lee ihe dị iche nke a bụ n’ebe ememe okpukpe nke nkwupụta mmehie nke chọọchị dị iche iche na-eme taa! N’ịbụ ndị enyemaka onwe onye nke ndị okenye ọgbakọ wusiri ike, ndị mere ihe ọjọọ nwere nchegharị pụrụ inweta ahụ efe nke Devid nwetara, dị ka o kwupụtara n’otu abụ ọma: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, m ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.”—Abụ Ọma 32:5.