Magazin nke Na-emetụ n’Obi
ANA-EBIPỤTA ọtụtụ magazin gburugburu ụwa iji gboo agụụ nke ndị na-agụ ha maka ihe ọmụma ma ọ bụ ntụrụndụ.
Gịnị mere magazin i ji n’aka ji bụrụ nke pụrụ nnọọ iche? Akwụkwọ ozi na-esonụ, bụ́ nke alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society dị na Germany natara, pụrụ ịza ya:
“Ekele dịrị unu nke ukwuu, ezi ụmụnna m, maka mgbalị na ọrụ unu. Mgbe mụ na ụmụ m ndị ikom abụọ si ná nzukọ lọta, ọ bụ ezie na ọ kụọla 9:30 nke abalị, aghaghị m nnọọ ige Ụlọ Nche kasị ọhụrụ [na kaseti a na-ege ege]. Ka m na-asa efere, m malitere ige ntị n’isiokwu dịịrị ọmụmụ nke mbụ (April 1, 1995). Ọ dị m ka m ghaghị ige ya otu ugbo ọzọ, ya mere m kwụsịtụrụ ọrụ m na-arụ na kichin ma gụọ isiokwu bụ́ [“Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!”] n’Ụlọ Nche na-eso tepu ahụ. O metụrụ m n’obi, karịsịa paragraf nke anọ na nke ise. Mgbe ahụkwa anya mmiri malitere ịgba—ma ọ nọteghị anya. M na-ekele Jehova na adị m ndụ ma sonyere ndị ya nakwa na mụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, pụrụ ime ka a mara aha ya. N’ezie e nweghị ihe ọ bụla mere a ga-eji enwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru. Mmụọ Jehova dịnyeere ndị ya. Ka anyị nile na-atachi obi ma na-eguzosi ike n’okwukwe, n’ịdị n’otu. Site n’ịhụnanya ndị Kraịst, nwanna unu nwanyị n’okwukwe.”
Ụlọ Nche na-enye ihe karịrị ihe ọmụma. Ọ na-emetụ obi nke ndị na-agụ ya ma na-emejụ ọchịchọ ha maka nri ime mmụọ na agbamume bịara n’oge ya. Ee, Ụlọ Nche na-enye “[nri] n’oge ya.”—Matiu 24:45.