Ihe Nduzi Ụzọ Ndị Dị n’Ụzọ nke Ndụ
Ọ BỤRỤ na ị na-eme njem n’okporo ụzọ na-edochaghị gị anya, ị̀ ga-ele ihe nduzi ụzọ anya dị ka ihe mgbochi? O yighị otú ahụ! N’ezie ị ga-ele ha anya dị ka ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara isite n’ụzọ na-eduru gị ebe ị na-aga kpafuo.
Otú ọ dị, gịnị banyere ime njem n’ụzọ nke ndụ? À pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịgaru ya n’enweghị ihe nduzi ụzọ? Otu onye amụma oge ochie nke Chineke ghọtara adịghị ike nke ihe a kpọrọ mmadụ n’akụkụ a. O kwuru, sị: “ONYENWE ANYỊ, amaara m na ọ bụghị mmadụ na-ahọrọ ụzọ nke ya: ọ bụghịkwa ihe dịịrị mmadụ ikpebi ụzọ ya ná ndụ.”—Jeremaịa 10:23, The New English Bible.
Oleezi ebe a pụrụ ichọta nduzi dị mkpa? Isi iyi a pụrụ ịdabere na ya nke nduzi dị otú ahụ bụ Onye Okike nke mmadụ, a ga-achọtakwa ihe nduzi ụzọ ihe atụ ndị ahụ n’ime Bible. Jehova, site n’Okwu ya na-ekwu, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.”—Aịsaịa 30:21.
Ee, Okwu Chineke na-enye nduzi a pụrụ ịdabere na ya n’akụkụ nile nke ndụ anyị. (Aịsaịa 48:17; 2 Timoti 3:16, 17) Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ na-eme njem n’ụzọ nke ndụ n’adabereghị ná nduzi Chineke. (Matiu 7:13) N’agbanyeghị nke ahụ, e mewo ka ihe nduzi ụzọ ndị ahụ guzosie ike ma dịrị! Ị̀ ga-agbaso ha ka ị na-aga n’ụzọ nke ndụ?