Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/1 p. 26
  • Ịgbasa Mkpụrụ Alaeze n’Oge Ọ Bụla

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgbasa Mkpụrụ Alaeze n’Oge Ọ Bụla
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Unu Agbanweela Echiche M Banyere Ndịàmà Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Site n’Ịbụ Onye Na-eme Mkpọsa Maka Mgbanwe Ọchịchị gaa n’Ịbụ Onye Kraịst Nọpụrụ Iche
    Teta!—2002
  • Abụbu M Onye Na-emebi Iwu
    Teta!—1996
  • Ihe Ngwọta Ya Ò So Akpata Nsogbu Ahụ?
    Teta!—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/1 p. 26

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịgbasa Mkpụrụ Alaeze n’Oge Ọ Bụla

OKWU Chineke, bụ́ Bible, na-agba ume ịdị uchu. Eze Solomọn kwuru, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na ha abụọ ga-adị mma otu aka ahụ.”—Eklisiastis 11:6.

N’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị, Ndịàmà Jehova na-akụ “mkpụrụ” site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’ihe karịrị ala na ìgwè àgwàetiti 230, ha adịghị “ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi otú Ndịàmà Jehova si ‘na-adịghị ewepụ aka ha’ n’ọrụ nkwusa ahụ.

◻ Na Republic of Cape Verde, otu n’ime Ndịàmà Jehova na-agafe n’akụkụ otu ụlọ mkpọrọ mgbe ọ nọ n’ozi ubi. N’ime ogige ụlọ mkpọrọ ahụ, ndị mkpọrọ ụfọdụ nọ n’elu otu osisi. N’ịhụ Onyeàmà ahụ n’ala, ndị mkpọrọ ahụ tiri ná mkpu ka e nye ha magazin ụfọdụ. Onyeàmà ahụ kekọtara ọtụtụ magazin Ụlọ Nche na Teta! n’otu nkume ma tụfee ha ná mgbidi nke ụlọ mkpọrọ ahụ. N’ihi mmasị mbụ a, a malitere ọmụmụ Bible 12. Mmadụ atọ n’ime ndị mkpọrọ ahụ ararawo ndụ ha nye Chineke, ha ewepụtawokwa onwe ha maka baptism ime mmiri. Otu n’ime ndị mkpọrọ ahụ anọwo na-eje ozi dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile, ma ọ bụ ọsụ ụzọ, eri ihe karịrị otu afọ ugbu a. Otú ọ dị, hà si aṅaa arụ ọrụ ozi ubi n’ụlọ mkpọrọ? Mbụ, e kebisiri ụlọ mkpọrọ ahụ ịbụ ókèala dị iche iche. Mgbe ahụ e kere ókèala ahụ n’etiti Ndịàmà atọ ahụ, a na-arụkwa ya site n’ụlọ nga ruo n’ụlọ nga. Ndị mkpọsa Alaeze a na-esochi mmasị n’otu ụzọ ahụ Ndịàmà Jehova na gburugburu ụwa si eme—site n’ime nletaghachi. Otu ọ dị, otu ọdịiche bụ ugbo ole a na-eduzi ọmụmụ Bible. Kama ịmụ Bible nanị otu ugbo ma ọ bụ abụọ n’otu izu ruo otu hour ma ọ bụ ihe yiri ya, ụfọdụ ndị mkpọrọ na-amụ ihe kwa ụbọchị! Tụkwasị na nke a, onye ntụzi ukwu ụlọ mkpọrọ ahụ enyewo Ndịàmà ahụ ikike inwe nzukọ ọgbakọ ha nile n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ.

◻ Otu nwanyị na Portugal ketara ọtụtụ mbipụta nke Watch Tower mgbe ọnwụ nne ya ochie gasịrị. Ebe ọ na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova, o nweghị mmasị n’idebe akwụkwọ ndị ahụ. Otú ọ dị, ọ chọghị ibibi ha. Otu ụbọchị ọ gwara otu n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya mgbe ọ nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ banyere ọ́bá akwụkwọ ahụ. Onyeàmà ahụ jụrụ ya ma ọ̀ maara banyere ezi abamuru nke ọ́bá akwụkwọ ahụ. Nwanyị ahụ zara, sị: “Nke bụ eziokwu bụ na amaghị m ezi abamuru ha, ma olee otú m pụrụ isi chọpụta?” Nwanyị ahụ nakweere ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya ọ bịara were ọ́bá akwụkwọ nne ya ochie dị ka oké ihe. Ugbu a ọ bụkwa Onyeàmà Jehova e mere baptism. Ọzọkwa, ada ya nwanyị na otu ezigbo enyi nke ezinụlọ ahụ na-amụkwa Bible. Lee ihe nketa bara uru nchịkọta akwụkwọ ndị a ghọworo!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya