Ọ̀ Bụ Alụmdi na Nwunye Enweghị Mmekọahụ?
NÁ MGBALỊ ime ka nzọrọ ahụ bụ́ na ọ dịtụghị mgbe Meri maara nwoke kwekọọ n’alụmdi na nwunye ya na Josef, ọtụtụ ndị na-ese ihe osise na ndị na-atụ ihe egosiwo Josef dị ka nwoke meworo agadi. Ha kwuru na Josef ka yie nnọọ onye nlekọta Meri kama ịbụ di ya. Ma Popu John Paul nke Abụọ kwadoro echiche dị iche n’okwu ahụ na nso nso a. Ọ na-atụ aro na Josef “abụghị agadi nwoke n’oge ahụ.” Kama nke ahụ, “izu okè nke dị n’ime ya, bụ́ mkpụrụ nke amara, dugara ya n’isoro Meri biri ná mmekọrịta di na nwunye ya ná mmetụta ịhụnanya enweghị mmekọahụ.”
Ọ bụrụ na Meri chọrọ ịnọgide n’amaghị nwoke, gịnị mere o jiri banye ná nkwa ọlụlụ? “A pụrụ iwere ya na,” ka popu ahụ na-aza, “n’oge ha nọ ná nkwa ọlụlụ, Josef na Meri ghọtara atụmatụ ahụ nke ibi n’enweghị mmekọahụ.”
Ma, Bible na-ewepụta okwu ahụ n’ụzọ dị iche. Ihe ndekọ Matiu na-ekwu na Josef “esoghị ya nwee mmekọahụ ruo mgbe ọ mụrụ nwa nwoke.” (Matiu 1:25, New American Bible nke ndị Katọlik, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe a mụsịrị Jisọs, njikọ alụmdi na nwunye Josef na Meri abụghị ma ọlị nke enweghị mmekọahụ. Otu ihe na-anwapụta nke a bụ na ka a gakwuru n’ihu n’ihe ndekọ Oziọma ahụ, e gosiri Jisọs dị ka onye nwere ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị.—Matiu 13:55, 56.
N’ihi ya, ọ bụ ezie na Bible na-ekwu na Meri amaghị nwoke mgbe ọ mụrụ Jisọs, e nweghị ihe ndabere maka ịzọrọ na ọ dịrị ndụ n’amaghị nwoke n’ihe nile fọdụrụ ná ndụ ya na Josef.