Ndị Ọkachamara Atụlee Ihe Ndị E Ji Edochi Ọbara
IHE dị ka ndị ọkachamara 200 sitere gburugburu United States zukọrọ na Cleveland, Ohio, na Saturday, October 7, 1995, ịtụle isiokwu na-adọrọ mmasị na-arị elu nye ndị ọrụ ahụ ike: inye ọgwụ na ịwa ahụ n’ejighị ọbara.
A tụlere ụfọdụ ọnọdụ ndị siri ike. Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na onye ọrịa na-arịa oké ụkọ ọbara? Olee otú a pụrụ isi agwọ nwa a mụchuru amụchu n’ejighị ọbara? À pụrụ ịwa ahụ n’obi n’ụzọ gara nke ọma n’amịnyeghị ọbara? N’ụzọ na-akpali mmasị, ịwa ahụ n’ejighị ọbara—ọtụtụ mgbe na-eji ụzọ ndị na-enyere ahụ aka iwulite ọbara nke ya—abụrụworị nke e jiri mee ihe n’ọnọdụ ndị a nile na-enwe ihe ndị dị mma ọ rụpụtara.a
Gịnị mere e ji nwee mkpa maka ihe ndị e ji edochi ọbara? “Anyị amụtawo na ọtụtụ mgbe mmịnye ọbara na-ebufe ọrịa, karịsịa, ịba ọcha n’anya,” ka Sharon Vernon na-ekwu, bụ́ onye nduzi nke Ebe Inye Ọgwụ na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara na St. Vincent Charity Hospital dị na Cleveland. Ọ na-aga n’ihu, sị: “Ọbụna mgbe ọbara na-ebufeghị ọrịa ọ pụrụ ịbịanyụ ikike ahụ onye ọrịa ahụ nwere ịlụso ọrịa ọgụ.” Ọ bụ ezie na e belatawo mbufe nke AIDS site n’inyocha ọbara nke ọma, a ka nwere ọtụtụ ọrịa ndị ụdị nnyocha ahụ nwere ike ọ gaghị achọpụta. N’agbanyeghịkwa mkpa maka nkwadebe ka ukwuu, ịwa ahụ n’ejighị ọbara bụ ihe na-adịghị oké ọnụ nye ụlọ ọgwụ, ebe ọ na-ewepụ nsogbu okwu ikpe nke pụrụ ịpụta mgbe ndị ọrịa natara ọbara e tetọrọ etetọ.
Nye Ndịàmà Jehova, e nwere ihe ka mkpa mere ha ji na-ezere ịnara ọbara: iwu Chineke machibidoro ya. (Ọrụ 15:29) N’agbanyeghị nke ahụ, ha chọrọ inweta ọgwụgwọ kasị mma ha pụrụ inweta. N’ihi ya, ha esorowo ndị dọkịta na-ebute ụzọ ná nnyocha nke ọgwụgwọ a na-ejighị ọbara mee na-arụkọ ọrụ. Ụdị ahụ na-abara ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova kamakwa ọtụtụ ndị ọzọ ihe ize ndụ nke mmịnye ọbara na-echegbu uru.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta! (Bekee) mbipụta nke November 22, 1993, peji nke 24-27, na nke February 8, 1996, peji nke 31.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 32]
WHO photo nke P. Almasy sere