A Kwadoghachi Ikike Nkweta Sitere n’Ihe A Maara
OTU mkpebi ikpe nke Ọkàikpe Maka Ime Nchọpụta Ndị Mbụ nke Ụlọikpe Messina, Itali, kwupụtara na nso nso a, akwadoghachiwo na iwu ji ndị dọkịta ịsọpụrụ ọchịchọ ọgwụgwọ nke onye ọrịa toworo eto. E nyere mkpebi ikpe ahụ n’okwu metụtara otu n’ime Ndịàmà Jehova.
Na January 1994, e bugara Antonino Stellario Lentini, bụ́ Onyeàmà dị afọ 64 nke na-arịa ọrịa ọbara na-adịghị akpụkọ akpụkọ, ọsọ ọsọ n’ụlọ ọgwụ dị na Taormina, Messina. Nwunye Antonino, bụ́ Catena, kọwaara ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ na dị ka Ndịàmà Jehova, na ya na di ya agaghị ekweta ịnara ọgwụgwọ mmịnye ọbara. (Ọrụ 15:20, 28, 29) A kwanyeere ọchịchọ ha ùgwù.
Otú ọ dị, n’oge a na-ebuga ya n’ụlọ ọgwụ ọzọ, Antonino kwụsịrị iku ume, e burutekwa ya n’ọnọdụ dị njọ. Ntakịrị oge ka ọ gasịrị, ọ nwụrụ. O wutere Catena nke ukwuu, ma o nwetara nkasi obi dị ukwuu ná nkwa mbilite n’ọnwụ nke Bible. (Ọrụ 24:15) Mgbe ahụ, n’ụzọ juru ya nnọọ anya, ndị majie ahụ—ikekwe n’ịbụ ndị e ji akụkọ ndị na-ezighị ezi nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi gbasara duhie—boro ya ebubo ịkpata ọnwụ di ya n’ihi na ọ jụrụ ka a ghara inye ya ọgwụgwọ nke ndị dọkịta chere na ọ dị mkpa.
Mgbe ihe karịrị otu afọ gasịrị, na July 11, 1995, e kwuru na ikpe amaghị Catena, ebe ọ bụ na ọ dịghị mpụ o mere. N’ezie, akaebe nke ndị ọkachamara gosipụtara na, n’iburu ọnọdụ onye ọrịa ahụ n’uche, ije nyewe ya ọgwụ agaraghị abaworị uru ọ bụla.
Ma okwu ọkàikpe ahụ gosipụtara ihe bụ isiokwu. Ọ kọwara na o siri ike nkweta bụ́ echiche bụ na ndị ọrụ ahụ ike aghaghị ime ihe mgbe onye ọrịa ahụ ma ọ bụ ndị na-anọchite anya ya jụrụ ịnara ọgwụgwọ. Iwu nkà mmụta ọgwụ metụtara ọrụ dịịrị mmadụ dị n’Itali, ka o kwukwasịrị, “eburula ụzọ hụ mkpa ọ dị inweta nkweta sitere n’ihe a maara nke onye ọ gbasara tupu e mee ihe ọ bụla.” N’ihi ya, o kwuru na Catena “gbochiri di ya inweta ụdị ịwa ahụ ahụ n’ụzọ iwu kwadoro.”
Mkpebi ikpe a na-akwadoghachi ikike onye toworo eto nwere ịjụ ọgwụgwọ ahụ ike nke megidere ihe ọ chọrọ.