Igbe Nri Agbaa Àmà
N’ỤBỌCHỊ ndị sochiri ala ọma jijiji ahụ mere na Kobe, Japan, na January gara aga, ndị bi n’ebe ahụ o metụtara nwere ihe isi ike ịchọta nri. Ma, Ndịàmà Jehova enweghị ụkọ ihe e ji ebi ndụ, n’ihi enyemaka obi ọma nke ndị enyi ha. N’ime ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ ndị mbụ mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọgbakọ ndị dị ha nso wetara osikapa ndị a kpụrụ akpụ. N’oge na-adịghị anya, ndị enyi ha na-eche banyere ha na-ebute igbe nri. N’elu igbe nri ndị ahụ, ọtụtụ dekwasịrị ya ihe na-ekwupụta mmetụta maka ndị ọghọm ahụ metụtara. Ndị natara nri ahụ kwuru na nri ọ bụla bụ nke “e tinyere nnu” ebe ha na-agaghị ejideli anya mmiri ha mgbe ha na-agụ ihe odide ndị ahụ.
Ndịàmà Jehova sooro ndị ọzọ nọ ná mkpa kerịta nri ha. Otu Onyeàmà sooro onye na-abụghị Onyeàmà ya na ya na-arụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-eri nri ehihie ya mgbe o ji ụgbọ ala na-eme njem. Ya mere o kerịtara otu n’ime igbe nri ọ natara.
“Olee ebe ị zụtara igbe nri a?” ka onye ọrụ ibe ya jụrụ. Nwanna ahụ kọwara ọrụ enyemaka nke Ndịàmà. “Eribeghị m akwụkwọ nri ruo ọtụtụ ụbọchị. M ga-edowe ụfọdụ ma welaa ya ụlọ maka ezinụlọ m,” ka nwoke ahụ ji obi ekele kwuo.
Na nke atọ ya ihe a mere, onye ọrụ ibe ya ahụ nyere Onyeàmà ahụ 3,000 yen (ihe dị ka $35, U.S.) ma sị: “Amaara m ọrụ unu nke ọma, ya mere biko ka m nye onyinye maka ọrụ unu. Enwere m ekele n’otú i si soro m kerịta nri ehihie gị. N’ezie, ndị enyi gị bụcha nnọọ ndị ọma.”