Udo Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
“AGA na-enwe agha mgbe nile n’ebe ụfọdụ. Nke ahụ bụ eziokwu dị mwute banyere ihe a kpọrọ mmadụ.” Echiche a nke olileanya na-adịghị na ya pụtara na nso nso a n’otu akwụkwọ ozi dị na magazin bụ́ Newsweek nke onye na-agụ ya dere. Ì kwenyere na ya? Agha ọ̀ bụ ihe a na-apụghị izere ezere, udo kwa nke na-apụghị ikwe omume? N’ịdabere n’akụkọ ihe mere eme, o siri ike ịghara ịza ee n’ajụjụ abụọ a. Laa azụ eri oge a malitere inwe ihe ndekọ, ihe a kpọrọ mmadụ emikpuwo n’otu agha ma ọzọ gasịa, agha ghọkwara nke na-ebibiwanye ihe ka ụmụ mmadụ mepụtara ụzọ ndị dị irè karị isi gbuo ibe ha.
Narị afọ nke 20 adịghịkwa iche. N’ezie, ọ hụwo agha ndị a kasị kwafuo ọbara na ha e nwetụrụla, ma ọ hụwokwa ihe ọhụrụ. Iri afọ ise gara aga, mba United States webatara ọgbọ nuklia site n’ịtụ bọmbụ atọm abụọ na Japan. N’ime iri afọ ise gafeworonụ eri mgbe ahụ, mba dị iche iche ewulitewo oké nkwakọba nke ngwá agha nuklia ndị pụrụ ibibi ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ ugboro. Ịdị adị nke ngwá agha nuklia ọ̀ ga-emesịa gbochie ndị mmadụ ibu agha? Ihe ndị mere eme na-enye azịza ya. Kemgbe 1945 ọtụtụ nde mmadụ anwụwo n’agha dị iche iche—ọ bụ ezie na rute ugbu a a tụbeghị bọmbụ nuklia ọ bụla ọzọ.
N’ihi gịnị ka agbụrụ mmadụ ji nwee àgwà nke ịlụ agha otú a? Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ehota akụkụ ụfọdụ nke ọha mmadụ nke dujeworo n’agha n’akụkọ ihe mere eme. Ha gụnyere ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe, ịkpa ókè agbụrụ, ndịrịta iche ọdịbendị, echiche ndị dị iche n’ibe ha (dị ka ọchịchị ndị Kọmụnist na usoro akụ̀ na ụba dị n’aka ndị nkịtị), ịhụ mba n’anya na ozizi nke ikike nke mba, ọnọdụ akụ̀ na ụba, na nnakwere nke ikike agha n’ọha. Mgbe ị gụrụ ndepụta ahụ, ị̀ hụrụ ihe ọ bụla nke yiri ka ọ ga-agbanwe n’ọdịnihu dị nso? Mba dị iche iche hà ga-ebelata mkpebisi ike ha ichekwa ikike ha? Ndị mmadụ hà ga-ebelata ịkpa ókè agbụrụ? Ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ ókè hà ga-ebelata ịnụbiga ọkụ ókè? O yighị ka nke a ọ̀ ga-eme ma ọlị.
Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na e nweghị olileanya ọ bụla na ihe ga-aka mma, na a ga-enwekwa udo na-adịgide adịgide otu ụbọchị? Ee, olileanya dị. N’agbanyeghị ọgba aghara nke ụwa a, ọ ga-ekwe omume ịchọta udo ọbụna taa. Ọtụtụ nde mmadụ emewo otú ahụ. Ka anyị kọọrọ gị banyere ole na ole n’ime ndị a ma hụ ihe ahụmahụ ha pụrụ ịpụtara gị.
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 2]
Ihu akwụkwọ na peji nke 32: Reuters/Bettmann
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 3]
Reuters/Bettmann