Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 32
  • ‘Dị Nnọọ Ka Ígwè Na-amụcha Ígwè’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Dị Nnọọ Ka Ígwè Na-amụcha Ígwè’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 32

‘Dị Nnọọ Ka Ígwè Na-amụcha Ígwè’

MGBE ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke narị afọ nke atọ O.A., otu nwa okorobịa na-eji ihe a kpọrọ ihe aha ya bụ Anthony, onye a kọwara dị ka “Onye Kraịst nke Copt,” hapụrụ ụwa ma nọrọ n’ime ọzara nanị ya ruo 20 afọ. N’ihi gịnị? O chere na nke a bụ ụzọ kasị mma nye ya isi fee Chineke. Ọ bụ ya bụ onye mbụ na-anọ nanị ya a ma ama nke Krisendọm.

Taa, Krisendọm nwere ole na ole ndị na-anọ nanị ha. Ma ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-ebuwanye ibu na-achọ ịnọ nanị ha n’ụzọ ọzọ. Ha adịghị ekwe ịgwa ndị ọzọ okwu banyere okpukpe, na-eche na ụdị okwu ahụ na-eduga ná nghọtahie na ịlụ ọgụ. Ofufe ha na-agụnye n’ụzọ bụ́ isi ịghara imerụ ndị agbata obi ha ahụ.

N’eziokwu, mmadụ ịghara imerụ onye agbata obi ya ahụ bụ otu akụkụ nke ezi okpukpe, ma a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Otu ilu oge ochie na-asị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17) Eziokwu dị na ya bụ na Bible na-agba ndị Kraịst ume izukọ ọnụ, ọ bụghị ikewapụ onwe ha iche kpam kpam pụọ n’ụwa ma ọ bụ pụọ n’ebe ndị Kraịst ndị ọzọ nọ. (Jọn 17:14, 15) Ọ na-asị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ndịàmà Jehova na-agbaso ndụmọdụ ahụ. Ọtụtụ ugboro n’izu, ha na-ezukọ iji ‘mụchaa ihu ibe ha,’ na-ewulite okwukwe nke ndị kwere ekwe ibe ha. Ha na-achọpụta na iji ezi obi na-atụle Bible adịghị eduga n’ịlụ ọgụ. Kama nke ahụ, ọ na-eduga n’ịdị n’otu na udo. Ọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke ezi ofufe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya