Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 10/15 p. 3-4
  • Egwu—Enyi Ka Ọ̀ Bụ Onye Iro?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Egwu—Enyi Ka Ọ̀ Bụ Onye Iro?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Tụọ Egwu Jehova, Debekwa Ihe Nile O Nyere n’Iwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 10/15 p. 3-4

Egwu—Enyi Ka Ọ̀ Bụ Onye Iro?

“M na-eche otú m chọrọ isi anwụ. Achọghị m ka a gbaa m égbè, ma ọ bụrụ na a gbaa m, m ga-achọ ka a gbaa m égbè n’isi kpọmkwem n’ebe a, ka m wee nwụọ ozugbo.”

ONYE nta akụkọ nke Los Angeles Times nụrụ nke ahụ n’ọnụ nwa agbọghọ dị afọ 14. Ọ na-agba ụmụ akwụkwọ ajụjụ ọnụ banyere ndị mmadụ e gburu n’oge ndị na-adịbeghị anya—ndị ntorobịa na-egbu ma ndị okenye ma ndị ntorobịa ndị ọzọ. A kpọrọ akụkọ ahụ: “Ụwa nke Egwu.”

Ị ghaghị ịma na ọtụtụ ndị na-ebi n’ụwa nke egwu. Egwu maka gịnị? Ọ ga-ata akpụ ịrụtụ otu egwu aka kpọmkwem. Lee igbe ahụ dịdewere peji a ka ị mara ma ị pụrụ ịchọpụta ihe ndị enyi gị ma ọ bụ ọtụtụ ndị mmadụ n’ógbè gị na-atụ egwu ha. Igbe ahụ sitere na magazin bụ́ Newsweek nke November 22, 1993, ọ na-egosikwa ihe si ná njụta echiche e mere “758 ụmụaka nọcha n’agbata afọ 10 na 17, tinyere ndị mụrụ ha.”

Ọ bụrụ na a gbara ndị ntorobịa ahụ ajụjụ ọnụ ugbu a, ha pụrụ ikwu ihe ndị ọzọ a ga-eji atụ egwu, dị ka ala ọma jijiji. Mgbe e nwesịrị ajọ ala ọma jijiji na Los Angeles na January 1994, magazin bụ́ Time kọrọ, sị: “Ụfọdụ n’ime ihe mgbaàmà nke nsogbu nchekasị mgbe ọdachi gasịrị bụ icheghachi uche azụ nke a na-apụghị ịchịkwa achịkwa, nrọ ọjọọ, oké ịmụrụ anya na iwe n’ihi na mmadụ enweghị nchịkwa ná ndụ ya.” Onye oji ego achụ ego kpebiworo ịkwapụ ebe ahụ sịrị: “Ihe ndị o bibiri enweghị ihe ha bụ. Ọ bụ ụjọ ya. Ị na-alaba ụra n’ụlọ ala na-eyiri akpụkpọ ụkwụ gị. Ị naghị ehi ụra. Ị na-anọdụ nnọọ ọdụ ebe ahụ na-eche ya kwa abalị. Ọ dị njọ.”

“Ọdachi Ndị Mere ná Nsochi Emee Ka Ahụ Ghara Iru Ndị Japan Ala” bụ isiokwu e nyere akụkọ nke April 11, 1995, sitere Tokyo. Ọ sịrị: “Mbuso agha nke ikuku gas na-egbochi usoro ịrụ ọrụ nke akwara na ụbụrụ . . . bụ ihe tiri mmetụta uche ndị Japan aka ọjọọ n’ihi na ọ bịara dị ka akụkụ nke ihe omume sochiri ibe ya nke jikọrọ aka ọnụ mepụta ụdị ọhụrụ nke amaghị ihe ọdịnihu ga-abụ n’ụzọ bụ isi. . . . Ndị mmadụ anaghị enwekwa mmetụta nchebe n’okporo ámá ndị na-ewubụ ewu maka adịghị ize ndụ ha n’ehihie ma ọ bụ n’abalị.” Ọ bụghịkwa nnọọ nanị ndị agadi na-atụ egwu. “Professor Ishikawa [nke Seijo University] kwuru na nchegbu ahụ . . . jọkarịrị njọ n’etiti ndị na-eto eto, bụ́ ndị mgbe mgbe na-enweghị echiche doro anya banyere ihe ọdịnihu nwere maka ha.”

Ihe àmà na-egosi na “ọnọdụ nke oké ụjọ pụrụ ịgbanwe mmiri ọgwụ nke ụbụrụ, na-eme ka ndị mmadụ na-azaghachikarị ná mmepụta nke mmiri ọgwụ adrenaline ọbụna ọtụtụ iri afọ n’ihu.” Ndị ọkà mmụta sayensị na-agbalị ịghọta otú ụbụrụ na-esi akọwa ọnọdụ na-atụ egwu—otú anyị na-esi atụle ihe nile banyere ya ma na-azaghachi site n’ịtụ egwu. Professor Joseph LeDoux dere, sị: “Site n’ikpughe ụzọ nzirịta ozi nke akwara na ụbụrụ bụ́ nke ọnọdụ na-esi na ya akpatara ihe e kere eke ịmụta banyere egwu, anyị nwere olileanya inye nkọwa doro anya banyere otú ụdị nke ncheta a na-esi arụ ọrụ n’ozuzu ya.”

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị enwechaghị mmasị n’ihe ndabere mmiri ọgwụ ma ọ bụ usoro akwara na ụbụrụ maka egwu. Anyị pụrụ n’ụzọ zikwuru ezi inwe mmasị n’azịza nke ajụjụ ndị dị ka, N’ihi gịnị ka anyị na-eji atụ egwu? Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume? Ò nwere egwu dị mma?

Ikekwe ị ga-ekwere na mgbe ụfọdụ egwu pụrụ inyere gị aka. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọchịchịrị gbara ka ị na-erute ụlọ gị. Ọnụ ụzọ ya ghere oghe, ọ bụ ezie na i mechiri ya emechi. Site na window o yiri ka ị na-ahụ onyinyo na-agagharị agagharị. Ngwa ngwa ị tụwara egwu, na-enwe mmetụta na o nwere ihe dị ezigbo njọ. Eleghị anya onye ohi ma ọ bụ onye mwakpo bu mma nọ n’ime ụlọ.

Egwu a kụnyere n’ime gị nke ụdị ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịzọpụta gị site n’ịgara nnọọ n’ajụghị ase banye n’ọnọdụ dị ize ndụ. Egwu pụrụ inyere gị aka ịkpachara anya ma ọ bụ nweta enyemaka tupu ị chee mmerụ ahụ pụrụ ịbịanụ ihu. E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị dị otú ahụ: ihe àmà na-eme ka ị mata banyere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ike ọkụ eletrik; ịma ọkwa redio banyere oké ifufe ji ọsọ na-efedata n’ógbè gị; mkpọtụ na-adasi ike nke sitere n’ụgbọ ala gị ka ị na-agba n’ụzọ jupụtara n’ụgbọ ala.

N’ọnọdụ ụfọdụ mmetụta nke egwu n’ezie pụrụ ịbụ enyi. Ọ pụrụ inyere anyị aka ichebe onwe anyị ma ọ bụ ime ihe n’ụzọ amamihe. Otú ọ dị, ị maara nke ọma na egwu nọgidere na-adị ma ọ bụ nke dị ukwuu abụghị enyi n’ezie. Ọ bụ onye iro. Ọ pụrụ iweta iku ume ọkụ ọkụ, obi ịdị na-akụsi ike, ntụbo, ịma jijiji, agbọ onunu, na mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ na gburugburu ebe obibi ya.

Ọ pụrụ ịkpali mmasị gị n’ụzọ kasị ukwuu ịhụ na Bible rụtụrụ aka kpọmkwem na oge anyị ga-abụ nke ihe omume ndị na-atụ egwu n’ụwa na oké egwu ga-aka akara. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị otú ahụ, oleekwa mmetụta o kwesịrị inwe ná ndụ na echiche gị? Ọzọkwa, n’ihi gịnị ka a pụrụ iji ekwu na site n’ụzọ Bible na-esi ele ihe anya, e nwere egwu a na-atụ kwa ụbọchị nke na-enye aka karịsịa ma dị mma? Ka anyị lee.

[Igbe dị na peeji nke 3]

Mgbe a jụrụ ha ihe na-echegbu ha na ezinụlọ ha karịsịa, ndị okenye na ụmụaka na-asị na ha na-atụ egwu:

ỤMỤAKA NDỊ MỤRỤ ỤMỤ

56% Mpụ ime ihe ike megide onye òtù ezinụlọ 73%

53% Ịchụ onye okenye n’ọrụ 60%

43% Enweghị ike inweta ihe oriri 47%

51% Enweghị ike ịkwụli ụgwọ onye dọkịta 61%

47% Enweghị ike inweta ebe obibi 50%

38% Onye òtù ezinụlọ inwe nsogbu ọgwụ ọjọọ 57%

38% Ezinụlọ ha agaghị anọkọ ọnụ 33%

Ebe e si nweta ya: Newsweek, November 22, 1993

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya